Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 72


Nkeji 72

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 4 Disemba 1831 (History of the Church, 1:239–241). Ọtụtụ ndị okenye na ndị-otu nile gbakọrọ ịmụta ọrụ ha ma natakwa mbulite mụọ na nkuzi nile nke Nzukọ-nsọ. Nkeji nke a bụ nchịkọta nke mkpughe abụọ a natara n’otu ụbọchị Amaokwu 1 ruo na 8 mere ka a mata ọkpụkpọ oku nke Newel K. Whitney dị ka onye ụkọchukwu. Mgbe ahụ ka a kpọrọ ya ma chie ya echichi, mgbe e mesịrị nkea ka a natara amaokwu 9 rue 26, nke na-enye ntuzi-aka agbakwunyere gbasara ọrụ nile nke onye ụkọchukwu.

1–8, Ndị Okenye ga-enye nkọwasị nke ọkwa ọrụ ha n’aka onye ụkọchukwu; 9–15, Ụkọchukwu na-edebe ụlọ-akụ ma na-elekọta ndị ogbenye na ndị nwere mkpa; 16–26, Ndị ụkọchukwu ga-agba ama ezi-okwu maka itozu-oke nke ndị okenye.

1 N̄aa-ntị, ma nụrụ olu nke Onye-nwe, O unu ndị gbakọtaworo onwe unu ọnụ, ndị bụ andị-isi-nchụ-aja nke nzukọ-nsọ m, ndị e nyeworo bala-eze ahụ na ike.

2 N’ihi n’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru, ọ dị m mkpa na a ga-ahọpụta nye unu otu aụkọchukwu, ma-ọbụ site n’ime unu nye nzukọ-nsọ na mpaghara ubi vine nke a nke Onye-nwe.

3 Ma n’ezie n’ihe nke a unu emewo ka ndị maara ihe, n’ihi na Onye-nwe chọrọ ya, n’aka nke aonye ọrụ ọbụla inye bnkọwasị nke cọkwa-ọrụ ya, ma n’oge a ma na mgbe ebighi-ebi.

4 N’ihi na onye ahụ nke kwesịrị ntụkwasị ọbi ma anwee kwa uche n’ụwa ka aga-agụ onye tozuru oke iketa ọtụtụ bebe-obibi nke e doziri maka ya site n’aka Nna m.

5 N’ezie a sị m unu, ndị okenye nke nzukọ-nsọ ahụ n’akụkụ nkea nke aubi vine m ga-enye nkọwasị nke ọkwa-ọrụ ha nye ụkọchukwu, onye m ga-ahọpụta n’akụkụ ubi vine nke a.

6 Ihe ndị a nile ka aga-enwe n’akwụkwọ-ndekọta,nke a ga-enyefe ụkọchukwu na Zaịọn.

7 Ma ọrụ nke aonye ụkọchukwu ka a ga-eme ka a mata site n’iwu-nsọ nile nke e nyeworo, na olu nke ọgbakọ.

8 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, nwa odibo m aNewel K. Whitney bụ nwoke ahụ nke a ga-ahọpụta ma chie echichi nye ike nke a. Nke a bụ uche nke Onye-nwe Chineke unu, Onye-mgbapụta unu. Ọbụna otu a. Amen.

9 Okwu nke Onye-nwe, na mgbakwụnye nye iwu nke e nyereworo, nke mere ka a mata ọrụ nke ụkọchukwu na mpaghara ubi vine nke a, nke bụ nke a n’ezie—

10 Idota aụlọ-akụ nke Onye-nwe; ịnata ego nile nke nzukọ-nsọ na mpaghara ubi vine nke a;

11 Ịnata nguzi nke ndị okenye dịka e nyeworo iwu na mbụ; na aileba anya na mkpa ha nile, onye ga-akwụ ụgwọ maka nke ahụ ha na-anata, ọbụrụra na ha nwere ego ịkwụ;

12 Ka nke a kwa bụrụ ihe e doro nsọ nye ịdị mma nke nzukọ-nsọ, nye ndị ogbenye na ndị chọrọ enyem-aka.

13 Ma onye nke an’enweghi ego ịkwụ, a ga-enwe nguzi ma nyefee n’aka ụkọchukwu nke Zaịọn, onye ga-akwụ ụgwọ ahụ site na nke ahụ nke Onye-nwe ga-etinye ya n’aka.

