Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 92


Nkeji 92

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Kirtland, Ohio, 15 Maach 1833 (History of the Church, 1:333). Mkpughe nke a ka e lekwasịrị Frederick G. Williams anya, onye nke a họpụtaworo nso nso dịka onye ndụmọdụ n’ime Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ.

1–2, Onye-nwe na-enye iwu-nsọ nke gbasara ịbata n’otu nke ndị jikọrọ onwe ha n’usoro.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru, e nye m òtù nke andị jikọrọ onwe ha n’usoro, a haziri dịka iwu-nsọ nke e nyeworo na mbụ, mkpughe na iwu-nsọ gbasara nwa odibo m Frederick G. Williams, ka unu nabata ya n’òtù nke usoro ahụ. Ihe m kwuru nye otu onye ka m kwuru nye mmadụ nile.

2 Ma ọzọ, a sị m nye gị nwa odibo m Frederick G. Williams, ị ga-abụ onye-otu nke siri ike n’usoro nke a; ma ọbụrụra na ị kwesịrị ntụkwasị-obi n’idebe iwu-nsọ m nile ndị mbụ a ga-agọzi gị ruo mgbe nile. Amen.