Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 84


Nkeji 84

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 22 na 23 Septemba 1832 (History of the Church, 1:286–295). N’ọnwa nke Septemba, ndị okenye maliteworo ịlọta site na mgbasa ozi-ọma ha nile na steti ndị dị n’ọwụwa anyanwụ na inye nguzi maka ọrụ ha nile. Ọ bụ mgbe ha nọkọtara ọnụ n’oge nke obi-ụtọ a ka a natara ozi nke a. Onye-amụma kpọrọ ya mkpughe n’ọkwa nchụ-aja.

1–5, Jerusalem Ọhụrụ na temple ka a ga-ewu na Missouri; 6–17, Ahịrị nke ọkwa nchụ-aja site na Moses rue n’Adam ka e nyere; 18–25, Ọkwa nchụ-aja nke dị ukwuu karịa ji ọtụghe-ụzọ nke amamihe nke Chineke; 26–32, Ọkwa nchụ-aja nke nta ji ọtụghe-ụzọ nke nkwusa ozi nke ndị mụọ-ozi nile na ozi-ọma nke njikere; 33–44, Ndị mmadụ ga-enwe ndụ ebighi-ebi site n’ịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja; 45–53, Mụọ nke Kraịst na agba ama nye ndị mmadụ, ma ụwa dum na-atọgbọ na mmehie; 54–61, Ndị-nsọ nile aghaghị ịgba-ama ihe ndị ahụ nile ha nataworo; 62–76, Ha ga-ekwusa ozi-ọma, ma ihe ịrịba-ama ga-eso; 77–91, Ndị okenye ga-apụ n’ejighi akpa ego ma-ọbụ akpa-njem, ma Onye-nwe ga-elekọta mkpa ha nile; 92–97, Ajọọ ahụhụ nile na ọbụbụ ọnụ nile na-eche ndị nile na-anabataghị ozi-ọma ahụ; 98–102, Abụ ọhụrụ nke mgbapụta nke Zaịọn ka e nyere; 103–110, Ka onye ọbụla guzoro n’ọkwa-ọrụ nke ya ma rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ-oku nke ya; 111–120, Ndị odibo nke Onye-nwe ga-ama ọkwa ihe-arụ nke ịtọgboro n’efu nke ụbọchị ikpe azụ nile.

1 Mkpughe nke Jisus Kraịst nye nwa odibo ya Joseph Smith, Nta, na ndị okenye isii, dịka ha jịkọrọ obi ha nile n’otu ma awelie olu ha nile n’elu.

2 E, okwu nke Onye-nwe gbasara nzukọ-nsọ ya, e hiwere n’ụbọchị ndị ikpe-azụ maka amwetaghachi nke ndị ya, dịka o kwuworo site n’ọnụ nke bndị-amụma ya, ma, n’ihi mkpọkọta nke cndị-nsọ ya iguzo n’elu dUgwụ Zaịọn, nke ga-abụ obodo-ukwu nke Jerusalem eỌhụrụ.

3 Nke bụ obodo-ukwu nke aga-ewu, malite n’ebe atemple ahụ, nke a họpụtara site na mkpisi-aka nke Onye-nwe, n’oke-ala nke ọdịda anyanwụ na Steti nke Missouri, ma doo nsọ site n’aka Joseph Smith, Nta, na ndị ọzọ ndị ihe ha dịịrị Onye-nwe ezi mma.

4 N’ezie nke a bụ okwu nke Onye-nwe, na obodo-ukwu Jerusalem aỌhụrụ ka a ga-ewu site na mgbakọta nke ndị-nsọ, malite n’ebe a, ọbụna ebe nke btemple ahụ, temple nke a ga-ewuli n’ọgbọ nke a.

5 N’ihi n’ezie ọgbọ nke a agaghị agabiga ruo mgbe a ga-ewu otu ụlọ nye Onye-nwe, ma otu igwe ojii ga-anọ n’elu ya, igwe ojii nke ga-abụ ọbụna aebube nke Onye-nwe, nke ga-ejupụta n’ime ụlọ ahụ.

