Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 58


Nkeji 58

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Zaịọn, Ógbè Jackson, Missouri, 1 Ọugọst 1831 (History of the Church, 1:190–195). N’Ụbọchị izu-ike mbụ mgbe Onye-amụma na ndị-otu ya bịaruru na Ógbè Jackson, Missouri, e nwere nzukọ okpukpe-chi, ma a nabatara ndị-otu abụọ site na baptism. N’izu-ụka ahụ, ụfọdụ Ndị-nsọ sitere Colesville nke Ngalaba-nta Thompson na ndị ọzọ bịaruru ( lee nkeji 54). Ọtụtụ nwere ọnụnụ ọkụ n’obi ịmata ọchịchọ nke Onye-nwe gbasara ha n’ebe ọhụrụ nke ọgbakọ.

1–5, Ndị ahụ na-anagide mkpagbu ka a ga-eji okpu-eze ebube kpube; 6–12, Ndị-nsọ nile ga-ejikere maka ọlụlụ nwunye nke Nwa-atụrụ ahụ na nri-anyasị nke Onye-nwe; 13–18, Ndị-ụkọchukwu bụ ndị-ikpe n’Israel; 19–23, Ndị-nsọ nile ga-erube isi n’iwu nile nke obodo; 24–29, Ndị mmadụ kwesịrị iji ohere nhọrọ ha mee ihe ọma; 30–33, Onye-nwe na-enye iwu ma na-akagbu; 34–43, Ichegharị, ndị mmadụ aghaghị ịkwupụta ma hapụ kwa mmehie ha nile; 44–58, Ndị-nsọ nile ga-azụta ihe-nketa ha ma gbakọọ na Missouri; 59–65, Ozi-ọma ga-abụ ihe a n’aghaghị ịkwusa nye ihe nile e kere eke.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, na chee ntị n’okwu m, ma mata site na mụ ihe m ga-eme gbasara unu, na kwa gbasara ala anke a nke m zigara unu.

2 N’ihi na n’ezie a sị m unu, ngọzi na-adịrị onye ahụ nke ana-edebe iwu-nsọ m nile, ma-ọbụ na ndụ ma-ọbụ bn’ọnwụ; na ya onye nke ckwesịrị ntukwasị obi n’ime dmkpagbu, ụgwọ ọrụ onye ahụ dị ukwuu karịa n’ala-eze nke elu-igwe.

3 Unu apụghị ịhụ n’anya nkịtị, n’oge nke ugbụ a, atụmatụ nke aChineke unu gbasara ihe ndị ahụ nile nke ga-abịa ma e mesịa, ma bebube nke ga-eso mgbe ọtụtụ mkpagbu gasịrị.

4 N’ihi na mgbe ọtụtụ amkpagbu gasịrị bngọzi nile ga-eso. Ya mere ụbọchị ahụ na-abịa mgbe a cga-ekpube gị nnukwu debube; oge awa ahụ erubeghị, mana ọ dịkwa nso n’ọba aka.

5 Cheta nke a, nke m buworo ụzọ gwa unu, ka unu wee adebe ya n’obi, ma nata nke ahụ nke ga-eso.

6 Lee, n’ezie a sị m unu, n’ihi nke a ezipụwo m unu—ka unu wee nwee nrube-isi, na ka obi unu nile nọrọ na anjikere bịgba-ama nke ihe nile nke ga-abịa.

7 Na kwa ka unu nwee ùgwù n’ịtọ ntọ-ala, ma n’ịgba-ama nke ala ahụ n’ebe aZaịọn nke Chineke ga-eguzo.

8 Ma kwa ka oriri nke ihe gbara abụba bụrụ nke a ga-akwado maka andị ogbenye; e, oriri nke ihe nile gbara abụba, nke mmanya bdoro edo a zara nke ọma, ka ụwa wee mata na ọnụ nile nke ndị-amụma agaghị ada;

9 E, nri-anyasị nke ụlọ nke Onye-nwe nke akwadoro nke ọma, nke a ga-akpọ mba nile oku.

10 Nke mbụ, ndị ọgaranya na ndị nwere mmụta, ndị amamihe na ndị ama ama;

11 Ma mgbe nke ahụ gasịrị ka ụbọchị nke ike m ga-abịa, mgbe ahụ ka ndị ogbenye, ndị ngwọrọ, na ndị ìsì, na ndị ntị, ga-abata n’ime aọlụlụ nwunye nke Nwa-atụrụ ahụ, ma soro rie bnri-anyasị nke Onye-nwe, nke akwadoro maka nnukwu ụbọchị ahụ na-abịa.

