Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 76


Nkeji 76

Ọ́hụ̀ e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Hiram, Ohio, 16 Februarị 1832 (History of the Church, 1:245–252). Mgbe o na-ede okwu mmalite nke ndekọta ọ́hụ̀ a Onye-amụma dere “Mgbe m lọghachiri site n’ọgbakọ Amherst, a malitekwara m ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ-nsọ nile. Site n’ọtụtụ mkpughe nile nke m nataworo, o doro anya na ọtụtụ akụkọ dị mkpa gbasara mgbapụta nke mmadụ, ka e wepụrụ na Bible, ma-ọbụ na o furu tutu a chikọta ya. Ọ gbara ama nke onwe ya, site n’ezi okwu nile ndị a hapụrụ, na ọbụrụ na Chineke na-akwụghachi onye ọbụla ụgwọ-ọrụ ya nile dika ihe ndị e mere na arụ siri dị, ebe ahụ bụ ‘Elu-igwe’, dịka akwadoro ya ịbụ ụlọ ebe-obibi ebighi-ebi nke Ndị-nsọ, garịrị ịgụnye ala-eze karịrị otu. Maka nke a,…dịka a na-atụgharị Ozi-ọma nke Jọn Onye-nsọ, mụ onwe m na Okenye Rigdon hụrụ ọ́hụ̀ nke a na-eso”. (History of the Church, 1:245), Ọ bụ mgbe Onye-amụma tụgharịsịworo Jọn 5:29 ka e nyere ọ́hụ̀ nke a.

1–4, Onye-nwe bụ Chineke; 5–10, Ihe-omimi nile nke ala-eze ga-abụ nke ekpughere nye ndị kwesịrị ntụkwasị-obi; 11–17, Mmadụ nile ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume ma-ọbụ ndị ajọọ-omume; 18–24, Ndị bi n’ọtụtụ ụwa bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị Chineke mụrụ site n’ịchụ-aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst; 25–29, Otu mụọ-ozi nke Chineke dapụrụ ma bụrụ ekwensu; 30–49, Ụmụ nke mbibi ga-ata ahụhụ nke ọmụma ikpe ebighi-ebi, ndị ọzọ nile ga-enweta ogo nzere nke nzọpụta; 50–70, Ebube ahụ na ụgwọ-ọrụ nke ndị e buliri elu n’ala-eze selestịal ka a kọwara; 71–80, Ndị ahụ ga-eketa ala-eze nke terrestrial nile ka a kọwara; 81–113,Ogo nke ebube nile nke ndị nọ na telestial, terrestrial, na selestịal ka a kọwara; 114–119, Ndị nile kwesịrị ntụkwasị-obị ga-enwe ike ịhụ ma ghọta ihe-omimi nile nke ala-eze nke Chineke site n’ike nke Mụọ Nsọ.

1 aNụrụ, O unu elu-igwe nile, ma chee ntị, O ụwa, ma n̄urịa nụ unu ndị nile bi ebe ahụ n’ihi na Onye-nwe bụ bChineke, ma ewezuga ya ọ cdịghị dOnye-nzọpụta ọzọ.

2 aUkwuu ka amamihe ya dị, bịtụ n’anya ka ụzọ ya nile dị, ma ogo nke omume ya nile onweghị onye nwere ike ịchọpụta.

3 aNzube ya nile enweghi mgbochi, ọbụghị ma onwere onye nwere ike ịkwụsị aka ya.

4 Site mgbe ebighi-ebi ruo mgbe ebighi-ebi ọ bụ aotu ihe ahụ, ma afọ ya nile adịghị bada.

5 N’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru—Mụ, Onye-nwe, e nwere m aobi ebere na amara nye ndị bna-atụ egwu m, ma na-enwe mmasị ịkwanyere ndị cna-efe m ofufe n’ezi omume ma n’ezi-okwu ùgwù ruo n’ọgwụgwụ oge.

6 Ukwuu ka ụgwọ-ọrụ ha ga-adị ma ebighi-ebi ka aebube ha ga-adị kwa.

7 Ma ha ka m aga-ekpughere bihe-omimi nile, e, ihe-omimi nzuzo nile nke ala-eze m site n’ụbọchị ochie nile, ma maka oge nile nke ga-abịa, ka m ga-egosi ha ị dị mma nke ọchịchọ m gbasara ihe nile metụtara ala-eze m.

