Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 96


Nkeji 96

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na-egosi usoro nke nnukwu obodo ma-ọbụ stek nke Zaịọn dị na Kirtland, Ọhịọ, 4 Jun 1833, dịka ihe atụ nye Ndị-nsọ nọ na Kirtland (History of the Church, 1:352–353). Oge a bụụrụ n’ọgbakọ nke ndị-isi-nchụ-aja, ma ihe kachasị mkpa a na-elebara anya bụ okike nke ụfọdụ ala, nke ihe eji mara ya bụ ubi nke French, nke ndị Nzukọ-nsọ nwetara nsonso Kirtland. Ebe ọgbakọ ahụ enweghi ike inwe nkwekọrịta maka onye ga-elekọta ubi ahụ anya, mmadụ nile kwekọtara ịjụ Onye-nwe gbasara okwu ahụ.

1, Stek Kirtland ahụ nke Zaịọn ga-abụ ihe a ga-eme ka o sie ike; 2–5, Ụkọchụkwụ ga-ekewasị ihe-nketa nile maka Ndị-nsọ; 6–9, John Johnson ga-abụ onye-otu nke ndị jikọrọ onwe ha n’usoro.

1 Lee, a sị m unu, nke a bụ amamihe, nke unu ga-eji mata ihe unu ga-eme gbasara okwu nke a, n’ihi na ọ dị m mkpa na astek nke a nke m hiweworo maka ume nke Zaịọn kwesịrị ka eme ka ọ sie-ike.

2 Ya mere, ka nwa odibo m Newel K. Whitney lekọta ebe a nke unu kpọworo aha n’etiti unu, nke m chọrọ iwụkwasị ụlọ-nsọ nke m.

3 Ma ọzọ, ka e kewasịa ya na mpaghara na mpaghara, dịka amamihe siri dị, maka nrite-uru nke ndị na-achọ ihe-nketa nile, dịka a ga-esi kpebie ya na nnọkọ n’etiti unu.

4 Ya mere, kpachara anya na unu lebara okwu a anya, ma akụkụ ahụ nke kwesịrị irite uru nye ausoro nke m, maka ebu m n’obi nke iwepụta okwu m nye ụmụ nke mmadụ.

5 N’ihi na lee, n’ezie a sị m unu, nke a bụ nke kachasị mkpa nye m, ka okwu nke m gaa n’iru rute ụmụ nke mmadụ, n’ihi ebu m n’obi nke imedata obi nile nke ụmụ nke mmadụ maka ọdị mma nke unu. Ọbụna otu a. Amen.

6 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọ bụ amamihe na ihe dị mkpa n’ime m, ka nwa odibo m John Johnson onye m nabataworo onyinye ya, na onye m nụworo ekpere ya, onye m nkweworo nkwa nke ndụ ebighi-ebi ma ọbụrụraa na ọ ga-edebe iwu-nsọ m nile site ugbụ a gaa n’iru—

7 N’ihi na ọ bụ onye agbụrụ nke aJosef na onye-nketa oke nke ngozi nile nke nkwa ahụ e kwere ndị nna ya—

8 N’ezie a sị m unu, ọ dị mkpa n’ime m ka ọ bụrụ onye-otu nke usoro ahụ, ka o wee nwee ike inye-aka n’iwepụta okwu m nye ụmụ nke mmadụ.

9 Ya mere unu ga-echi ya echichi baa na ngọzi nke a, ma ọ ga-achọ site n’ịrụsi-ọrụ ike iwepu ụgwọ nile nke dị n’ụlọ ahụ nke a kpọworo aha n’etiti unu, ka o wee biri n’ebe ahụ. Ọbụna otu a. Amen.