Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 65


Nkeji 65

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Oktoba 1831 (History of the Church, 1:218). Onye-amụma kpọrọ mkpughe nke a ekpere.

1–2, Ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze nke Chineke ka e nyefere mmadụ n’uwa, ma ije nke ozi-ọma ga-enwe mmeri; 3–6, Ala-eze elu-igwe nke oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa otu puku afọ ga-abịa ma jịkọọ ọnụ ya na ala-eze nke Chineke n’elu ụwa.

1 N̄aa-ntị, ma lee otu olu dịka nke onye e zidatara n’ala site n’elu, onye dị ukwuu ma dịkwa ike, onye ngapụ ya bụ ruo na nsọtụ nile nke ụwa, e, onye olu ya bụ nye ụmụ mmadụ—aDozienụ ụzọ nke Onye-nwe, mee ka ụzọ ya nile guzozie.

2 aỌtụghe-ụzọ nile nke bala-eze Chineke ka e nyefere mmadụ n’ụwa ma site n’ebe ahụ ka ozi-ọma ahụ ga-apụ ruo nsọtụ nile nke ụwa, dịka cokwute awapụtara n’elu ugwu n’ejighi aka si agawa, ruo mgbe o djupụtara ụwa nile.

3 E, otu olu na-akwa akwa—Dozienụ ụzọ nke Onye-nwe, dozienụ anri anyasị nke Nwa-atụrụ ahụ, jịkere nụ maka bOnye na-alụ nwunye.

4 Kpee ekpere nye Onye-nwe, kpọkuo aha nsọ ya, mee ka amata ọrụ ya nile dị ebube n’etiti ndị mmadụ.

5 Kpọkuo nụ Onye-nwe, ka ala-eze ya gaa n’iru n’elu ụwa, ka ndị bi n’ebe ahụ nwee ike inata ya, ma nọrọ na njikere maka ụbọchị ndị na-abịa, n’ime nke Ọkpara nke Mmadụ aga-arịda site n’elu-igwe, byikwasị ịdị-ọcha nke cebube ya, izute dala-eze nke Chineke nke e hiwere n’elu ụwa.

6 Ya mere, ka aala-eze nke Chineke gaa n’iru, ka bala-eze nke elu-igwe bịa, ka gị. O Chineke, bụrụ onye e buliri-elu n’elu-igwe otu a n’ụwa ka ndị-iro gị nile bụrụ ndị emerịrị n’ihi na nnukwu nsọpụrụ ahụ bụ nke cgị, ike na ọtutọ ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.