Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 108


Nkeji 108

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 20 Disemba 1835 (History of the Church, 2:345). A natara nkeji nke a site n’arịrịọ nke Lyman Sherman, onye echiri onye isi nchụ-aja na otu onye iri asaa na mbụ, na onye bịakutere onye-amụma ịrịọ arirịọ maka mkpughe ime ka a mara ọrụ ya.

1–3, Lyman Sherman ka a gbaghaara mmehie ya nile; 4–5, A ga-agu ya n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ndu ndị okenye nke Nzukọ-nsọ; 6–8, A kpọrọ ya ikwusa ozi-ọma na mee ka ụmụnna ya guzosie-ike.

1 N’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru nye gị, nwa odibo m Lyman: A gbagharawo gị mmehie gị nile, n’ihi na ị n̄awo nti n’olu m n’ịbịa ebe a n’ụtụtụ a ị nara ndụmọdụ n’aka onye m họpụtaworo.

2 Ya mere, ka mkpụrụ-obi gị azuo ike gbasara ọnọdụ gị n’ime-mụọ, na enupụkwala isi n’olu m ọzọ.

3 Na bilie elu na kpachara-anya karịa site ugbụ a gawa na imezu nkwa nile ikwere, nke ị meworo ma ga-eme, na a ga-agọzi gị jiri nnukwu ngọzi nile.

4 Chere na ndidi ruo mgbe a ga-akpọ aọgbakọ-ofufe nro nke ụmụ ọdịbọ m nile, mgbe ahụ a ga-echeta gị na ndị okenye mbụ nke m, ma nata oke-gi site na ichi-echichi gị na ndị okenye m ndị ọzọ ndị m họpụtaworo.

5 Lee, nke a bụ ankwa nke Nna nye gị ọ bụrụ na ikwesị-ntụkwasị-obi.

6 Na a ga-emezu ya n’isi gị n’ụbọchị ahụ mgbe ị ga-enwe ike aikwusa ozi-ọma m ebe ọbụla m ga-eziga gị, site ugbua gawa rute mgbe ahụ.

7 Ya mere, mee ka ụmụnna aguzosie ike na mkparita ụka gị nile, na ekpere gị nile, n’igba-ume gị nile, na n’ihe nile nke ị na-eme.

8 Ma lee, ma hụrụ, a nọnyere m gị ị gọzi gị na anapụta gị ruo mgbe nile. Amen.