Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 135


Nkeji 135

Ogbugbu n’ihi ihe ha kweere e gburu Joseph Smith Onye-amụma na nwanne ya nwoke, Hyrum Smith Onye isi ezi na ụlọ, na Carthage, Illinois, 27 Jun 1844 (History of the Church, 6:629–631). Akwụkwọ nke a ka Okenye John Taylor nke Kansụl nke Iri na Abụọ dere, onye bụ onye akaebe nye ihe nile mere.

1–2, Joseph na Hyrụm ka e gburu n’ihi ihe ha kweere n’ime Ụlọ-mkpọrọ Carthage; 3, Ọnọdụ ị bu onye mbụ kacha elu n’etiti ndị ọzọ nke Onye-amụma ka e ji iti mkpu jaa mma; 4–7, Ọbara ha nke ikpe na-amaghị na-agba aka ebe banyere ezi okwu ahụ na ọrụ ahụ si na Chineke.

1 Iji rachie ọgbụgba-ama nke akwụkwọ a na Akwụkwọ nke Mọmọn, anyị na-ekwupụta aogbugbu n’ihi ihe ha kweere e gburu bJoseph Smith Onye-amụma, na Hyrum Smith Onye-isi ezi n’ụlọ. A gbagburu ha n’ime ụlọ-mkpọrọ cCarthage, na 27, Jun 1844 n’ihe dịka elekere ise nke ehihie, site n’aka ndị mmadụ ji egbe na-agba aghara aghara teworo onwe ha agba ojii—dị site 150 ruo 200 na ọnụ ọgụgụ. dHyrum ka ha gbagburu na mbụ, ma ya ejiri nwayọ daa, tie mkpu sị: Abụ m onye nwụrụ anwụ! Joseph mapụtara site windo, na a gbagburu ya mgbe ọ na-eme nke a, ya etie mkpu sị: O Onye-nwe Chineke m! Ha abụọ ka a gbara mgbọ mgbe ha nwụwororị n’omume obi ụfụ, na ha abụọ nwetara mgbọ anọ nile.

2 aJohn Taylor na Willard Richards, abụọ n’ime mmadụ Iri na abụọ ahụ bụ ndị nanị nọọrọ n’ime ụlọ ahụ n’oge ahụ; e merụrụ onye nke mbụ arụ na-omume obi ịta mmiri site na-iji mgbọ anọ nile, mana arụ adịworị ya mma; onye nke ikpe azụ, site na inye-aka nke Chineke lafeere na-enweghi ọbụladị oghere n’ime uwe nwụda ya.

3 Joseph Smith, aOnye-amụma na bỌhụ-ụzọ nke Onye-nwe, emewo, ma-ọbụghị Jisus nanị, n’ihi nzọputa nke mmadụ n’ime ụwa nke a, karịa madụ ọbụla ọzọ nke na-ebiwo n’ime ya. N’ime mkpirisi oghere nke iri afọ abụọ, o wepụtawo Akwụkwọ nke Mọmọn, nke ọ tugharịworo site n’onyinye n’ike nke Chineke, na bụrụwo ụzọ esi gbasaa ya na nnukwu obosara obodo abụọ nile nke ụwa; o zipuwo cuju ozi-ọma mgbe nile na-adigide nke dị n’ime ya, gaa n’akụkụ anọ nile nke ụwa; ọ wetawo mkpughe nile ahụ na iwu nsọ nile ndị mejuworo akwụkwọ nke a nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, na ọtụtụ akwụkwo nile nke amamihe na ntụzi-aka n’ihi ọdịmma nke ụmụ nke mmadụ; ọ kpọkọtawo ọtụtụ puku nile nke Ndị-nsọ Ụbọchị-ikpeazụ a, wuo oke dobodo na hapụ ịdị ukwuu na aha nke na-agaghị egbu egbu. O biri oke ndụ, na ọ nwụrụ oke ọnwụ n’anya nile nke Chineke na ndị ya; na dịka imerime ndị nke Onye-nwe e tere mmanụ na mgbe ochie nile, o jiwo eọbara ya rachie ozi ya nile, na otu ahụ ka nwanne ya nwoke Hyrum mere. Na ndụ ha e kewaghị, na n’ọnwụ, ha a gbasasịghị.

