Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 122


Nkeji 122

Okwu nke Onye-nwe nye Joseph Smith Onye-amụma, mgbe ọ bụ onye-mkpọrọ na ụlọ-mkpọrọ nọ na Liberty, Missouri, Maach 1839 (History of the Church, 3:300–301).

1–4, Nsọtụ nile nke ụwa ga-ajụ maka aha nke Joseph Smith; 5–7, Ihe ize ndụ ya nile na ụfụ nile ga-enye ya uche o nwetara na bụrụ maka ọdịmma nke ya; 8–9, Ọkpara nke Mmadụ agabigawo gbadaa karia ha nile.

1 Nsọtụ nile nke ụwa ga-ajụ maka aaha nke gị, na ndị nzuzu ga-akwa gị emo, na ala-mụọ ga-eme uzu megide gị.

2 Ebe ndị dị ọcha n’obi, na ndị maara ihe, na ndị ama-ama, na ndị omume-ọma ga-achọ andụmọdụ, na ikike, na ngọzi nile mgbe nile site n’okpuru aka gị.

3 Na ndị nke gị a pụghị ịtụgharị megide gị site n’ama nke ndị nrapụta nile.

4 Na ọ bụ ezie na ọnọdụ inwe ike ha ga-atụba gị na nsogbu na n’ime ụlọ-mkpọrọ nile na mgbidi nile, a ga-edo gị na nnukwu-ugwu; mana nanị ntakịrị aoge na olu gị, ga-adị egwu karịa n’etiti ndị-iro gị, karịa bọdụm dị egwu, n’ihi ezi-omume nke gị, na Chineke gị ga-eguzogide gị ruo mgbe nile na mgbe nile.

5 Ọ bụrụ na-akpọrọ gị ịhụ mkpagbụ, ọ bụrụ na ịnọ na ize-ndụ nile n’etiti ụmụnna n’ekwesigh ntụkwasị-obi, ọ bụrụ na i nọ n’ize-ndụ nile n’etiti ndị ori; ọ bụrụ na i nọ n’ize-ndụ nile site n’ala ma-ọbụ site n’osimiri.

6 Ọ bụrụ na e boro gị ebubo jiri ụdị okwu ụgha nile nke ebubo; ọ bụrụ na ndị-iro gị adakwasị gị, ọ bụrụ na ha adọwapụ gị site na otu nke nna gị na nne na ụmụnne nwoke na umunne nwanyị, na ọ bụrụ na ndị iro gị ejiri mma agha amịpụtara kewapụ gị, site n’obi nwunye gị na kwa ụmụ gị, na ọkpara gị, ọ bụ ezie na ọdị nani afọ isii, ga-arapara n’uwe nwụda gị, na sị, nna m, nna m, gịnị mere ị gaghị a nọnyere anyị? O, nna m gịnị ka ndị nwoke ahụ gaje ime gị? na ọ bụrụ na mgbe ahụ a ga-ejiri mma agha ekewapụ ya site na gị na adọkpụrụ gị tụba na ụlọ-mkpọrọ, na ndị-iro gị ejupụta gburu gburu dịka aagụ nile maka ọbara nke Nwa-atụrụ;

7 Na ọ bụrụ na a ga-atụba gị n’ime olulu, ma-ọbụ nye gị n’aka nile nke ndị ogbu-mmadụ, na ama-gi ikpe ọnwụ, ọ bụrụ na atụba gị n’ime aomimi, ọ bụrụ na ebili mmiri agbakọọ megide gị, ọ bụrụ na ifufe dị egwu abụrụ onye-iro gị, ọ bụrụ na elu-igwe nile ejikọrọ ọchịchịrị, na ihe nile e jikọọ ọnụ ịnọchi ụzọ gị na, karịa ihe nile, ọ bụrụ na ọnụ nile nke bala-mụọ asawo mbara ma meghee maka gị, mara gị nwa nwoke nke m, na ihe ndị a nile ga-enye gị cuche nke onwe ga-abụ maka ọdị-nma gị.

8 aỌkpara nke Mmadụ ahụ agabigawo bgbadaa karịa ha nile. Ị dị ukwuu karịa ya?

9 Ya mere nosie-ike n’ụzọ gị na ọkwa nchụ-aja aga-anọgide na gị n’ihi bókè ha nile ka amaara, ha agaghị agefe. cỤbọchị gị nile ka amaara, na afọ gị nile agaghị abụ ihe aga agụbilata; ya mere datụla egwu ihe mmadụ ga-eme, n’ihi Chineke ga anọnyere gị ruo mgbe nile na mgbe nile.