12 Lee, mụ, Onye-nwe ekwuwo ya.

13 Ma ka aịgba-ama ya gaa pụọ site na Zaịọn, e, site n’ọnụ nke obodo-ukwu nke ihe-nketa nke Chineke—

14 E, n’ihi nke a ka m zipụworo unu n’ebe a, na họpụtawo nwa odibo m aEdward Partridge, ma họpụtaworo ya ozi ya n’ala nke a.

15 Mana ọ bụrụ na o chegharịghị site na mmehie ya nile, nke bụ ekweghị ekwe na ikpụ-isi nke obi, ka o lezie anya ka ọ ghara aịda.

16 Lee ozi ya ka e nyeworo ya, ma agaghị enye ya ọzọ.

17 Ma onye ọbụla nke guzoro n’ozi nke a ka a họpụtaworo ịbụ aonye-ikpe n’Israel, dịka ọ dị n’ụbọchị ndị ochie, ikewa ala nile nke ihe-nketa nke Chineke nye bụmụ ya;

18 Na ikpe ndị ya ikpe site n’ọgbụgba-ama nke ndị-ikpe ziri ezi, na site n’enyem-aka nke ndị-ndụmọdụ ya, dịka iwu nile nke ala-eze nke e nyere site n’aka andị-amụma nke Chineke.

19 N’ihi na n’ezie a sị m unu, iwu m ka a ga-edebe n’ala nke a.

20 Ka onye ọbụla ghara iche na ya bụ onye ọchịchị; mana ka Chineke chịa onye na-ekpe ikpe, dịka ndụmọdụ nke ọchichọ ya siri dị; ma-ọbụ, n’ụzọ ọzọ, onye nke na-adụ ndụmọdụ ma-ọbụ na-anọdụ ala n’oche ikpe.

21 Ka onye ọbụla ghara ida aiwu nile nke obodo, n’ihi na onye ahụ nke na-edebe iwu nile nke Chineke e nweghị ihe ga-eme ka ọ daa iwu obodo.

22 Ya mere, nọrọ n’okpuru ndị na-achị achị, ruo mgbe a ga-achị bụ onye ọ bụ oke ya ịchị, ma kwatuo ndị-iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya.

23 Lee, aiwu nile nke unu nataworo site n’aka m bụ iwu nile nke nzukọ-nsọ, ma n’ụzọ dị otu a ka unu ga-egosipụta ha. Lee, nke a bụ amamihe.

24 Ma ugbụ a, dịka m kwuru gbasara nwa-odibo m Edward Partridge, ala nke a bụ ala nke obibi ya, na ndị ahụ ndị o họpụtaworo dịka ndị ndụmọdụ ya; na kwa ala nke obibi nke onye ahụ nke m họpụtaworo idebe aụlọ-akụ m.

25 Ya mere, ka ha kpọta ezi na ụlọ ha nile n’ala nke a, dịka mgbe ha ga-akparịta ụka n’etiti onwe ha na mụ.

26 N’ihi na lee, ọ dịghị mma na m ga na-enye iwu n’ihe nile; n’ihi na onye ahụ nke a na-amanye n’ihe nile, onye ahụ bụ onye aume-ngwụ ma ọbụghị odibo maara ihe; ya mere ọ naghị anata ụgwọ-ọrụ.

27 N’ezie a sị m, ndị mmadụ kwesịrị ịnọ an’oke agụụ n’ịchụso ihe ọma, ma mee ọtụtụ ihe site n’ọchịchọ nke onwe, ma na-eweta na mmezu nnukwu ezi-omume.

28 N’ihi na ike ahụ dị n’ime ha, n’ime nke ha bụ andị-nnochite-anya nye onwe ha. Ma ọbụrụraa na mmadụ emee ihe ọma ha agaghị-etufu ụgwọ-ọrụ ha ma ọlị.

29 Mana onye ahụ nke na-anaghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị ma e nyere ya n’iwu, ma na-anabata iwu-nsọ n’obi n’ekwenyeghị, ma na-edebe ya n’ume ngwụ, onye ahụ bụ onye aikpe mara.