4 Mgbe Joseph gara na Carthage iwere onwe ya nye n’aka ọchịchị nke iwu e jiri aghụghọ tinye, ụbọchị abụọ ma-ọbụ atọ tutu e gbuo ya, ọ sịrị: “Ana m aga dịka anwa atụrụ na-aga ruo ebe ana egbu anụ, mana adị m jụụ dịka ụtụtụ ọkọchị. E nwere m akọ n’uche nke na-adịghị asụ ngọngọ n’ebe Chineke nọ na ebe mmadụ nile nọ. Aga m anwụ na-enweghi ọmụma ikpe, na a ga-ekwuriri banyere m—egbuchuru ya egbuchu.”—N’otu ụtụtụ ahụ mgbe Hyrum kwadosiworo ịga—a ga-asị ebe a na-egbu anụ? e, n’ihi na otu ahụ ka ọdị—ọ gụrụ ama okwu nke a na-eso, dị nso na mmechi isi nke iri n’abụọ nke Ita, n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, na kpudo ibe akwụkwọ ahụ iru n’elu ya:

5 Na o wee ruo na ekpere m ekpere nye Onye-nwe ka o wee nye ndị Jentaịlụ nile amara, ka ha nwe afọ-ọma. Na o wee ruo na Onye-nwe sịrị m: Ọbụrụ na ha enweghị afọ-ọma, ọdịghị ihe o mere gị, i kwesịwo ntụkwasị obi, ya mere, a ga-eme ka uwe gị nile adị-ọcha. Na n’ihi na i hụwo adịghị ike gị, a ga-eme ka i sie ike, ọbụna ịnọdụ ala n’ebe ahụ nke m kwadoworo n’ebe obibi nile nke Nna m. Na ugbua ana m…asi ndị Jentaịlụ nọdụ nke-ọma, e, na kwa nye ụmụnna m ndị m hụrụ n’anya ruo mgbe anyị ga-ezukọ n’irụ boche-ikpe nke Kraịst; ebe mmadụ nile ga-ama na uwe m nile enweghi ntụpọ site n’ọbara unu. cNdị gbara ama nke a anwụwo ugbua, ma ọgbụgba-ama ha na-eguzo.

6 Hyrum Smith dị iri afọ anọ na anọ na Februarị, 1844, ma Joseph Smith dịịrị iri afọ atọ n’asatọ na Disemba, 1843, ma site ugbua gawa n’iru aha ha nile ka a ga-agụnye n’etiti ndị e gburu egbu n’ihi ihe ha kweere na okpukpere chi; ma onye ahụ na-agụ na mba nile ka a na-echetara na Akwụkwọ nke Mọmọn na akwụkwọ nke a nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile nke Nzụkọ nsọ, dara ọnụ ahịa nke ọbara kachasị mma nke nari afọ nke iri na itoolu iji wepụta ha n’ihi nzọpụta nke ụwa nke laworo n’iyi, na ọ bụrụ na ọkụ ga-ere osisi adị ndụ n’ihi otuto nke Chineke, ọ ga-adị mfe ya irechapụ osisi nile kpọrọ akpọ ime ka a sachaa ala-ubi vine site na-ire ure. Ha biri ndụ n’ihi otuto, ha nwụrụ n’ihi otuto, na otuto bụ nkwụghachi ụgwọ ebighi-ebi ha. Site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ ka aha ha nile ga-agbada ruo ụmụ mmadụ dịka ọla dị oke ọnụ ahịa nye ndị a sachaworo.

7 Ha bụụrụ ndị ikpe na-amaghị n’ihi ime ihe ọjọọ ọbụla dịka a gọpụworo ha ọtụtụ oge gara-aga, na e tinyere ha n’ụlọ-mkpọrọ site na-mgbakọ izuzu ndị nrapụta na ndị ajọọ mmadụ, na ọbara ha nke ikpe na-amaghị wụsara n’ala ụlọ-mkpọrọ Carthage bụ obosara nrachi a nyadoro “Ịbụ ndị Mọmọn” nke ụlọ ikpe ọbụla dị n’elu ụwa na-agaghị ajụ inabata, na ọbara ha nke ikpe na-amaghị nọ n’isi obodo nke Illinois, ya na-ekwesịghị ntụkwasị-obi nke obodo ahụ dịka nkwa nke onye-isi ọchịchị kwere, bụ ihe aka-ebe nye ezi-okwu nke ozi-ọma ahụ mgbe nile na-adigide na ụwa nile a gaghị agọnarị ya, na ọbara ha nke ikpe na-amaghị wụsara n’elu ọkọlọtọ nke ntọhapụ, na n’elu oke akwụkwọ iwu nke obodo United States bụ onye nnọchite anya nye okpukpe chi nke Jisus Kraịst, nke ga-ebitu obi nile nke ndị ezi-okwu aka n’etiti mba nile; na ọbara ha nke ikpe na-amaghị tinyere ọbara ndị ikpe na-amaghị nke ndị nile e gburu n’ihi ihe ha kweere n’okpuru aebe ịchụ aja ahụ nke Jọn hụrụ, ga-etiku Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha mkpu ruo mgbe ọ ga-abọ ọbọ ọbara ahụ n’elu ụwa. Amen.