Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 18


Nkeji 18

Mkpughe nye Joseph Smith Onye-amụma, Oliver Cowdery na David Whitmer, e nyere na Fayette, New York, Jun 1829 (History of the Church, 1:60–64). Mgbe e nyefere Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn. E kwere nkwa ịnye kwasị Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek (lee isi-ọkwu nkeji 13). Na nzaghachi nye arịrịọ maka ịmata banyere okwu a, Onye-nwe nyere mkpughe nke a.

1–5, Akwụkwọ-nsọ nile na-egosi otu esi ewulite Nzukọ-nsọ; 6–8, Ụwa na-acha n’ajọọ-omume; 9–16, Ọnụ-ahịa nke mkpụrụ-obi nile dị ukwuu; 17–25, Inweta nzọpụta, ndị mmadụ garịrị ebụkwasị onwe ha aha nke Kraịst; 26–36, Ọkpụkpọ-oku na mgbasa ozi-ọma nke Iri na abuo ahụ ka ekpughere; 37–39, Oliver Cowdery na David Whitmer garịrị achọpụta Iri na abụọ ahụ; 40–47, Inweta nzopụta, ndị mmadụ garịrị echegharị, mee baptism ma debe iwu-nsọ nile.

1 Ugbụ a, lee, n’ihi ihe nke gị, odibo m Oliver Cowdery, chọrọ ịmata site na m, e nye m gị okwu ndị a:

2 Lee, e gosipụtawo m nye gị, site na Mụọ m ọtụtụ oge, na ihe ndị a nile ị dere bụ aezi-okwu, ya mere ị matara na ha bụ ezi-okwu.

3 Ma ọbụrụ na ị matara na ha bụ ezi-okwu, lee, enye m gị iwu-nsọ, ka ị dabere n’ihe nile ndị a aedere ede;

4 N’ihi na n’ime ha ka e dere ihe nile gbasara ntọ-ala nke nzukọ-nsọ m, aozi-ọma m, na bnkume m.

5 Ya mere, ọbụrụ na ị ga-ewulite nzukọ-nsọ m, n’elu ntọ-ala nke ozi-ọma ma nkume m, ọnụ-ụzọ-ama nile nke ala mụọ agaghị aka kwa gị ike.

6 Lee, auwa na-acha n’ajọọ-omume; ma o kwesịrị ma dị mkpa ka ụmụ nke ndị mmadụ nwee mkpalite elu rue na nchegharị, ma bndị Jentaịlụ nakwa ụlọ nke Israel.

7 Ya mere, ebe e mere gị abaptism site n’aka odibo m Joseph Smith, Nta, dịka ka m nyere ya n’iwu, o mezuwo ihe m nyere ya n’iwu.

8 Ma ugbụ a, ya abụla ihe ịtụ n’anya nye gị na m kpọrọ ya na ebum n’obi nke mụ, ebum-n’obi nke a matara n’ime m; ya mere, ọbụrụ na ọ aga-arụsị ọrụ ike bidebe iwu-nsọ m nile a cga-agozi ya rue ndụ-ebighi ebi; ma aha ya bụ dJoseph.

9 Ma ugbụ a, Oliver Cowdery, a sị m gị, nakwa David Whitmer, n’ụdị iwụ-nsọ; n’ihi na, lee, e nyere m mmadụ nile iwu ebe nile ichegharị, ma a sị m unu, ọbụna dịka Pọl aonye-ozi m, n’ihi na a kpọrọ unu n’otu-ụdị ọkpụkpọ-oku nke a kpọrọ ya.

10 Cheta aọnụ-ahịa nke bmkpụrụ-obi nile dị ukwuu n’anya nke Chineke.

11 N’ihi na, lee, Onye-nwe aOnye-mgbapụta gị tara ahụhụ bọnwụ n’anụ arụ; ya mere ọ tara cahụhụ dmgbu nke mmadụ nile, ka mmadụ nile chegharịa ma bịakwute ya.

12 Ma o siwo na-ndị nwụrụ anwụ abilie ọzọ, ka o wee kpọtara onwe ya mmadụ nile, site na bnchegharị.

13 Ma lee ịdị ukwuu nke aọn̄ụ ya na mkpụrụ-obi nke chegharịrị!

14 Ya mere, a kpọrọ unu ka unu tie amkpu nchegharị nye ndị a.

15 Ma ọbụrụ otua na ị ga-arụsị ọrụ ike n’ụbọchị gị nile n’iti nchegharị nye ndị a, ma kpọtara m, ọbụna otu amkpụrụ-obi nye mụ, olee otu ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị na ya n’ala-eze nke Nna m!

16 Ma ugba a, ọbụrụ na ọn̄ụ gị ga-adị ukwuu n’otu mkpụrụ-obi nke ị kpọbatara nye m an’ala-eze nke Nna m, olee ịdị ukwuu nke bọn̄ụ gị ma ọbụrụ na ị ckpọbata ọtụtụ mkpụrụ-obi nye m!

17 Lee, unu nwere ozi-ọma m n’iru unu, nkume m, ma anzọpụta m.

18 aRịọ Nna bn’aha m, n’okwukwe na-ekwere na unu ga-anata, ma unu ga-enwe Mụọ Nsọ, nke na-egosipụta ihe nile ndị ckwesịrị nye ụmụ nke mmadụ.

