Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 17


Nkeji 17

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Oliver Cowdery, David Whitmer, na Martin Harris na Fayette, New York, Jun 1829, tutu ha ahụ epekele nke ihe nkanye ahụ nwere akụkọ-ndekọta Akwụkwọ nke Mọmọn (History of the Church, 1:52–57). Joseph na onye-ode akwụkwọ ya, Oliver Cowdery, amatawo site n’ọrụ ntụgharị-asụsụ nke epekele nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn na a ga-ahọpụta ndị aka-ebe atọ pụrụ iche (Lee Ita 5:2–4; 2 Nifaị 11:3; 27:12). Oliver Cowdery, David Whitmer, na Martin Harris nwere mkpalite site n’ọchịchọ nkwalite nke mụọ ịbụ ndị aka-ebe atọ ahụ pụrụ iche. Onye-amụma jụrụ Onye-nwe, ma mkpụghe nke a bụ ọzịza sitere na Urim na Tumim.

1–4, Site n’okwukwe ndị Aka-ebe Atọ ahụ ga-ahụ epekele nile na ihe ndị ọzọ dị-nsọ; 5–9, Kraịst na-agba-ama ịdị-nsọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

1 Lee, a sị m unu, na unu garịrị adabere n’okwu m, nke bụ ọbụrụ na unu mee ya n’uju ebum-n’obi nke obi, unu aga-ahụ bekpele nile, n’akwa epekele-nchekwa-obi, cnma-agha nke Laban, dUrim na Tumim ahụ, nke e nyere enwanne-nwoke nke Jared n’elu ugwụ, mgbe ya na Onye-nwe kwukọrịtara okwu firu na iru, na ihe ntụzi-aka nile nke gọrụ-ebube ahụ e nyere Lihaị mgbe ọ nọ n’ime ọzara, n’oke-ala nile nke hOke Osimiri Uhie.

2 Ma ọ bụ site n’okwukwe unu ka unu ga-eji ahụ ha, ọbụna dịka okwukwe ahụ nke ndị-amụma ochie nwere.

3 Ma mgbe i nwetasịworo okwukwe, ma hụwo ha n’anya gị abụọ, ị aga-agba-ama maka ha, site n’ike nke Chineke;

4 Ma nke a ka ị ga-eme ka a ghara-ibibi odibo m Joseph Smith, Nta, ka ebum n’obi ezi-omume m nile wee pụta ihè nye ụmụ nke mmadụ n’ọrụ nke a.

5 Ma unu ga-agba-ama na unu ahụwo ha, ọbụna dịka odibo m Joseph Smith, Nta, si hụ ha; n’ihi na ọ bụ site n’ike m ka ọ hụworo ha, ma ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe.

6 Ma ọ tụgharịsịwo-asụsụ aakwụkwọ ahụ, ọbụna bakụkụ ahụ nke m nyeworo ya n’iwu, ma dịka Onye-nwe gị na Chineke gị na-adị ndụ ọ bụ ezi-okwu.

7 Ya mere, unu enwetawo otu-ụdị ike ahụ, ma otu-ụdị okwukwe ahụ, ma otu-ụdị ọnyinye ahụ dịka ya;

8 Ma ọbụrụ na unu emee iwu-nsọ nile nkem ndị ikpe-azụ a, nke m nyeworo unu, aọnụ-ụzọ-ama nile nke ala-mụọ agaghị aka kwa unu ike, n’ihi na bamara m, ga-ezuru unu oke, ma a cga-ebuli unu elu n’ụbọchị ikpeazụ.

9 Ma mụ, Jisus Kraịst, aOnye-nwe gị na Chineke gị, ekwuwo ya nye unu, ka m wee weta ebu m n’obi ezi-omume m nile nye ụmụ nke ndị mmadụ. Amen.