14 Ma ọrụ nile nke ndị kwesịrị ntụkwasị-obi ndị na-arụ ọrụ n’ihe nile nke mụọ, n’ikuzi ozi-ọma ahụ na ihe nile nke ala-eze nye nzukọ-nsọ, ma nye ụwa, ga-aza ụgwọ ahụ nye onye ụkọchukwu na Zaịọn.

15 Otu a o sitere na nzukọ-nsọ pụta, n’ihi na dịka aiwu siri dị onye ọbụla nke ga-abịarute Zaịọn garịrị edota ihe nile n’iru ụkọchukwu na Zaịọn.

16 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, na dịka onye okenye ọbụla na mpaghara ubi vine nke a garịrị inye nkọwasị nke ọkwa-ọrụ ya nye ụkọchukwu na mpaghara ubi vine nke a—

17 Otu aasambodo sitere n’aka onye-ikpe ma-ọbụ ụkọchukwu na mpaghara ubi vine nke ebe a, nye ụkọchukwu na Zaịọn, mere ka a nabata onye ọbụla, ma zaakwa ihe nile, maka ihe-nketa ka a nabata ya dịka bonye ọrụ nwere uche, ma dịka onye-ọrụ kwesịrị ntụkwasị-obi;

18 Ma ọdighị otu a ụkọchukwu na Zaịọn agaghị anabata ya.

19 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ka onye okenye obụla onye na-aga inye nkọwasị n’aka ụkọchukwu na mpaghara ubi vine nke a bụrụ onye ji akwụkwọ kọrọ-akụkọ ọma ya site na nzukọ-nsọ ma-ọbụ nzukọ-nsọ nile, ebe ọ na-arụ ka ọ wee nwe-ike inye onwe ya na nkọwasị ya nile ịbụrụ ihe a nabatara n’ihe nile.

20 Ma ọzọ, ka unu odibo m ndị a họpụtara dịka ndị-ozi nye ihe gbasara aihe edere-ede nile nke nzukọ-nsọ m nwere ike ị nata enye m-aka site n’aka ụkọchukwu ma-ọbụ ndị ụkọchukwu n’ihe nile—

21 Ka amkpughe nile bụrụ ihe e bipụtara, ma ga-n’iru rute nsọtụ nile nke ụwa; ka ha kwa nwee ike ịna ego nile nke ga-abara nzukọ-nsọ uru n’ihe nile;

22 Ka ha kwa nwee ike inye onwe ha dịka ndị a nabatara n’ihe nile, ma bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ọrụ nwere uche.

23 Ma ugbụ a, lee, nke a ga-abụ ihe nlere-anya nye ngalaba nzukọ nsọ m nọ n’ebe nile n’ala nile ebe ehiwere ha. Ma ugbụ a abịa m na ngwụcha nke ihe nile m na-ekwu. Amen.

24 Okwu ole na ole na mgbakwụnye n’iwu nile nke ala-eze gbasara ndị-otu nzukọ-nsọ—ndị ahụ nke a ahọpụtara site na Mụọ Nsọ ka ha garue na Zaịọn, ma ndị nwere ohere ịga rue na Zaịọn—

25 Ka ha were nye ụkọchukwu asambo sitere n’aka ndị okenye atọ nke nzukọ-nsọ ma-ọbụ asambo site n’aka ụkọchukwu;

26 Ma ọdịghị otu a onye ahụ nke ga-apụ rue n’ala nke Zaịọn a gaghị abụ onye a gụrụ dịka onye ọrụ nwere uche. Nke a bụ kwa ihe nlere-anya Amen.