Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 5


Nkeji 5

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Harmony, Pennsylvania, Maach 1829, site n’arịrịọ nke Martin Harris (History of the Church, 1:28–31).

1–10, Ọgbọ nke a ga-anata okwu nke Onye-nwe site n’aka Joseph Smith; 11–18, Ndị-aka-ebe atọ ga-agba-ama maka Akwụkwọ nke Mọmọn; 19–20, Okwu nke Onye-nwe ka aga-enyocha dịka na mgbe ochịe; 21–35, Martin Harris nwere ike ịchegharị ma bụrụkwa otu n’ime ndị-aka-ebe.

1 Lee, a sị m gị, na dịka nwa odibo m aMartin Harris achọwo ihe aka-ebe n’aka m, na gị, nwa odibo m Joseph Smith, Nta, enwetawo bepekele nile ndị ahụ nke ị gbara-ama ma nwekwa ihe ndekọta na ị nwetawo site n’aka m;

2 Ma ugbua, lee, nke a ka ị ga-asị ya—ya onye nke kwuwooro gị okwu, sịrị gị: Mụ, Onye-nwe, abụ m Chineke, ma e nyewo m gị ihe ndị a, nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ma nyekwa gị iwu na ị ga-eguzoro dịka aonye-aka-ebe nke ihe ndị a;

3 Ma e mewo m gị ka ị baa n’ime ọgbụgba-ndụ mụ na gị, ka ị hapụ ịgosi ha ewezuga nye andị ahụ m nyere gị n’iwu; ma ị nweghị bike n’ebe ha nọ ewezuga na mụ nyere gị ya.

4 Ma ị nwere onyinye iji tụgharịa-asụsụ dị na epekele nile ahụ; ma nke a bụ onyinye nke mbụ m nyekwasịrị gị; ma e nyewo m iwu na ị gaghị eme ka asị na ị nwere onyinye ọzọ tutu ruo mgbe ebum-n’obi m ga-emezu na nke a, n’ihi na agaghị m enye gị onyinye ọzọ tutu ruo mgbe ọ ga-agwụ.

5 N’ezie, a sị m gị, na ahụhụ ga-abịakwute ndị bi n’ụwa ma ọbụrụ na ha aagaghị-ege ntị nye okwu m nile;

6 N’ihi na emesịa a aga-echi gị echichi ma ị ga-agapụ ma gbasaakwa bokwu m nile nye ụmụ nke mmadụ.

7 Lee, ọbụrụ na ha agaghị aekwenye n’okwu m nile, ha agaghị ekwere gị, nwa odibo m Joseph, a sị na ọ ga-ekwe mee na ị ga-egosi ha ihe nile ndị a ndị nke m nyeworo gị.

8 O, ọgbọ nkea ana-ekweghị-ekwe na bna-akpọ-ekwe-nkụ—iwe m dị ọkụ megide ha.

9 Lee, n’ezie a sị m gị, aejichiwo m ihe ndị ahụ bụ ndị m nyeworo gị, nwa odibo m Joseph, maka ebum-n’obi ziri-ezi n’ime m, ma a ga-eme ka ọ pụta ìhè nye ọgbọ nile na-abịa;

10 Mana ọgbọ nke a ga-enweta okwu m site na gị;

11 Ma na mgbakwụnye ọgbụgba-ama nke gị, aọgbụgba-ama nke ndị odibo m atọ, ndị m ga-akpọ ma chiekwa echichi, bụ ndị m ga-egosi ihe ndị a nile, ma ha ga-agapụ jiri okwu m nile nke e nyere site na gị.

12 E, ha ga-amakwa n’ezie na ihe ndị a bụ ezi-okwu, n’ihi na site n’elu-igwe ka m ga ekwụpụta ya nye ha.

13 A ga m enye ha ike ka ha wee nwee ike ịhụ ma nyochaa ihe ndị a dịka ha dị;

14 Ma aonweghị onye-ọzọ m ga-enye ike nke a, ị nata otu-ụdị ọgbụgba-ama a n’etiti ọgbọ nke a, n’ime nke mmalite nke a nke mpalite na mpụta-ìhè nke bnzukọ-nsọ m site n’ime ọzara—na-enwu dịka cọnwa, nke mara nma dịka anyanwụ, na dị egwu dịka usuu-ndị-agha ji ọkọlọtọ nile.

15 Ma ọgbụgba-ama nke andị-aka-ebe mmadụ atọ ka m ga-ezipụ site n’okwu nke m.

16 Ma lee, ndị ọbụla nke akweere n’okwu m nile, ndị ahụ ka m bga-eleta jiri cngosipụta-ìhè nke dMụọ m; ma ha ga-abụ ndị eamụworo site na m, ọbụna site na mmiri ma site na Mụọ ahụ—

17 Ma unu aghaghị i chere nwantakịrị oge, n’ihi na aechibeghị unu echichi—

18 Ma ọgbụgba-ama ha ga-apụ kwa bụrụ aamamikpe nye ọgbọ nke a ma ọbụrụ na ha emesie obi ha ike megide ha;

19 N’ihi na aihe otiti na-ebuta ịtọgbọrọ n’efu ga-agagharị n’etiti ndị nile bi n’elu-ụwa, ma ga-aga n’iru na-awụpụta site n’oge ruo n’oge, ma ọbụrụ na ha bechegarịghị, tutu ruo mgbe ụwa ga-atọgbọrọ cnkịtị, ma e ripịa ma bibie kpam-kpam ndị nile bi n’ime ya site na mmuke nke dọbịbịa m.