6 Ma ụmụ nwoke nile nke Moses, dịka Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ nke ọ natara n’okpuru aaka nke ọgọ ya nwoke, bJetro;

7 Ma Jetro natara ya site n’okpuru aka nke Keleb;

8 Ma Keleb natara ya n’okpuru aka nke Elaihu;

9 Ma Elaihu n’okpuru aka nke Jeremy;

10 Ma Jeremy n’okpuru aka nke Gad;

11 Ma Gad n’okpuru aka nke Esaịas;

12 Ma Esaịas natara ya n’okpuru aka nke Chineke.

13 Esaịas kwa biiri n’ụbọchị nile nke Abraham, ma buru onye a goziri site na ya—

14 Bụ aAbraham nke natara ọkwa nchụ-aja ahụ site n’aka bMelkizedek, onye natara ya site n’usoro ọmụmụ nke ndị nna ha, ọbụna ruo na cNoa;

15 Ma site na Noa ruo aInọk, site na usoro ọmụmụ nke ndị nna ha;

16 Ma site na Inọk ruo na aEbel, onye egburu site bn’izuzu mmegide nke nwanne ya nwoke, onye cnatara ọkwa nchụ-aja site n’iwu-nsọ nke Chineke, site n’aka nke nna ya dAdam, onye bụ nwoke nke mbụ—

17 Bụ aọkwa nchụ-aja nke na-agakwa n’iru n’ime nzukọ-nsọ nke Chineke n’ọgbọ nile, ma n’enweghi mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ngwụcha nke afọ nile.

18 Ma Onye-nwe nye kwara aErọn na mkpụrụ-afọ nke ya otu bọkwa nchụ-aja, rute n’ọgbọ agbụrụ ha nile, ọkwa nchụ-aja nke na-agakwa n’iru ma cna-adịgide ruo mgbe nile ya na ọkwa nchụ-aja nke bụ nke kachasị nsọ n’usoro nke Chineke.

19 Ma ọkwa nchụ-aja nke dị ukwuu karịa nke a na-elekọta ozi-ọma ahụ ma jiri ọtụghe-ụzọ nke aihe omimi nile nke ala-eze, ọbụna ọtụghe-ụzọ nke bmmata nke Chineke.

20 Ya mere, an’emume-nsọ nile si na ya, ike ahụ nke ndụ iyi Chineke na-apụta ìhè.

21 Na n’enweghi emume-nsọ nile si na ya, na aikike ahụ nke ọkwa nchụ-aja, ike ahụ nke ndụ-iyi-Chineke agaghị apụta ìhè nye mmadụ n’anụ arụ;

22 N’ihi n’enweghi nke a o nweghị aonye pụrụ ịhụ iru nke Chineke, ọbụna Nna, ma dị ndụ.

23 Ugbụ a nke a ka aMoses kụziri n’ụzọ dị mfe nghọta nye ụmụ nke Israel n’ime ọzara, ma jiri ịrụsi ọrụ ike chọọ bido ndị nke ya nsọ ka ha wee nwee ike cilekwasị iru nke Chineke;

24 Mana ha amesịrị obi ha nile ike ma ha enweghi ike ịnagide nnọnyere ya; ya mere, Onye-nwe bn’iwe ọku ya, n’ihi na iwe ya dị ọkụ megide ha, n̄ụrụ iyi na ha agaghị caba n’izu-ike ya ka ha nọ n’ime ọzara, izu-ike nke bụ uju nke ebube ya.

25 Ya mere, o wepụrụ aMoses site n’etiti ha, na kwa bỌkwa Nchụ-aja ahụ Dị Nsọ;

26 Ma aọkwa nchụ-aja nke nta nọgidere, bụ ọkwa nchụ-aja nke ji bọtụghe-ụzọ nke cnkwusa-ozi nke ndị mụọ-ozi na ozi-ọma nke njikere;

27 Ozi-ọma nke bụ ozi-ọma nke anchegharị na nke bbaptism, na cnsachapụ nke mmehie nile, na diwu nke iwu-nsọ nile banyere eanụ arụ, nke Onye-nwe n’oke iwe ya mere ka ọ nọgide n’ụlọ nke Erọn n’etiti ụmụ nke Israel ruo mgbe fJọn, onye Chineke kulitere, ebe o gjupụtara na Mụọ Nsọ site n’afọ nne ya.