8 E, ọbụna ihe ebube nile nke mgbe ebighi-ebi ka ha ga-amata, ma ihe nile ga-abịa ka m ga-egosi ha, ọbụna ihe nile nke ọtụtụ ọgbọ.

9 Ma ka aamamihe ha ga-adị ukwuu, ma bnghọta ha ga-eru n’elu-igwe; ma n’iru ha amamihe nke ndị maara ihe cga-ala n’iyi, na nghọta nke ndị na-akpachapụ-anya ga-abụ ihe efu.

10 N’ihi na site na aMụọ m ka m bga-agba ama nye ha, ma site cn’ike m ka m ga-eme ka ha mata ihe nzuzo nile nke ọchịchọ m—e, ọbụna ihe ndị ahụ danya n’ahụtụbeghi, ma-ọbụ ntị nụtụbeghị, ma-ọbụ batatụbeghị n’ime obi nke mmadụ.

11 Anyị, Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon, ebe anyị nọ an’ime Mụọ ka ọnwa Februarị gbara mkpuru ụbọchị iri na isii, n’afọ nke Onye-nwe anyị otu pụkụ, narị asatọ, na iri atọ na abụọ—

12 Site n’ike nke aMụọ e mepere banya anyị nile ma nghọta anyị nile ka a kpalitere, ka anyị wee hụ ma ghọta ihe nile nke Chineke—

13 Ọbụna ihe ndị ahụ malitere n’isi mbụ tutu ụwa adị, ndị nke Nna chiworo echichi site n’otu Ọkpara ọ Mụrụ Nani ya, onye nke dabere n’obi nke Nna ya, obụna site na ammalite;

14 Onye ahụ anyị na-agba ama ya; ma ama nke anyị na-agba bụ uju nke ozi-ọma nke Jisus Kraịst, onye bụ Ọkpara, onye anyị hụrụ na onye anyị na ya akparịtara ụka na bọ́hụ̀ nke elu-igwe ahụ.

15 N’ihi na dịka anyị na-arụ ọrụ antugharị asụsụ ahụ, nke Onye-nwe họpụtaworo anyị, anyị bịaruru n’ama okwu nke iri abụọ na iteghete nke isi ise nke Jọn, nke e nyere anyị otu a—

16 N’ikwu maka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, gbasara ndị ahụ ndị nke ga-aanụ olu nke bỌkpara nke Mmadụ:

17 Ma ga-apụta; ndị ahụ ndị nke mere aezi-ihe, na bmbilite n’ọnwụ nke cndị ezi-omume; na ndị ahụ ndị nke mere ihe-ọjọọ, na mbilite n’ọnwụ nke ndị ajọọ-omume.

18 Ugbụ a nke a mere ka ọ tụ anyị n’anya, n’ihi na e nyere anyị ya site na Mụọ.

19 Ma dịka anyị nọ ana-atụgharị uche n’ihe ndị a, Onye-nwe metụrụ anya ime mụọ nke nghọta anyị aka, ma e mepere ha, ma ebube nke Onye-nwe mụkwasiri gburu gburu.

20 Ma anyị hụrụ aebube nke Ọkpara ahụ, nọ bn’aka nri nke cNna, ma uju ya ka anyị natara;

21 Ma hụ andị mụọ-ozi dị nsọ, ma ha ndị e bdoro nsọ n’iru oche-eze ya, na-akpọ isi-ala nye Chineke, na Nwa-atụrụ ahụ, ndị nke cna-akpọrọ ya isi ala ruo mgbe nile na mgbe nile.

22 Ma ugbụ a, mgbe e nyesịworo ọtụtụ ama nke e nyeworo maka ya, nke a bụ aọgbụgba-ama ahụ, nke ikpe azu n’ime ha nile, nke anyị na-enye maka ya: Na ọ bdị ndụ!

