Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 41


Nkeji 41

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio, 4 Februarị 1831 (History of the Church, 1:146–147). Ngalaba Nzukọ-nsọ nọ na Kirtland n’oge nke a jiri ngwa-ngwa na-eto n’ọnu-ọgụgụ. Mgbe ọ na-ede okwu mmalite mkpughe nke a, Onye-amụma dere, “Ndị-otu nile…[ahụ] naara agba mbọ ime uche nke Chineke, ruo n’ogo nile ha matara ya, na-agbanyeghị na ụfọdụ echiche dị iche na mụọ ụgha nile egbebatawo n’etiti ha…[ma] Onye-nwe nyere Nzukọ-nsọ nke a na-eso.” (History of the Church, 1:146–147).

1–3, Ndị okenye ga-achị Nzukọ-nsọ site na mụọ nke mkpughe; 4–6, Ezi ndị-na-eso ụzọ ga-anata na debekwa iwu nke Onye-nwe; 7–12, Edward Partridge ka a kpọrọ ụkọchukwu nye Nzukọ-nsọ.

1 N̄aa-ntị ma nụrụ, O unu ndị nke m, ka Onye-nwe na Chineke unu kwuru, unu ndị ọ masịrị m aigọzi jiri ngọzi nile kachasị nnukwu, unu ndị na-anụ olu m, na unu ndị na-anaghị anụ olu m ka m bga-abụ ọnụ, ndị ckwupụtaworo aha m, jiri ịbụ-ọnụ nile kachasị arọ.

2 N̄aa-ntị, O unu ndị okenye nke nzukọ-nsọ m ndị m kpọworo, lee e nye m unu iwu-nsọ, na unu ga-akpọkọta onwe unu ọnụ aikwekọrịta n’okwu m;

3 Na site n’ekpere nke okwukwe unu unu ga-anabata aiwu m, ka unu wee mata otu esi achị nzukọ-nsọ m ma nwee ihe nile n’ụzọ ziri ezi n’iru m.

4 Ma a ga m abụ onye ana-achị unu mgbe m bbịara; ma lee, a na m abịa ọsọ-ọsọ, ma unu ga-ahụ na e debere iwu m.

5 Onye ahụ nke anabatara iwu m na bmee ya, onye ahụ bụ onye na-eso ụzọ m, ma onye na-asị na ya nabatara ya ma o meghị ya, onye ahụ abụghị onye na-eso ụzọ m, ma a cga-achụpụ ya site n’etiti unu;

6 N’ihi na ọdịghị mma na ihe nile bụ nke ụmụ nke ala-eze ga-abụ nke e nyere ndị n’ekwesịghị ekwesị, ma-ọbụ nye ankita, ma-ọbụ na bọla pel ga-abụ ihe a tụpụrụ n’iru ezi.

7 Ma ọzọ, ọ dị mma na nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ga-enwe otu aụlọ e wuru, n’ime ebe ọ ga-ebi ma bna-atụgharị-asụsụ.

8 Ma ọzọ, ọ dị mma ka nwa odibo m Sidney Rigdon biri otu ọ masịrị ya, ọbụrụraa na ọ na-edebe iwu-nsọ m nile.

9 Ma ọzọ, a kpọwọ m nwa odibo m aEdward Partridge; ma e nye m otu iwu-nsọ, na a ga-ahọpụta ya site n’olu nke nzukọ-nsọ, ma chie ya echichi bụkọchukwu nye nzukọ-nsọ, ịhapụ ngwa-ahịa ya nile na ciwere oge ya nile na-arụ ọrụ nile nke nzukọ-nsọ;

10 Ịhụ maka ihe nile dịka a ga-ahọpụtara ya n’ime iwu m nile n’ụbọchị nke m ga-enye ha.

11 Ma nke a n’ihi na obi ya dị ọcha n’iru m, n’ihi ọ dịka aNataniel nke mgbe ochie, onye baghụghọ na-adịghị n’ime ya.

12 Okwu ndị a ka e nyere unu, ma ha enweghi ntụpọ n’iru m; ya mere, kpachapụ nụ anya otu unu si edebe ha, n’ihi na a ga-aza ajụjụ ha n’elu mkpuru-obi unu nile n’ụbọchị ikpe. Ọbuna otu a. Amen.