28 N’ihi na e mere ya baptism mgbe ọ dịrịị na nwata, ma e chiri ya echichi site n’aka mụọ-ozi nke Chineke n’oge ọ dị abalị asatọ nye n’ike nke a, ichutu ala-eze nke ndị Juu, na ime ka ụzọ nke Onye-nwe aguzozie n’iru nke ndị ya, ijikere ha maka ọbịbịa nke Onye-nwe, onye e nyefere bike nile n’ọba aka ya.

29 Ma ọzọ, ọkwa-ọrụ nile nke onye-okenye, na ụkọchukwu bụ amgbakwụnye ndị dị mkpa nye ọkwa nchụ-aja nke dị elu.

30 Ma ọzọ, ọkwa-ọrụ nile nke onye-nkuzi na onye-dikọn bụ mgbakwụnye ndị dị mkpa nke ọkwa nchụ-aja dị nta, bụ ọkwa nchụ-aja nke e nyekwasịrị n’isi Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.

31 Ya mere, dịka m kwuru gbasara ụmụ nwoke nke Moses—n’ihi ụmụ nwoke nke Moses na kwa ụmụ nwoke nke Erọn ga-enye aonyinye kwesịrị nnabata ma chụọ aja n’ụlọ nke Onye-nwe, bụ ụlọ nke a ga-ewu nye Onye-nwe n’ọgbọ nke a, n’elu bala nsọ dịka m họpụtaworo—

32 Ma ụmụ nwoke nke Moses na nke Erọn ga-ejupụta an’ebube nke Onye-nwe, n’elu bUgwụ nke Zaịọn n’ime ụlọ nke Onye-nwe, Onye unu bụ ụmụ ya; na kwa ọtụtụ ndị m kpọworo ma zipụ ị ga wulite cnzukọ-nsọ m.

33 N’ihi na ndị ọbụla nke akwesịrị ntụkwasị obi ruo n’inweta bọkwa nchụ-aja abụọ ndị a nke m kwuworo maka ha, ma n’ibulite ọkpụkpọ-oku ha, ka e cdoro nsọ site na Mụọ ahụ ruo na mgbanwe nke arụ ha nile.

34 Ha na-abuzị ụmụ ndịkom nke Moses na nke Erọn na amkpụrụ-afọ nke bAbraham, na nzukọ-nsọ ahụ na ala-eze, na ndị a chọpụtara iche nke Chineke.

35 Na kwa ndị nile ndị nabatara ọkwa nchụ-aja nke a nabatara m, ka Onye-nwe kwuru;

36 N’ihi na onye ahụ nke nabatara ụmụ ọdibo m anabatara m;

37 Ma onye ahụ nke anabatara m nabatara Nna m;

38 Ma onye ahụ nke nabatara Nna m nabatara ala-eze Nna m; ya mere aihe nile Nna m nwere ka a ga-enye ya.

39 Ma nke a bụ dịka aịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja ahụ siri dị.

40 Ya mere, ndị ahụ nile ndị nabatara ọkwa nchụ-aja ahụ, nabatara ịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke Nna m, nke o nweghị ike imebi, ọbụghị ma e nwere ike imegharị ya.

41 Mana onye ọbụla nke amebiri ọgbụgba-ndụ nke a mgbe ọ nabatasịrị ya, ma mesịa tụgharịa site na ya, bagaghị enwe mgbaghara nke mmehie nile n’ụwa nke a ma-ọbụ n’ụwa nke na-abịa.

42 Ma ahụhụ ga-adịrị ha nile ndị n’anataghị ọkwa nchụ-aja nke a nke unu nataworo, nke m na-enyekwasị ugbụ a n’isi unu ndị nọ ebe a taa, site n’olu nke m sitere n’elu-igwe nile; ma ọbụna mụ enyewo usuu nile nke elu-igwe na andị mụọ-ozi m nile iwu gbasara unu.

