Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 126


Nkeji 126

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, n’ụlọ nke Brigham Young; na Nauvoo, Illinois, 9 Julaị 1841 (History of the Church, 4:382). N’oge nke a Brigham Young bụ Onye-isi nduzi nke Ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụ.

1–3, Brigham Young ka e toro maka ọrụ ya nile ma a napụrụ ya ije-njem n’obodo ọzọ n’ọdịn’iru.

1 Nwanne m nwoke na ezigbo onye m hụrụ n’anya aBrigham Young, n’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru nye gị. Nwa odibo m Brigham, a chọghị kwa ka ị hapụ ezi na ụlọ gị dịka na mbụ n’ihi onyinye gị kwesịrị ka anabata ya n’iru m.

2 Ahụwo m aọrụ gị na mgbalị n’ije-njem nile n’aha nke m.

3 Ya mere e enye m gị-ịwụ ka i zipụ okwu m n’obodo ọzọ, na nwee nlekere anya pụrụ-iche na aezi na ụlọ gị site ugbua gaa n’irụ na rụọ mgbe nile. Amen.