23 N’ihi na anyị ahụrụ ya, ọbụna n’aka nri nke bChineke; ma anyị nụrụ olu na-agba ama na ọ bụ Onye ahụ cAmụrụ Nanị ya nke Nna—

24 Na site n’aka aya, ma site na ya, ma na ya, bụwa nile ahụ dị, ma e kere ha, ma ndị bi n’ebe ahụ bụ cụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị a mụrụ nye Chineke.

25 Ma nke a ka anyị hụkwara, ma na-agba ama, na otu amụọ-ozi nke Chineke onye nke nọ n’ikike n’iru nke Chineke, onye nupuru isi megide Ọkpara nke a Mụrụ Nanị ya onye Nna hụrụ n’anya na onye dabere n’obi nke Nna, ka a chụdatara site n’iru nke Chineke na Ọkpara,

26 Ma a kpọrọ ya Onye-ịla n’iyi, n’ihi na elu-igwe nile kwara akwa maka ya—a kpọrọ ya aLusifa, nwa chi ọbụbọ.

27 Ma anyị hụrụ, ma lee, ọ adawo! ọ dawọ, ọbụna nwa nke chi ọbụbọ!

28 Ma dịka anyị ka nọ n’ime mụọ, Onye-nwe nyere anyị iwu ka anyị dee ọ́hụ̀ ahụ; n’ihi na anyị hụrụ Setan aagwọ ochie ahụ, ọbụna bekwensu ahụ, onye cnupuru isi megide Chineke, chọọ iwere ala-eze nke Chineke anyị na Kraịst ya—

29 Ya mere, ọ na-ebu aagha megide ndị-nsọ nke Chineke, na-agbabichi ha gburu gburu.

30 Ma anyị hụrụ ọ́hụ̀ nke ahụhụ nile nke ndị ahụ ndị ọ lụsoro agha ma merie, n’ihi na otu a ka olu Onye-nwe dara nye anyị:

31 Otu a ka Onye-nwe kwuru gbasara ndị ahụ ndị maara ike m, ma e meworo ndị ketara-oke na ya, nyefee onwe ha site n’ike nke ekwensu ka e amerie ha, na ị gọnarị ezi-okwu ahụ ma jụ ike m—

32 Ha bụ ndị bụ aụmụ nwoke nke bịla n’iyi, ndị m na-ekwu maka ha na ọ gara aka ha mma na a mụghị ha amụ;

33 N’ihi na ha bụ abọ nile nke oke-iwe ndị a mara ikpe nke ịta-ahụhụ nke oke-iwe nke Chineke, ha na ekwensu na ndị mụọ-ozi ya na mgbe ebighi-ebi;

34 Gbasara ndị m kwuworo na ha enweghi amgbaghara n’ụwa nke a ma-ọbụ n’ụwa nke ga-abịa—

35 Ebe ha agọnarịworo Mụọ Nsọ mgbe ha natasịworo ya, ebe ha gọnarịworo Ọkpara nke a Mụrụ Nanị ya nke Nna, ebe ha bkpọgideworo ya n’obe nye onwe ha ma debe kwa ya n’ọnọdụ ihere n’iru ọha.

36 Ndị a bụ ndị nke ga-adaba n’ime aọdọ ọkụ na nkume ọku, ha na ekwensu na ndị mụọ-ozi ya—

37 Na nanị ndị aọnwụ nke ugboro abụọ ga-enwe ike ọbụla n’arụ ha;

38 E, n’ezie, ndị nanị aha n’agaghị enwe mgbapụta n’oge akara-aka nke Onye-nwe mgbe ha tachara ahụhụ nile nke oke-iwe ya.

39 N’ihi na ndị ọzọ nile ka a aga-akpọlite site na bmbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, site na mmeri na ebube nke cNwa-atụrụ, onye e gburu, onye nọ n’adabere n’obi Nna tutu e kee ụwa nile.

40 Ma nke a bụ aozi-ọma ahụ, ozi ọma, nke olu ahụ nke sitere n’elu-igwe gbara ama nye anyị—

41 Na ọ bịara n’ime ụwa, ọbụna Jisus ka a akpọgbuo ya maka ụwa, na biburu mmehie nke cụwa, na dido ụwa nsọ, na eịsacha ya site n’ajọọ-omume ya nile;

42 Na site na ya e nwere ike aịzọpụta mmadụ nile ndị Nna tinyere n’ike ya ma kee site na ya;

43 Ndị na-eto Nna, na-azọpụta aka-ọrụ nile nke aka ya, ewezuga ụmụ nke mbibi ndị na-agọnarị Ọkpara ahụ mgbe Nna kpughesiworo ya nye ha.

