Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 99


Nkeji 99

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye John Murdock, Ọugọst 1832, na Hiram, Ohio. N’agbanyeghị na mbipụta nile nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile malite na 1876 e depụtawo mkpughe nke a dịka Kirtland, Ọugọst 1833, mbipụta ndị mbụ na akwụkwọ ndekọta akụkọ nile na-emesi-ike nye ozi nke bụ ezie.

1–8, John Murdock ka a kpọrọ ị ma-ọkwa ozi-ọma, ma ndị ahụ nke nabatara ya nabatara Onye-nwe ma ga-anata ebere.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye nwa odibo m Joseph Murdock—gị ka a kpọrọ ị ga n’ime mba ndị ọwụwa-anyanwụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, site n’ọnụmara ruo n’ọnụmara, ma site n’obodo-ukwu ruo n’obodo-ukwu, ịma ọkwa ozi-ọma mgbe nile na-adigide nye ndị nile bi ebe ahụ, n’etiti amkpagbu na ajọọ-omume.

2 Ma onye anabatara gị nabatara m; ma ị ga-enwe ike ikwụpụta okwu nke m na-bngosipụta nke Mụọ Nsọ m.

3 Ma onye nabatara gị adịka nwatakịrị nabatara bala-eze nke m; ma ngọzi na-adịrị ha, n’ihi na ha ka a ga-emere cebere.

4 Ma onye obụla nke jụrụ ịnabata gị ga-abụ onye nke Nna m na ndị ụlọ ya aga-ajụ kwa ị nabata; ma ị ga-etichapụ aja bn’ukwu gị abụọ n’ebe nzuzo nile n’ụzọ dịka ihe ọgbụgba-ama megide ha.

5 Ma lee, ma hụrụ, a ga m aabịa ọsọ-ọsọ bikpe-ikpe, ime ka mmadụ nile tụgharịa uche site n’omume nile nke amaghị-Chineke ha nke ha meworo megide mụ, dịka e dere ya gbasara m n’ụkwụ-akwụkwọ ahụ

6 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m gị, ọ dịghị mkpa na ị ga-aga ruo mgbe a ga-enwetara ụmụ gị ihe, ma zipụ ha n’obi ọma n’aka ụkọchukwu nke Zaịọn.

7 Ma mgbe afọ ole na ole gasịrị, ọbụrụ na ị chọọ site n’aka m, ị ga-enwe ike ị ga n’ala ọma ahụ, ị ga nweta ihe-nketa nke gị;

8 Ma ọ bụghị otu a ị ga-aga n’iru na-ama ọkwa nke ozi-ọma m aruo mgbe a ga-ewere gị. Amen.