43 Ma ugbụ a enye m unu iwu-nsọ ka unu kpachara-anya gbasara onwe unu, inye ezi aịn̄a ntị n’okwu nile nke ndụ ebighi-ebi.

44 N’ihi na unu aga-adị ndụ site n’okwu ọbụla nke sitere n’ọnụ nke Chineke pụta.

45 N’ihi na aokwu nke Onye-nwe bụ ezi-okwu, na ihe ọbụla bụ bezi-okwu bụ ìhè ma ihe ọbula bụ ìhè bụ Mụọ, ọbụna Mụọ ahụ nke Jisus Kraịst.

46 Ma Mụọ ahụ na-enye aìhè nye bmmadụ ọbụla nke na-abịa n’ime ụwa; ma Mụọ ahụ na-agba ama nye mmadụ ọbụla rute ụwa nile, nke n̄ara ntị n’olu nke Mụọ ahụ.

47 Ma onye ọbụla nke n̄ara ntị n’olu nke Mụọ ahụ na-abịakwute Chineke, ọbụna Nna ahụ.

48 Ma Nna ahụ ana-akụziri ya maka bọgbụgba-ndụ ahụ nke o megharịworo ma mesie ike n’elu isi unu, nke e mesịrị ike n’elu isi unu maka onwe unu, ma ọ bụghị maka onwe unu nanị, mana maka n’ihi ụwa dum.

49 Ma aụwa dum tọgbọrọ na mmehie, ma na-asụ ude n’okpuru bọchịchịrị ma n’okpuru ịbụ oru nke mmehie.

50 Ma site na nke a unu ga-amata na ha nọ n’okpuru aịbụ-oru nke bmmehie, n’ihi na ha anaghị abịakwute m.

51 N’ihi na onye ọbụla n’anaghị abịakwute m nọ n’okpuru ịbụ-oru nke mmehie.

52 Ma onye ọbụla n’anabataghị olu m, a maghị aolu m, ma ọ bụghị kwa nke m.

53 Ma site na nke a unu ga-amata ndị ezi-omume site na ndị ajọọ-mmadụ, ma na, aụwa nile bna-asụ-ude n’okpuru cmmehie na ọchịchịrị ọbụna ugbụ a.

54 Ma uche unu nile n’oge gara-aga abụwo ihe gbara-ọchịchịrị site an’ekweghị ekwe, ma n’ihi na unu e werewo ka ihe dị mfe ihe nile nke unu nataworo—

55 Bụ aihe-efu na ekweghị ekwe nke wetaworo nzukọ-nsọ dum n’okpuru amamikpe.

56 Ma amamikpe nke a nọ n’isi ụmụ nke Zaịọn, ọbụna ha nile.

57 Ma ha ga-anọgide n’ọkpụrụ amamikpe nke a ruo mgbe ha ga-echegharị ma cheta aọgbụgba-ndụ ọhụrụ, ọbụna bAkwụkwọ nke Mọmọn na iwu nsọ nile cndị ochie nke m nyeworo ha, ọbụghị nani ikwu ya, mana dime ya dịka nke ahụ nke m deworo—

58 Ka ha wee nwee ike mịpụta ezi mkpụrụ kwesịrị ala-eze nke Nna ha; ma ọbụghị otu a ọ ka fọdụrụ ihe-otiti na ikpe nke a ga-awụkwasị n’isi ụmụ nke Zaịọn.

59 N’ihi ụmụ nke ala-eze ahụ ha ga-enwe ike ịmerụ ala nsọ nke m? N’ezie, a sị m unu, E e.

60 N’ezie, n’ezie, a sị m unu ndị na-anụ aokwu m nile ugbụ a, ndị nke bụ olu m, ngozi na-adịrị unu ma ọbụrụraa na unu na-anabata ihe ndị a nile;

61 N’ihi na a ga m aagbaghara unu mmehie nile jiri iwu-nsọ nke a—na unu ga-anọgide sie-ike n’echiche unu nile bn’idi-nwayọ na mụọ nke ekpere, n’ịgba ama nye ụwa nile maka ihe ndị ahụ nke m nyeworo unu.