44 Ya mere, ọ na-azọpụta mmadụ nile ewezuga ha—ha ga-aga baa na antaram-ahụhụ bmgbe nile na-adigide, nke bụ ntaram-ahụhụ agwụgh-agwụ, ịchị-achị ha na cekwensu na ndị mụọ-ozi ya na mgbe ebighi-ebi, ebe dikpuru ha n’adịghị anwụ, ma ọdọ ọkụ ya adịghị anyụ anyụ, nke bụ ịta ahụhụ ha.

45 Ma ansọtụ ya ebe ahụ, ọbụghị ma ebe ọbụ, ma-ọbụ ntaram-ahụhụ ha, onweghị mmadụ ọbụla maara;

46 Ọ bụghị ma e kpughere ya, ọbụghị ma ọ dị, ọbụghị ma n’aga ekpughe ya nye mmadụ, ewezuga ndị nke e mere ndị nketa oke ebe ahụ.

47 Otu osila dị, mụ, Onye-nwe, na-egosi ya site n’ọ́hụ̀ nye ọtụtụ, mana otu mgbe ahụ ekpuchie kwa ya ọzọ;

48 Ya mere, ọgwụgwụ ya, mbara ya, ogo ya, aomimi ya, na nhuju anya n’ebe ahụ, ha aghọtaghị, ma ọbụghị dị onye ọbụla ewezuga ndị ahụ ndị a bhọpụtara nye camamikpe nke a.

49 Ma anyị nụrụ olu ahụ na-asị: Dee ọ́hụ̀ ahụ, n’ihi na lee, nke a bụ ọgwụgwụ nke ọ́hụ̀ nke ahụhụ nile nke ndị n’amaghị Chineke.

50 Ma ọzọ anyị na-agba ama—n’ihi na anyị hụrụ ma nụrụ, ma nke a bụ aọgbụgba-ama nke ozi-ọma nke Kraịst gbasara ha ndị ga-apụta na bmbilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume—

51 Ha bụ ndị natara ọgbụgba-ama nke Jisus, ma akwere n’aha ya ma emee ha bbaptism cn’usoro dị ka nke olili ya, ebe a dna-eli ha n’ime mmiri n’aha ya, ma nke a dịka iwu-nsọ nke o nyeworo siri dị—

52 Na site n’idebe iwu-nsọ nile na-enwe ike aisa ha ma bsapụ ha site na mmehie ha nile, ma nata mụọ nso site n’ibịkwasị caka nile nke onye ahụ e dchiri echichi ma arachiri nye en’ike nke a;

53 Ma ndị na-emeri site n’okwukwe, ma bụrụ ndị a arachiri site na bMụọ Nsọ nke nkwa nke Nna na-ezitara ndị nile ahụ bụ ndị ezi-omume na ezi-okwu.

54 Ọ bụ ha ndị bụ nzukọ-nsọ nke Onye e aBuru Uzọ mụọ.

55 Ọ bụ ha bụ ndị Nna tinyere aihe nile n’aka ha—

56 Ọ bụ ha bụ andị nchụ-aja na ndị-eze, ndị nataworo site n’uju ya, ma site n’ebube ya.

57 Ma bụrụ andị nchụ-aja nke Onye Kachasị Elu, dịka usoro Melkizedek siri dị, nke bụ dịka usoro nke bInok siri dị, nke bụ dịka cusoro nke Ọkpara a Mụrụ Nanị ya siri dị.

58 Ya mere, dịka e deworo ya, ha bụ achi nile, ọbụna bụmụ nke cChineke

59 Ya mere, aihe nile bụ nke ha, ma-ọbụ ndụ ma-ọbụ ọnwụ, ma-ọbụ ihe nile dị ugbụ a, ma-ọbụ ihe ga-adị, ihe nile bụ nke ha ma ha bụ ndị nke Kraịst, ma Kraịst bụ nke Chineke.

