Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 23


Nkeji 23

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Manchester, New York, Epril 1830, nye Oliver Cowdery; Hyrum Smith; Samuel H. Smith; Joseph Smith, Ụkwụ.; na Joseph Knight, Ụkwụ (History of the Church, 1:80). Dịka ọzịza nye ọchịchọ siri ike n’akụkụ mmadụ ise ndị a akpọrọ aha ịmata ọrụ ha n’otu n’otu, Onye-amụma jụrụ Onye-nwe ma nata mkpụghe nke a.

1–7, Ndị n’eso ụzọ ndị mbụ a ka a kpọrọ ịkwusa ozi-ọma, ịkwalite, na igba Nzukọ-nsọ ume.

1 Lee, a na m ekwuru gị, Oliver, okwu ole na ole. Lee, ị bụ onye a gọziri, ma ị nọghị na amamikpe. Kama kpachara anya maka ampako, maka ka ị ghara ịdaba n’ime bọnwụnwa.

2 Mee ka Nzukọ-nsọ mara ọkpụkpọ nke gị, nakwa n’iru ụwa, ma a ga-emeghe obi gị nye ikwusa ezi-okwu site n’ugbụ a wee ruo mgbe nile. Amen.

3 Lee, a na m agwa gị, Hyrum, okwu ole na ole, n’ihi na ị nọghị kwa n’okpuru amamikpe, ma obi gị ka emeghere, ma atọghepụrụ ire gị; ma ọkpụkpọ gị bụ aịkwalite, na ịgba Nzukọ-nsọ ume esepụghị-aka, Ya mere ọrụ dịrị gị bụ nye nzukọ-nsọ ruo mgbe nile, ma nke a n’ihi ezi na ụlọ gị. Amen.

4 Lee, a na m agwa gị okwu ole na ole, aSamuel; n’ihi gị kwa anọghị n’okpuru amamikpe, ma ọkpụkpọ gị bụ ikwalite na ịgba nzukọ-nsọ ume; ma a ka akpọghị gị ugbu a ikwusa n’iru ụwa. Amen.

5 Lee, a na m ekwu okwu ole na ole nye gị, Joseph; n’ihi gị kwa a nọghị na amamikpe, ma ọkpụkpọ gị bụ kwa ịkwalite, na ịgba Nzukọ-nsọ ume, ma nke a bụ ọrụ dịrị gị site ugbu a na ruo mgbe nile. Amen.

6 Lee, e gosi m gị, Joseph Knight; site n’okwu ndị a na ị haghị ibulite aobe gị, n’ime ya ị garịrị bekpe ekpere cn’olu gị n’iru ụwa na kwa na-nzuzọ, ma n’ezi na ụlọ gị ma n’etiti ndị enyi gị na kwa ebe nile.

7 Ma lee, ọbụ ọrụ dịrị gị a jikọta gị na ezi Nzukọ-nsọ ma tinye okwu gị na igba-ume esepughi-aka ka i nwee ike ị nata ụgwọ-ọrụ nke onye ọrụ. Amen.