19 Ma ọbụrụ ma unu enweghị aokwukwe, bolile-anya, na cafọ-ọma, unu agaghị enwe ike ime ihe ọbụla.

20 A adọla ndọrọ ndọrọ megide nzukọ-nsọ ọbụla, m’ọbụghị bnzụkọ nke ekwensu.

21 Wekwasị onwe unu aaha nke Kraịst, ma bkwuo ezi-okwu cna-anya udo.

22 Ma ka ha ra bụ ndị chegharịrị, ma amee baptism n’aha m, nke bụ Jisus Kraịst ma bnọgide ruo ọgwụgwụ, ndị ahụ ka a ga-azọpụta.

23 Lee, Jisus Kraịst bụ aaha nke Nna nyere, ma ọdịghị aha ọzọ e nyere nke a ga-esite nwee ike ịzọpụta mmadụ;

24 Ya mere, mmadụ nile garịrị ewekwasị onwe ha aha ahụ nke Nna nyere, n’ihi na aha ahụ ka a ga-akpọ ha n’ụbọchị ikpeazụ;

25 Ya mere, ọbụrụ na ha amataghị aaha nke a na-akpọ ha, ha a gaghị enwe ebe-obibi bn’ala-eze nke Nna m.

26 Ma ugbụ a, lee, o nwere ndị-ọzọ a kpọrọ ka ha kwupụta ozi-ọma, m, nye ma andị Jentaịlụ ma nye ndị Ju;

27 E, ọbụna Iri na Abụọ ahụ; ma aIri na Abụọ ahụ ga-abụ ndị na-eso ụzọ m, ma ha ga-ewekwasị onwe ha aha m; ma Iri na Abụọ ahụ bụ ha ndị ga-achọ ka ha wekwasị onwe ha baha m jiri ebum n’obi zuru oke.

28 Ma ọbụrụ na ha chọọ iwekwasị onwe ha aha m jiri ebum n’obi zuru oke, ha ka a kpọrọ ịga an’ụwa nile kwusaara bihe nile ekere eke cozi-ọma nke m.

29 Ma ha bụ ndị e chiri-echichi nke m aime baptism n’aha m, dịka ihe ahụ edere ede.

30 Ma unu nwere ihe ahụ edere ede n’iru unu; ya mere, unu garịrị eme ya dịka okwu ụdị nke ahụ edere ede siri dị.

31 Ma ugbụ a a sị m unu, aIri na Abụọ ahụ—Lee, amara m ezuworo unu; unu garịrị eje-ije n’ịkwụ ọtọ n’iru m ma emela mmehie.

32 Ma, lee, unu bụ ndị ahụ m chiri echichi ka unu achie ndị nchụ-aja na ndị nkụzi; ikwupụta ozi-ọma m bdịka ike nke Mụọ Nsọ nke dị n’ime unu, dịka cọkpụkpọ-oku nile ahụ siri dị, ma dịka na onyinye nile nke Chineke nye ndị mmadụ;

33 Ma mụ, Jisus Kraịst, Onye-nwe-unu na Chineke unu e kwuwo ya.

34 aOkwu ndị a abụghị nke ndị mmadụ ma-ọbụ nke mmadụ, kama ha sitere na mụ; ya mere, unu ga-agba-ama na ha bụ nke m ma ọbụghị nke mmadụ;

35 N’ihi na ọ bụ aolu m na-ekwu ha nye unu, n’ihi na e nyere ha site na Mụọ m nye unu, ma site n’ike m unu nwere-ike ịgụ ha otu onye nye ibe ya; ma m’ọbụghị site n’ike m unu agaraghị enwe ha;

36 Ya mere unu nwere-ike aịgba-ama na unu anụwo olu m, ma mata okwu m nile.

37 Ma ugbụ a, lee, e nye m gị, Oliver Cowdery, nakwa nye David Whitmer, na unu ga-achọpụta mmadụ Iri na abụọ ahụ ndị ga-enwe ọchịchọ nile ndị nke m kwuworo.

38 Ma site n’ọchịchọ ha nile ma aọrụ ha nile unu ga-amata ha.

39 Ma mgbe unu chọtara ha unu ga-egosi ihe ndị a nye ha.

40 Ma unu ga-ada n’ala ma akpọọ isi-ala nye Nna n’aha m.

41 Ma unu garịrị ekwusa ozi-ọma nye ụwa nile, na-asị: Unu garịrị echegharị ma mee baptism, n’aha nke Jisus Kraịst;

42 N’ihi na ndị nwoke nile garịrị echegharị ma mee baptism, ma ọbụghị ndị nwoke nanị, kama ndịnyom, na ụmụ-ntakịrị ndị bịaruru n’afọ nile nke ainye nkọwasị.

43 Ma ugbụ a, mgbe unu natachara nke a, unu garịrị edebe aiwu-nsọ m nile na ihe nile;

44 Ma site n’aka unu nile a ga m arụ aọrụ dị ịtụn’anya n’etiti ụmụ nke mmadụ, ruo bn’ịtugharị ọtụtụ site n’ime mmehie ha nile, ka ha nwee-ike bịa na nchegharị, ma ka ha nwee-ike ịbịa ruo n’ala-eze nke Nna m.

45 Ya mere, ngọzi nile nke m na-enye unu akarịrị ihe nile.

46 Ma mgbe unu natachara nke a, ọbụrụ na unu aedebeghị iwu-nsọ m nile a pụghị ịzọpụta unu n’ala-eze nke Nna m.

47 Lee, mu, Jisus Kraịst, Onye-nwe unu na Chineke unu, na Onye-mgbapụta unu, site n’ike Mụọ m ekwuwo ya. Amen.