60 Ma ha aga-emeri ihe nile.

61 Ya mere, ka onye ọbụla aanyala-isi n’ime mmadụ, mana kama ka ọ bnyaa isi n’ime Chineke, onye cga-emeri ndị-iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya.

62 Ndị a aga-anọ bn’iru nke Chineke na Kraịst ya ruo mgbe nile na mgbe nile.

63 Ndị a bụ aha ndị ọ ga-akpọta bịa, mgbe ọ bga-abịa n’igwe-ojii nile nke elu-igwe cịchị ndị nke ya n’ụwa.

64 Ndị a bụ ha ndị ga-enwe oke na mbilite n’ọnwụ anke mbụ.

65 Ndị a bụ ha ndị ga-apụta na ambilite n’ọnwụ nke ndị ezi-omume.

66 Ndị a bụ ha ndị bịarutaworo an’Ugwụ bZaịọn, ma rute n’obodo nke Chineke dị ndụ, ebe elu-igwe ahụ, ebe kachasị dị nsọ.

67 Ndị a bụ ha ndị bịakwutaworo imerime ndị mụọ-ozi a napụghị ịgụta ọnụ, rue n’ọgbakọ zuru ọha nile na nzukọ-nsọ nke aInọk, na nke bOnye e Burụ Uzọ mụọ.

68 Ndị a bụ ha ndị e adeworo aha ha n’elu-igwe, ebe Chineke na Kraịst bụ bndị ikpe mmadụ nile.

69 Ndị a bụ ha andị ezi-omume ndị e meworo ka ha bzuo-oke site na Jisus onye-ogbugbo nke cọgbụgba-ndụ ọhụrụ, onye dchụrụ-aja mgbaghara mmehie nke a zuru oke site n’ịkwafu eọbara nke ya.

70 Ndị a bụ ha ndị arụ ha bụ nke aselestịal, ndị bebube ha bụ nke canyanwụ, ọbụna ebube nke Chineke, nke kachasị elu, onye ụdị ebube anyanwụ ahụ nke mbara elu ka e deworo na ọ dịka ya.

71 Ma ọzọ, anyị hụrụ ụwa nke aterrestrial, ma lee ma hụrụ, ndị a bụ ha ndị ahụ bụ nke terrestrial, ndị ebube ha dị iche site na nke nzukọ-nsọ nke Onye e Buru Uzọ mụọ, ndị nke nataworo uju nke Nna, ọbụna dịka nke bọnwa siri dị iche site na nke anyanwụ na mbara elu.

72 Lee, ndị a bụ ha ndị nwụrụ mgbe a an’edebeghị biwu;

73 Ma kwa ndị bụ amụọ nile nke mmadụ e dotara bn’ụlọ nkpọrọ, ndị nke Ọkpara letara, ma ckwusaara dozi-ọma nye ha, ka e wee kpee ha ikpe dịka ndị mmadụ n’anụ arụ;

74 Ndị n’anataghị aọgbụgba-ama nke Jisus n’anụ arụ, mana mesịa nata ya.

75 Ndị a bụ ha ndị a na-enye nsọpụrụ nke ụwa, ndị kpuru-isi site n’aka aghụghọ nke mmadụ.

76 Ndị a bụ ha ndị na-anata site n’ebube ya ma ọbụghị n’uju ya.

77 Ndị a bụ ha ndị na-anata site n’iru nke Ọkpara, mana ọbụghị n’uju nke Nna.

78 Ya mere, ha nwere aarụ nile nke terrestrial, ma ọbụghị arụ nile nke selestịal, ma dị iche n’ebube dịka ọnwa siri dị iche site n’anyanwụ.

79 Ndị a bụ ha ndị an’esighi-ike na ọgbụgba-ama nke Jisus; ya mere, ha anataghị okpu-eze ahụ nke ala-eze nke Chineke anyị.

80 Ma ugbụ a nke a bụ ọgwụgwụ nke ọ́hụ̀ ahụ nke anyị hụrụ nke terrestrial, nke Onye-nwe nyere anyị iwu ide mgbe anyị ka nọ na Mụọ.