62 Ya mere, agaa nụ n’ime ụwa nile; ma ebe ọbụla unu n’agahị agalite, unu ga-eziga, ka ama ahụ nwe ike ịga site n’unu rute ụwa nile rute ihe nile ekere-eke.

63 Ma dịka m kwuru nye ndị-ozi m, ọbụna otu a ka m na-ekwu nye unu, n’ihi na unu bụ andị ozi m, ọbụna ndị-isi-nchụ-aja nke Chineke, unu bụ ndị ahụ ndị Nna m bnyeworo m; unu bụ cndị enyi m;

64 Ya mere, dịka m kwuru nye ndị-ozi m, a na m ekwu nye unu ọzọ, na amkpụrụ obi ọbụla nke bkwenyere n’okwu unu nile, ma eme ya baptism site na mmiri maka cnsachapụ nke mmehie nile, ga-anata dMụọ Nsọ ahụ.

65 Ma aihe ịrịba-ama ndị a ga-eso ndị kwere ekwe—

66 N’aha m ha ga-arụ ọtụtụ aọrụ nile dị ebube;

67 aN’aha m ha ga-achụpụ ajọọ mụọ nile;

68 N’aha m ha aga-agwọ kwa ndị ọrịa;

69 N’aha m ha ga-emeghee anya nile nke ndị kpuru isi, ma meghee kwa ntị nile nke ndị ntị chiri;

70 Ma ire nke onye ogbu ga-ekwu okwu;

71 Ma ọ bụrụ na onye ọbụla enye ha ansi ọ gaghị emerụ ha arụ;

72 Ma nsi nke agwọ agaghị enwe ike imerụ ha arụ.

73 Mana iwu-nsọ ka m na-enye ha, ka ha ghara aịnyara onwe ha isi maka ihe ndị a, ọbụghị ma-ọbụ ikwụpụta ha n’iru ụwa; n’ihi na ihe ndị a ka e nyere unu maka uru unu na maka nzọpụta.

74 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, ndị ahụ ndị n’ekweghị n’okwu unu nile, ma n’emeghị abaptism na mmiri n’aha m maka nsachapụ nke mmehie ha nile, ka ha wee nwee ike ịnata Mụọ Nsọ, ka a bga-ama ịkpe, ma ha agaghị abịa n’ime ala-eze nke Nna m ebe mụ na Nna m nọ.

75 Ma mkpughe nke a nye unu, na iwu-nsọ, dị ire site n’awa nke a n’elu ụwa nile, ma ozi-ọma ahụ bụ maka mmadụ nile ndị n’anatabeghi ya.

76 Mana, n’ezie, a sị m ndị nile ahụ ndị e nyeworo ala-eze—site n’unu ka aghaghị ikwusa ya nye ha, na ha ga-echegharị site n’ajọọ-omume ha nile mgbe gara-aga; n’ihi a ga-ata ha ụta maka ajọọ obi ha nile nke ekweghị ekwe, ma ụmụ nne unu nọ na Zaịọn maka nnupụ-isi ha megide unu n’oge ahụ m zipụrụ unu.

77 Ma ọzọ a sị m unu, ndị enyi m, n’ihi na site ugbua gaa n’iru a ga m na-akpọ unu ndị enyi, ọ dị mkpa na m ga-enye unu iwu-nsọ nke a, na unu ga-abuzi ọbụna dịka ndị enyi m n’ụbọchị nile mgbe m nọnyere ha na-aga njem ikwusa ozi-ọma n’ike m;

78 N’ihi na e gbochiri m ha iji aakpa ego ma-ọbụ akpa njem ọbụghị ma-ọbụ iji uwe mkpuchi abụọ.

79 Lee, e zipụrụ unu igosi ezi-okwu nye ndị ụwa, ma onye-ọrụ kwesịrị aụgwọ-ọrụ ya.

80 Ma mmadụ ọbụla nke ga-aga ma akwusaa bozi-ọma nke ala-eze, ma dapụghị n’ịga-n’iru n’ịkwesị-ntụkwasị-obi n’ihe nile, a gaghị ada mba n’uche, ọbụghị ma-ọbụ gbaa ọchịchịrị, ọbụghị ma-ọbụ n’arụ, ụkwụ, ma-ọbụ njikọ; ma otu cagịrị-isi ya a gaghị ada n’ala na ahụghị ya; ma ha a gaghị anọ agụụ, ọbụghị ma-ọbụ akpiri ịkpọnkụ.

