Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 21


Nkeji 21

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Fayette, New York, 6 Epril 1830 (History of the Church, 1:74–79). Mkpughe nke a ka e nyere na nhiwe nke Nzukọ-nsọ n’ụbọchị a kpọrọ aha, n’ụlọ Peter Whitmer, Ụkwụ. Ndị nwoke isii, ndị mewororịị baptism sonyere. Site na-nkwekọrịta ọnụ na ntụlị-aka, ndị a gosipụtara ọchịchọ na mkpebi ha ka ehiwa, dịka ịwụ-nsọ nke Chineke (Lee Nkeji 20). Ha tulikwara aka ị nabata ma kwado Joseph Smith, nta, na Oliver Cowdery dịka ndị-ọrụ ndụzi nke Nzukọ-nsọ. Site n’ibikwasị aka n’isi Joseph chiri Oliver okenye nke Nzukọ-nsọ, ma Oliver otu aka ahụ Chikwara Joseph. Mgbe e lekotachara oriri-nsọ, Joseph na Oliver bikwasịrị aka n’isi ndị nile sonyere n’otu n’otu maka nnyefe nke Mụọ Nsọ ma n’ihi ịme ọnye-otu nke onye ọbụla dịka onye-otu nke Nzukọ-nsọ.

1–3, Joseph Smith ka a kpọrọ ịbụ onye ọhụ-ụzọ, onye ntụgharị asụsụ, onye-amụma, onye ozi, na okenye; 4–8, Okwu ya ga-edu ụzọ nke Zaịọn; 9–12, Ndị-nsọ ga-ekwere okwu ya nile dịka ọ na-ekwu site na Onye nkasi-obi.

1 Lee a ga-enwe aakụkọ ndekọta edotara n’etiti unu; n’ime ya a ga akpọ gị bonye-ọhụ-ụzọ, onye ntụgharị asụsụ, onye-amụma, conye ozi nke Jisus Kraịst, okenye nke Nzukọ-nsọ site n’uche nke Chineke Nna, na amara nke Onye-nwe-gi Jisus Kraịst,

2 Onye ankwalite mụọ ya sitere na Mụọ Nsọ ịtọ-ntụala ya, ma wulie ya elu ruo n’ogo kachasị na okwukwe-nsọ.

3 Bụ aNzukọ-nsọ nke bahaziri ma hiwe n’afọ nke Onye-nwe unu nari iri na asatọ na-iri-atọ, n’onwa nke a na-akpọ Epril.

4 Ya mere, n’ikwuru Nzukọ-nsọ, ị ga-ege ntị nye aokwu ya nile na iwu-nsọ nile nke ọ ga-enye unu dịka ọ natara ha, n’eje-ije bn’ịdị-nsọ nile n’iru m;

5 N’ihi na aokwu ya ka unu ga-anata, dịka o si na-ọnụ nke m, na ndidi nile na okwukwe.

6 N’ihi na site na-ime ihe ndị a aọnụ ụzọ ama nile nke ala-mụọ agaghị akakwa unu ike; e, ma Onye-nwe Chineke ga-agbasasị ike nke bọchịhịrị site n’iru unu, ma mee ka elu-igwe nile ma cjijiji, n’ihi ọdịnma unu, na debube nke aha ya.

7 N’ihi otu a ka Onye-nwe Chineke kwuru: Ya ka m kwalitere mụọ ị ga-n’iru kwalite ụzọ nke aZaịọn na nnukwu ike n’ihi ọdịnma, ma ịrụsi ọrụ ya ike ka m matara, na ekpere ya nile ka m nụworo.

8 E, Ị kwa-akwa ya maka Zaịọn ka m hụworo, ma a ga m eme ka ọ ghara iru-uju maka ya gaa n’iru n’ihi ụbọchị ịn̄ụrị-ọn̄ụ ya abịawo ruo na ansacha nke mmehie ya nile na ngosipụta nile nke ngọzi m nile n’ọrụ ya nile.

9 N’ihi, lee, a ga m aagọzi ndị nile na-arụ ọrụ bn’ụbị vine m site n’ijiri nnukwu ngọzi, ma ha ga-ekwere n’okwu ya nile, nke enyere ya site na m site na cOnye-nkasị-obi, nke dgosipụtara na Jisus bụ onye endị mmehie fkpọgburu maka mmehie nile nke gụwa, e, n’ihi nsachapụ nke mmehie nile ruo n’obi hnchegharị.

10 Ya mere, ọ masịrị m ka aechie ya echichi site n’aka gị, Ọliver Cowdery onye ozi nke m.

11 Nke a ịbụ emume-nsọ nye unu, na ịbụ okenye n’okpuru-aka ya, ya ịbụ onye nke ambụ nye gị, ka ị nwee-ike ịbụ okenye nye nzukọ-nsọ nke Kraịst akpọkwasịrị aha m—

12 Ma onye nkwusa ozi-ọma nke mbụ nke Nzukọ-nsọ ma n’irụ uwa, e, n’iru ndị Jentaịlụ, e, ma otu a ka Onye-nwe Chineke kwụrụ, lee, lee! nye kwa andị Juu. Amen.