81 Ma ọzọ, anyị hụrụ ebube nke atelestial, ebube nke bụ nke dị nta, ọbụna dịka ebube nke kpakpando nile siri dị iche site n’ebube nke ọnwa na mbara elu.

82 Ndịa bụ ha ndị n’anataghị ozi-ọma nke Kraịst, ọbụghị aọgbụgba-ama nke Jisus.

83 Ndị a bụ ha ndị n’anaghị agọnarị Mụọ Nsọ.

84 Ndị a bụ ha ndị a na-akwaba an’ala mụọ.

85 Ndị a bụ ha ndị a n’agaghị agbapụta site n’aka nke aekwensu ruo na mbilite n’ọnwụ nke bikpe-azụ, ruo mgbe Onye-nwe, obụna Kraịst cNwa-atụrụ ahụ, rusịworo ọrụ ya.

86 Ndị a bụ ha ndị n’anaghị anata site n’uju ya n’ime ụwa ebighi-ebi, mana site na Mụọ Nsọ site n’ije-ozị nke terrestrial;

87 Ma terrestrial ahụ site an’ije-ozị nke selestịal.

88 Na kwa telestial ahụ na-anata ya site na nleba anya nke ndị mụọ-ozi ndị a họpụtara ije-ọzi maka ha, ma-ọbụ ndị a họpụtara ịbụ mụọ ndị na-eje ozi maka ha, n’ihi na ha ga-abụ ndị nketa nke nzọpụta.

89 Ma otu a anyị hụrụ, n’ọ́hụ̀ nke elu-igwe ahụ ebube nke Ala-eze terrestrial nke karịsịrị nghọta nile;

90 Ma onweghị onye maara ya ewezuga onye ahụ Chineke kpugheere ya.

91 Ma otu a anyị hụrụ ebube nke terrestrial nke kachasị n’ihe nile ebube nke terrestrial, obụna n’ebube, ma ike, ma n’ume, ma ebe ọchịchị.

92 Ma otu anyị hụrụ ebube nke selestịal ahụ, nke kachasị n’ihe nile—ebe Chineke, ọbụna Nna ahụ, na-achị n’elu oche-eze ya ruo mgbe nile na mgbe nile;

93 N’iru oche-eze ya ihe nile ga-akpọ isi ala na ankwanye ùgwù, umeala, ma na-enye ya otuto ruo mgbe nile na mgbe nile.

94 Ndị ahụ ndị bi an’iru ya bụ nzukọ-nsọ nke bOnye e Buru Uzọ muọ; ma ha na-ahụ dịka esi ahụ ha; ma cmata dịka esi mara ha, ebe ha nataworo site n’uju na ya site dn’amara ya;

95 Ma ọ na-eme ha aịhara-otu n’ike, ma n’ume, ma n’ebe-ọchịchị.

96 Ma ebube nke selestịal bụ otu, ọbụna dịka ebube nke aanyanwụ siri bụrụ otu.

97 Ma ebube nke terrestrial bụ otu, ọbụna dịka ebube nke ọnwa siri bụrụ otu.

98 Ma ebube nke telestial bụ otu, ọbụna dịka ebube nke kpakpando nile siri bụrụ otu; n’ihi na dịka otu kpakpando siri dị iche site na kpakpando ọzọ n’ebube, obụna otu a ka otu siri dị iche site na nke ọzọ n’ebube n’ime ụwa telestial;

99 N’ihi na ndị a bụ ha ndị bụ nke aPọl, na nke Apọlos, na kwa Sifas.

100 Ndị a bụ ha ndị na-asị na ha bụ ụfọdụ nke otu onye na ụfọdụ nke onye ọzọ—ụfọdụ nke Kraịst ma ụfọdụ nke Jọn, ma ụfọdụ nke Moses, ma ụfọdụ nke Elaias, ma ụfọdụ nke Esaịas, ma ụfọdụ nke Aịsaịa, ma ụfọdụ nke Inọk;

101 Mana ha anataghị ozi-ọma, ọbụghị ma-ọbụ ọgbụgba-ama nke Jisus, ọbụghị ma-ọbụ nke ndị-amụma, ọbụghị ma-ọbụ ọgbụgba-ndụ amgbe nile na-adigide.