81 Ya mere, aechegbula onwe unu maka echi, maka ihe unu ga-eri, ma-ọbụ ihe unu ga-an̄ụ, ma-ọbụ ihe unu ga-eji ekpuchi arụ.

82 N’ihi, tulee okoko osisi lili nile nke ubi, otu ha si na-eto, ha anaghị arụ ọrụ, ọbụghị ma ha na-ekwe akwa; ma ala-eze nile nke ụwa, n’ebube ha nile, achọghị ha mma dịka otu n’ime ndị a.

83 N’ihi na aNna unu, nke bi n’elu-igwe, bmaara na unu nwere mkpa nke ihe ndịa a nile.

84 Ya mere, ka echi acheere onwe ya echiche maka ihe nke onwe ya.

85 Ọbụghị ma-ọbụ unu iche echiche tutu oge ahụ aihe unu ga-ekwu; mana bkpakodo n’echiche unu nile mgbe nile okwu nile nke ndụ, ma a cga-enye unu ya n’awa ahụ akụkụ ahụ nke a ga-enyefe mmadụ nile.

86 Ya mere, ka a ghara inwe onye ọbụla n’etiti unu, n’ihi na iwu-nsọ nke a bụ nye ndị nile akwesịrị ntụkwasị-obi ndị Chineke kpọrọ n’ime nzukọ-nsọ nye mgbasa ozi ahụ, sịte n’awa nke a, were akpa ego ma-ọbụ akpa-njem, ndị na-apụ ị ga maa ọkwa ozi-ọma nke a nke ala-eze.

87 Lee, e azipụrụ m unu ịkatọ ndị ụwa maka ajọọ-omume ha nile, ma kuziere ha maka ikpe nke ga-abịa.

88 Ma onye ahụ nke anabatara unu, ebe ahụ ka m ga-anọ kwa, n’ihi na a ga m aga n’iru gị. A ga m a nọ n’aka nri gị ma n’aka ekpe gị, ma Mụọ nke m ga-anọ n’obi unu nile, ma bndị mụọ-ozi m ga-anọ gburu-gburu unu ịkwalite unu.

89 Onye ọbụla nabatara unu nabatara m; ma otu onye ahụ ga-enye unu nri, na nye unu uwe, ma nye unu ego.

90 Ma onye ahụ nke ga-enye unu nri, ma-ọbụ nye unu uwe, ma-ọbụ nye unu ego, enweghi otu ọ ga-esi aetufu ụgwọ-ọrụ ya.

91 Ma onye ahụ nke n’emeghị ihe ndị a nile abụghị onye na-eso ụzọ m; site na nke a unu ga-amata andị na-esọ ụzọ m.

92 Onye n’anabataghị unu, pụọ nụ site n’ebe ọ nọ n’onwe unu, ma asachaa ụkwụ unu ọbụna jiri mmiri, ezigbo mmiri, ma-ọbụ n’okpọm ọkụ ma-ọbụ n’oyi, ma gbaa-ama maka ya nye Nna unu nke bi n’elu-igwe, ma alọghachikwala azụ ọzọ bịakwute onye ahụ.

93 Ma n’ime ọnụmara ọbụla ma-ọbụ ọbodọ-ukwu ọbụla unu bara, unu mee otu a.

94 Otu o sila dị; unu chọsie ike ma unu ahapụkwala nke ọbụla; ma ahụhụ ga-adịrị ụlọ ahụ ma-ọbụ ọnụmara ahụ ma-ọbụ obodo-ukwu nke jụrụ ịnabata unu, ma-ọbụ okwu unu nile, ma-ọbụ ịgba-ama unu banyere mụ.