30 Onye ka m bụ nke akere mmadụ, ka Onye-nwe kwuru, nke ga-agụ ya ka onye ikpe n’amaghị bụ onye ahụ nke anaghị edebe iwu-nsọ m nile?

31 Onye ka m bụ, ka Onye-nwe kwuru, nke akweworo nkwa ma n’emejupụtaghị ya?

32 A na m enye iwu ma ndị mmadụ anaghị erube-isi, a na m aakagbu iwu ma ha anaghị anata ngọzi ya.

33 Mgbe ahụ ha na-asị n’ime obi ha: Nke a abụghị ọrụ nke Onye-nwe, n’ihi na nkwa ya nile emezughi. Mana ahụhụ ga-adịrị ndị dị otu a n’ihi na ụgwọ-ọrụ ha na-eche ha an’okpuru ma ọbụghị site n’elu.

34 Ma ugbụ a e nye m unu ntụzi-aka ndị ọzọ gbasara ala nke a.

35 Ọ bụ amamihe n’ime m na nwa odibo m Martin Harris kwesịrị ịbụ ihe-ịma-atụ nye nzukọ-nsọ, an’ịtọgbọ ego ya n’iru ụkọchukwu nke nzukọ-nsọ.

36 Na kwa, nke a bụ iwu nye mmadụ ọbụla nke batara n’ala nke a ịnata ihe-nketa; ma ọ ga-eji ego ya mee dịka iwu na-atụzi-aka.

37 Ma ọ bụ amamihe kwa na a ga-enwe ala ndị azụtara na Independence, maka ebe nke ụlọ-akụ, na kwa maka ụlọ nke aibipụta akwụkwọ.

38 Ma ntụzi-aka ndị ọzọ gbasara nwa odibo m Martin Harris ka a ga-enye ya site na Mụọ, ka ọ wee nata ihe-nketa ya nile otu ọ masịrị ya;

39 Ma ka o chegharịa site na mmehie ya nile, n’ihi na ọ na-achọ aotuto nke ụwa.

40 Na kwa ka nwa odibo m aWilliam W. Phelps guzo n’ọkwa-ọrụ nke m họpụtaworo ya ma nata ihe-nketa nke ya n’ala ahụ;

41 Na kwa o kwesịrị ka o chegharịa, n’ihi na mụ, Onye-nwe, e nweghị m mmasị n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ chọrọ ime karịchaa, ma ọ dịghị nwayọ otu kwesịrị n’iru m.

42 Lee, onye ahụ nke achegharịworo site na mmehie ya nile, onye ahụ ga-enweta bmgbaghara, ma mụ, Onye-nwe agaghị cechetakwa ha ọzọ.

43 Site na nke a unu ga-amata na ọ bụrụ na mmadụ echegharịa site na mmehia ya nile—lee ọ aga-ekwụpụta ha ma bhapụ ha.

44 Ma ugbụ a, n’ezie, a sị m gbasara ndị fọdụrụ na ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, oge ahụ abịarubeghị, ọ ga-abụ ọtụtụ afọ nye ha, ka ha nata nketa ha n’ala nke a, ewezuga ma ha chọrọ ya site n’ekpere nke okwukwe, nanị dịka a ga-esi họpụtara ha site n’Onye-nwe.

45 N’ihi na lee, ha aga-akpọkọta ndị mmadụ ọnụ site na nsọtụ nile nke ụwa.

46 Ya mere, kpọkọta nụ onwe unu ọnụ; ma ha ndị a na-ahọpụtaghị ọkwa ị nọrọ n’ala nke a, ka ha kwusaa ozi-ọma na mpaghara nile gbara gburu gburu; ma emesịa nke a, ka ha laghachi n’ụlọ ha nile.

47 Ka ha kwusaa n’ụzọ ma agbaa-ama nke ezi-okwu n’ebe nile, ma kpọkuo ndị ọgaranya ndị ukwu na ndị nta, na ndị ogbenye ka ha chegharịa.

48 Na ka ha wuo anzukọ-nsọ nile, ọbụrụ na ndị bi n’ụwa ga-echegharị.

49 Na ka e nwee onye nnọchite anya a họpụtara site n’olu nke nzukọ-nsọ, nye nzukọ-nsọ dị na Ohio, ịnata ego nile iji zụta ala nile na aZaịọn.

