Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 60


Nkeji 60

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Ógbè Jackson, Missouri, 8 Ọugọst 1831 (History of the Church, 1:201–202). N’oge nke a ndị-okenye ahụ ndị a họpụtara ịlaghachi ebe Ọwụwa anyanwụ chọrọ ịmata ụzọ ha ga-esi gaa na ụzọ ma n’ụdị ha kwesịrị iji gaa njem.

1–9, Ndị-okenye ga-ekwusa ozi-ọma n’ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ; 10–14, Ha ekwesighị itufu oge ha, ma-ọbụ zoo onyinye chi ha nile; 15–17, Ha nwere ike isa ụkwụ ha dịka ihe ọgbụgba ama megide ndị ahụ ndị jụrụ ịnabata ozi-ọma.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye ndị-okenye nke nzukọ-nsọ ya, ndị ga-alaghachi ọsọ-ọsọ n’ala ahụ ha siri na ya bịa: Lee, ọ masịrị m, na unu abịaruwo ebe a.

2 Mana n’ebe ụfọdụ nọ enweghị m mmasị, n’ihi na ha agaghị emepe aọnụ ha nile, mana ha bna-ezo onyinye-chi nke m nyeworo ha, n’ihi cụjọ nke mmadụ. Ahụhụ ga-adịrị ndị dị otu a n’ihi na iwe m ga-kpalite megide ha.

3 Ma ọ ga-eru, ọbụrụ na ha enweghi ikwesị ntụkwasị obi karịa nye m, a aga-anara ha ya, ọbụna nke ahụ ha nwere.

4 N’ihi na, mụ Onye-nwe, na-achị n’elu-igwe nile n’elu, ma n’etiti andị agha nile nke ụwa; ma n’ụbọchị ahụ mgbe m ga-enwezu bọla-ịchọ mma m nile, mmadụ nile ga-amata ihe ahụ na-ekwupụta ike nke Chineke.

5 Mana, n’ezie, a ga m ekwuru unu gbasara ije unu n’ala ahụ nke unu siri bịa. Ka e nwee otu ụgbọ njem e mere, ma-ọbụ zụta, dịka o si dị unu mma, ọ gbasaghị m, ma gaa njem unu ọsọ-ọsọ ruo ebe nke ahụ a na-akpọ St. Louis.

6 Ma site n’ebe ahụ ka ụmụ odibo m, Sidney Rigdon, Joseph Smith, Nta, na Oliver Cowdery, gaa njem ha ruo Cincinnati;

7 Ma n’ebe a ka ha welite olu ha elu ma kwupụta okwu n’olu na-adasi ike, n’ejighi iwe-ọkụ ma-ọbụ, inwe obi abụọ, na-ewelite aka nile dị nsọ n’elu ha. N’ihi na mụ onwe m zuru oke ime ka unu dị ansọ, ma mmehie nile nke unu ka a bgbagharaworo unu.

8 Ma ka ndị fọdụrụ gaa-njem ha site na St. Louis, abụọ abụọ, ma kwusaa okwu ahụ, ọbụghị n’ịdị ngwa-ngwa, n’etiti ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-omume, ruo mgbe ha ga-alaghachi na nzukọ-nsọ nile ebe ha si bịa.

9 Ma ihe a nile maka ọdị mma nke nzukọ-nsọ nile; n’ihi ebum-n’obi nke a ka m ji zipụ ha.

10 Ma ka nwa odibo m aEdward Partridge nye site n’ego nke m nyeworo ya, otu òkè nye ndị-okenye m ndị e nyere iwu ịlaghachi;

11 Ma ya onye nwere ike, ka ọ weghachi ya site n’aka onye nnọchite-anya; ma ya onye n’enweghi ike, a chọghị ka o weghachi ya.

12 Ma ugbụ a ana m ekwu maka ndị fọdụrụ ndị ga-abịa n’ala nke a.

13 Lee, e zipụwo ha ikwusa ozi-ọma m n’etiti ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ; ya mere, e nye m ha iwu-nsọ, otu a: Unu agaghị aetufu oge unu, ọbụghị ma unu ga-ezo bonyinye-chi unu ka a ghara ịmata ya.

14 Ma mgbe unu bịaruteworo n’ala nke Zaịọn, ma kwupụtasiwo okwu m n’etiti ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ, ọbụghị n’ịdị ngwa-ngwa, ma-ọbụ an’iwe-ọkụ ma-ọbụ n’esem-okwu.

15 Ma tichapụ auzuzu dị n’okpuru ụkwụ unu megide ndị ahụ n’anabataghị unu, ọbụghị n’irụ ha, ka unu ghara ikpasu ha iwe, kama na nzuzo; ma sachaa ụkwụ unu, dịka ọgbụgba àmà megide ha n’ụbọchị ikpe.

16 Lee, nke a ezuworo unu, na ọchịchọ nke ya onye zipụworo unu.

17 Ma site n’ọnụ nwa odibo m Joseph Smith, Nta, a ga-eme ka a mata ihe gbasara Sidney Rigdon na Oliver Cowdery. Ihe ndị fọdụrụ ga-esote ma e mesịa. Ọbụna otu a. Amen.