95 Ahụhụ, ka m na-ekwu ọzọ, ga-adịrị ụlọ ahụ, ma-ọbụ ọnụmara ahụ ma-ọbụ obodo-ukwu nke jụrụ ịnabata unu, ma-ọbụ okwu unu nile, ma-ọbụ ịgba-ama unu banyere mụ.

96 N’ihi na mụ, aOnye Pụrụ Ime Ihe nile, e bịkwasịwo aka m abụọ n’elu mba nile, ị ti ha bihe-otiti maka cajọọ-omume ha.

97 Ma ajọọ ahụhụ nile ga-agbasa, ma a gaghị ewepụ ha site n’ụwa ruo mgbe m rụsịworo ọrụ nke m, nke a ga-egbu amkpụ mkpụ n’ezi-omume—

98 Ruo mgbe mmadụ nile ga amata m, ndị nọgidere, ọbụna site na nke kachasị nta rute na nke kachasị ukwuu, ma ga-ejupụta na mmata nke Onye-nwe, ma aga-ahụ anya na anya, ma ga-eweli olu ha elu, ma jikọkwa olu ha bbụọ abụ ọhụrụ nke a na-asị:

99 Onye-nwe a kpọtawo Zaịọn ọzọ;Onye-nwe aagbapụtawo ndị ya bIsrael,Dịka cnhọpụta nke damara siri dị,Nke e nwetara na mmezu site n’okwukweNa eỌgbụgba-ndụ nke ndị nna ha.

100 Onye-nwe a gbapụtawo ndị ya;Ma Setan ka e akeworo agbụ ma oge adịkwaghị,Onye-nwe achịkọtawọ ihe nile bn’otu.Onye-nwe e zidatawo cZaịọn site n’elu.Onye-nwe dakpọlitawo Zaịọn site n’okpuru.

101 aỤwa ahụsiwo anya n’ọrụ ma mipụta ike nile nke ya;Ma ezi-okwu ka ehiweworo n’afọ ya nile;Ma elu-igwe nile egosiwo ya iru ọchị.Ma e yinyewo ya uwe nke bebube nke Chineke ya;N’ihi na ọ na-eguzo n’etiti ndị nke ya.

102 Otuto, na nnukwu ugwu, ma ike, na ume,Bụrụ ihe e nyere Chineke anyị; n’ihi na ọ jupụtara an’ebere,Ikpe ziri ezi, amara na ezi-okwu na budo,Ruo mgbe nile na mgbe nile, Amen.

103 Ma ọzọ, n’ezie, ezie, a sị m unu, ọ dị mkpa na onye ọbụla nke pụrụ ikwusa ozi-ọma mgbe nile na-adigide m, na ọbụrụraa na ha nwere ezi na ụlọ nile, ma, nata ego site n’onyinye, na ha ga-eziga ya nye ha, ma-ọbụ were ya mee ihe maka uru ha, dịka Onye-nwe ga-eduzi ha, n’ihi na otu a ka ọ dị m nnọọ mma.

104 Ma ka ndị nile n’enweghi ezi na ụlọ, ndị na-anata aego, zigara ya onye ụkọchukwu na Zaịọn, ma-ọbụ nye ụkọchukwu na Ohio, ka e wee nwee ike nyefee ya maka iweputa mkpughe nile na ibipụta ya, na kwa ihiwe Zaịọn.

105 Ma ọbụrụ na onye ọbụla ga-enye onye ọbụla n’ime unu uwe mkpuchi ime, ma-ọbụ uwe ntizu, were ndị ochie ma nye andị ogbenye, ma gaa n’ụzọ gị n’an̄ụrị.

106 Ma ọbụrụ na onye ọbụla n’etiti unu esie ike na Mụọ, ka ọ akpọrọ onye ahụ nke n’adịghị ike, ka o wee nwee ike inweta mbuli muọ bn’ịdị nwayọ nile, ka ọ wee nwe ike ịdị kwa ike.