50 Ma e nye m nwa odibo m Sidney Rigdon iwu-nsọ, na ọ aga-ede nkọwa nke ala nke Zaịọn, na nkọwa nke ọchịchọ nke Chineke, dịka a ga-eme site na Mụọ nye ya.

51 Ma akwụkwọ-ozi na akwụkwọ ịtụ-ụtụ, ka a ga-enye nzukọ-nsọ nile inweta ego nile a ga-etinye n’aka nke ụkọchukwu, na onwe ya ma-ọbụ onye nnọchite-anya ya, otu ọ dịịrị ya mma ma ọbụ, dịka a ga-esi atụziri ya aka iji zụta ala nile maka ihe-nketa maka ụmụ nke Chineke.

52 N’ihi na, lee, n’ezie a sị m unu, Onye-nwe chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya nile na ụmụ nke mmadụ mepee obi ha nile, ọbụna ịzụkọta mpaghara obodo nke a nile, ọsọ ọsọ dịka oge ga-ekwe.

53 Lee, nke a bụ amamihe. Ka ha mee nke a ma ọbụghị otu a ha agaghị enweta aihe-nketa, ewezuga ma-ọbụ site na nkwafu nke ọbara.

54 Ma ọzọ ọbụrụraa na e nwetara ala, ka e nwee ndị-ọrụ e zipụrụ n’ụdị nile n’ala nke a ịrụ-ọrụ maka ndị-nsọ nile nke Chineke.

55 Ka e mee ihe ndị a nile n’usoro; ma ka ohere nile nke ala nile ahụ bụrụ ihe e mere ka a mata site n’oge ruo n’oge site n’aka ụkọchukwu ma-ọbụ onye nnọchite-anya nke nzukọ-nsọ.

56 Ma ka ọrụ nke mkpọkọta ahụ ghara ịbụ ngwa-ngwa, ma-ọbụ site na mgbalaga; mana ka e mee ya dịka ntụzi-aka nke ndị okenye nke nzukọ-nsọ n’ọgbakọ nile, dịka mmata-ihe nke ha nwetara site n’oge ruo n’oge siri dị.

57 Ma ka nwa odibo m Sidney Rigdon doo nsọ ma nyechasịa kpam kpam ala nke a, ma ebe ahụ kpọm kwem maka atemple, nye Onye-nwe.

58 Ma ka a kpọọ ọgbakọ nzukọ; ma nke a gasịa ka ụmụ odibo m Sidney Rigdon na Joseph Smith, Nta, laghachi, na kwa Oliver Cowdery ya na ha, ịrụchapụ ọrụ nke fọdụrụ nke m họpụtaworo ha n’ala nke ha, ma nke fọdụrụ dịka a ga-enye antụzi-aka ya n’ọgbakọ nile.

59 Ma ka onye ọbụla ghara ilaghachi site n’ala nke a ma ọbụghị ma ọ agbara-ama n’ụzọ, maka nke ahụ nke ọ maara ma n’ezie kwere.

60 Ka nke ahụ e nyekwasịworo Ziba Peterson bụrụ ihe a napụrụ ya; ma ka ọ nọrọ dịka onye-otu n’ime nzukọ-nsọ, ma jiri aka ya nile rụọ ọrụ, ya na ụmụnna ya, ruo mgbe a atasịrị ya ahụhụ zuru oke maka mmehie ya nile; n’ihi na o kwupụtaghị ha, ma o chere izo ha.

61 Ka ndị fọdụrụ n’ime ndị okenye nke nzukọ-nsọ nke a, ndị na-abịa n’ala nke a, ụfọdụ n’ime nke nwere ngọzi bara ụba ọbụna karịa ihe atụ; nwee kwa ọgbakọ n’elu ala nke a.

62 Ma ka nwa odibo m Edward Partridge bụrụ onye-ntụzi-aka nke ọgbakọ nke ha ga-enwe.

63 Ma ka ha laghachi kwa, na-ekwusa ozi-ọma n’ụzọ, na-agba ama nke ihe nile nke e kpughere nye ha.

64 N’ihi na, n’ezie, ụda ya aghaghị ipụ site n’ebe a ruo n’ime ụwa nile, ma rute ebe nile nke ụwa sọtụrụ—ozi-ọma aghaghị ibụ ihe e akwusara nye ihe nile ekere eke na bihe ịrịba-ama nile na-eso ha bụ ndị kwere.

65 Ma lee, Ọkpara nke Mmadụ ana-abịa. Amen.