102 Nke ikpe-azụ, ndị a nile bụ ha ndị a n’agaghị ekpọkọta ha na ndị nsọ, ka e awelikọọ ha nye bnzukọ-nsọ nke Onye e Buru Uzọ mụọ, ma nabata ha n’igwe ojii.

103 Ndia bụ andị ahụ bụ bndị ụgha, na ndị na-agwọ nsi, cndị ọkwa-iko, na ndị akwụnakwụna na onye ọbụla na-ahụ ụgha n’anya ma na-atụ asi.

104 Ndị a bụ ha ndị na-ata ahụhụ aiwe-ọkụ nke Chineke n’ụwa.

105 Ndị a bụ ha ndị na-ata ahụhụ aịbọ-obo nke ọkụ ebighi-ebi.

106 Ndị a bụ ha ndị a chụdatara an’ala mụọ ma bna-ata ahụhụ iwe-ọkụ nke Chineke cPụrụ Ime Ihe nile, ruo dozuzu oge nile akara aka, mgbe Kraịst edebesiworo ndị iro ya nile n’okpụrụ ụkwụ ya abụọ, ma fga-emejupụtawo ọrụ ya;

107 Mgbe ọ ga-anapụta ala-eze ahụ, ma chee ya n’iru Nna, n’enweghị ntụpọ, na-asị: E meriwo m ma azọdawo ụkwụ igwe bịkụ mmanya ahụ n’anị m, ọbụna igwe ịkụ mmanya nke dị egwu nke iwe-ọkụ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile.

108 Mgbe ahụ ka a ga-ekpube ya okpu-eze nke ebube ya, ịnọdụ an’oche-eze na ike ya ịchị ruo mgbe nile na mgbe nile.

109 Ma lee, ma hụrụ, anyị hụrụ ebube ahụ na ndị nile bi n’ụwa telestial, na ha enweghi ngụta dịka kpakpando nile dị na mbara nke elu-igwe, ma-ọbụ dịka aja dị n’ikpere mmiri;

110 Ma nụ olu nke Onye-nwe na-asi: Ndị a nile ga-ehulata ikpere, na ire nile ga-aekwupụta nye ya onye na-anọ n’oche-eze ahụ ruo mgbe nile na mgbe nile;

111 N’ihi na a ga-ekpe ha ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, ma onye ọbụla ga-anata dịka aọrụ ya nile siri dị, ebe-ọchịchị ya, n’ime bụlọ nile nke a kwadoro;

112 Ma ha ga-abụ ndị odibọ nke Onye Kachasị Elu; mana aebe Chineke na Kraịst bbị ha agaghị enwe ike ịbịa, ụwa nile enweghị nsọtụ.

113 Nke a bụ ọgwụgwụ nke ọ́hụ̀ ahụ nke anyị hụrụ, nke e nyere anyị iwu ide mgbe anyị ka nọ na mụọ.

114 Mana annukwu na ịtụ n’anya ka ọrụ nile nke Onye-nwe dị, ma bihe omimi nile nke ala-eze ya nke o gosiri anyị, nke karịrị nghọta n’ebube, ma n’ike, ma n’ebe-ọchịchị;

115 Nke o nyere anyị iwu ka anyị edela mgbe anyị ka nọ na Mụọ, ma n’ezigh ezi an’iwu mmadụ ikwu ya;

116 Obụghị ma mmadụ o nwere aike imeka a mata ha, n’ihi a ga-ahụ ha ma bghọta kwa ha nanị site n’ike nke Mụọ Nsọ, nke Chineke n’enyekwasị ndị ahụ nke hụrụ ya n’anya, ma doo onwe ha nsọ n’iru ya;

117 Ndị ọ na-enye ohere nke ịhụ ma ịmata n’onwe ha;

118 Na site n’ike na ngosipụta nke Mụọ ahụ dịka a nọ n’anụ arụ, ha ga-enwe ike ịnagide ịnọ n’iru ya n’ụwa nke ebube;

119 Ma ka enye Chineke na Nwa-atụrụ ahụ otuto, na nsọpụrụ, na ebe-ọchịchị, ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.