20 Lee, agwara m gị ihe ndị a, ọbụna dịka m siri agwa ndị mmadụ maka mbibi nke Jereusalem; ma bokwu m garịrị apụta-ìhè ugbụ a dịka ọ pụtara-ìhè mgbe ochie.

21 Ma ugbua enye m gị iwu, nwa odibo m Joseph, ka i chegharịa ma jee ije-gị n’ịkwụ-ọtọ karịa n’iru m, ka ị ghara ikwenye na nkwagide nile nke ndị mmadụ ọzọ;

22 Ma na ị ga-akwụrụ chịm an’idota iwu-nsọ nile ndị m nyeworo gị n’iwu; ma ọbụrụ na ị mee nke a lee enye m gị ndụ ebighi-ebi, ọbụna asị na begburu gị egbu.

23 Ma ugbụ a, ọzọ, a na m ekwuru gị, nwa odibo m Joseph, gbasara anwoke ahụ nke chọrọ aka-ebe ahụ—

24 Lee, a sị m ya, ọ na-ebuli onwe ya elu ọ naghị-eme onwe ya umeala n’ụzọ zuru-oke n’iru m; mana ọbụrụ na ọ ga-akpọ isi-ala n’iru m, na mee onwe ya umeala n’oke ekpere ma n’okwukwe, n’ime ezi-okwu nke obi ya, mgbe ahụ ka m ga-ekwe ka ọ ahụ ihe ndị ahụ ọ chọrọ ịhụ.

25 Ma mgbe ahụ ọ ga-asị ụmụ mmadụ nke ọgbọ nke a: Lee, a hụwo m ihe ndị ahụ Onye-nwe gosiworo Joseph Smith, Nta, ma a ama m n’ezie na ihe ndia bụ ezi-okwu, n’ihi na ahụwo m ha, n’ihi na e gosiwo m ha site n’ike nke Chineke ma na-abụghị site na mmadụ.

26 Ma mụ Onye-nwe nyere ya iwu, nwa odibo m Martin Harris, na ọ gaghị ekwu ihe ọzọ nye ha gbasara ihe ndị a, ewezuga na ọ ga-asị: a hụwo m ha, e gosiwo m ha site n’ike nke Chineke; ma ndị a bụ okwu ndị ọ ga-ekwu.

27 Mana ọ bụrụ na ọ gọnarị nke a ọ ga-emebi ọgbụgba-ndụ nke mụ na ya gbara tutu ugbụ a, ma lee, a mawo m ya ikpe.

28 Ma ugbụ a, ma ọbụghị ma o wedatara onwe ya ala ma nakwere n’ezi okwu n’iru m ihe nile ndị o mere dị njọ, ma gbaa-ndụ mụ na ya na ọ ga-edota iwu-nsọ m nile, ma jiri okwukwe rụọ ọrụ n’ime m lee, a sị m ya, ọ gaghị ahụ ihe ndị a, n’ihi a agaghị m enye ya echichi banyere ihe nile ndia m kwuru.

29 Ma ọbụrụ na nke a bụ otu o si wee dị, e nyere m gị ịwu, nwa odibo m Joseph, na ị ga-asị ya, na ọ gaghị emekwa ọzọ, ọbụghị ma-ọbụ nye m nsogbu ọzọ gbasara okwu nke a.

30 Ma ọbụrụ na nkea bụ otu o si wee dị, lee, a sị m gị Joseph mgbe ị tụgharịworo-asụsụ ibe ole na ole ọzọ ị ga-akwụsị nwa-oge nta, ọbụna rue mgbe m ga-enye gị iwu ọzọ; mgbe ahụ ka ị ga-enwe ike ịtugharị-asụsụ ọzọ.

31 Ma ewezuga ma i mere nke a, lee, ị gaghị enwe kwa onyinye ọzọ, ma a ga m ewepụ ihe nile ndị m ranyeworo n’aka gị

32 Ma ugbua, n’ihi na a hụwo m ndị nọ na nche maka ibibi gị, e, a hụrụ m na ọbụrụ na nwa odibo m Martin Harris e wedataghị onwe ya-ala ma nabata onye aka-ebe sitere n’aka m, na ọ ga-adaba n’ime njehie;

33 Ma ha dị ọtụtụ ndị nọ na nche maka ambibi gị site n’iru nke ụwa; ma n’ihi ihe nke a, ka ụbọchị gị nile wee dị ogologo, e nyewo m gị iwu-nsọ ndị a.

34 E, n’ihi ihe nke a asịwo m: Kwụsị, ma guzo jii tutu ruo mgbe m ga-enye gị iwu, ma a ga m, aarọpụta ụzọ ị ga-esi nwee ike mezuo ihe ahụ m nyere gị n’iwu.

35 Ma ọbụrụ na i kwesi antụkwasị-obi n’idobe iwu-nsọ m nile, a bga-ebuli gị elu n’ụbọchị ikpeazụ ahụ. Amen.