107 Ya mere, unu kpọrọ ndị ahụ ndị e chiri echichi n’ọkwa nchụ-aja anke nta, ma zịpụ ha n’iru unu ị ga mee eyiri-eyi nile, na ịkwado ụzọ, na ije nzukọ e yiri eyi nke unu onwe unu agaghị enwe ike ejezu.

108 Lee, nke a bụ ụzọ nke ndị-ozi m nile, n’ụbọchị nile mgbe ochie, jiri wulite nzukọ-nsọ m nye m.

109 Ya mere, ka onye ọbụla guzoro n’ọkwa-ọrụ nke ya, ma rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ-oku nke ya; ma ka isi ghara ịgwa ụkwụ nile na ya enweghi mkpa nke ụkwụ; n’ihi na ma ụkwụ adịghị olee otu arụ ga-eji guzo?

110 Arụ kwa chọrọ aakụkụ ọbụla, ka ha nile wee kwalite ibe ha n’ọtụ, ka usoro unu nwee ike ịnọ n’ozuzu oke.

111 Ma lee, andị-isi-nchụ-aja ga-aga njem, na kwa ndị-okenye, na kwa bndị nchụ-aja dị nta; mana cndị dikọn na dndị nkuzi ka a ga-ahọpụta eilekọta nzukọ-nsọ anya, ị bụrụ ndị mgbasa ozi ga-eguzogide nye nzukọ-nsọ.

112 Ma ụkọchukwu, Newel K. Whitney, kwesị kwara ịga-njem gburu gburu ma n’etiti nzukọ-nsọ nile, na-achọpụta ndị ogbenye ailekọta mkpa ha nile site n’ime ka ndị ọgaranya na kwa ndị mpako dị bumeala.

113 O ga-ewekwa onye annọchi-anya ga-elekọta ma na-arụ ọrụ ya nke anụ arụ dịka o siri tụzie ntụzi aka.

114 Otu osila dị, ka ụkọchukwu gaa n’ime obodo-ukwu New York, na kwa n’obodo ukwu Albany, na kwa n’obodo-ukwu Boston, ma dọọ ndị obodo ukwu ndị ahụ aka na ntị jiri ụda nke ozi-ọma, jiri olu na-adasi ike, maka ambibi na mkpochapụ kpam kpam nke na-eche ha ma ọbụrụ na ha ajụ ịnabata ihe ndị a nile.

115 N’ihi na ọbụrụ na ha ajụ ịnabata ihe ndị a nile oge awa nke ikpe ha dị nso, ma ụlọ ha ka a ga-ahapụrụ ha na ambibi.

116 Ka ọ atụkwasị obi na m ma ọ gaghị enwe bmgbagwoju anya; ma cagịrị nke isi ya ọbụla a gaghị ada n’ala n’ahụghị ya.

117 Ma n’ezie a sị m unu, ndị odibo m ndị fọdụrụ, unu ga-apụ dịka ọnọdụ unu nile ga-esi kwere n’ime ọkpụkpọ-oku unu di iche iche, rute na nnukwu obodo ukwu nile na ọnụmara nile amara aha ha, na-akatọ ndị ụwa n’ezi-omume maka ajọọ-omume ha na omume-amaghị Chineke ha nile, na akọwa n’ụzọ doro anya ma kwe nghọta ịtọgbọrọ n’efu—nke ihe-arụ n’ụbọchị ndị ikpe-azụ.

118 N’ihi na jiri unu ka Onye-nwe Pụrụ Ime Ihe nile kwuru, a ga m aebibi ala-eze ha nile; a gaghị m bakwagharị ụwa nanị, mana elu-igwe nile jupụtara na kpakpando ga-ama jijiji.

119 N’ihi na mụ, Onye-nwe, esetịpụwo aka m itinye n’ezigbo ọrụ ike nile nke elu-igwe; unu enweghi ike ịhụ ya ugbụ a, mana nwa-ntịị oge ma unu ga-ahụ ya, ma mata na m nọ, ma na m aga-abịa ma bchịa mụ na ndị nke m.

120 A bụ m aAlfa na Omega, mmalite ahụ na ọgwụgwụ ahụ. Amen.