Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 117


Nkeji 117

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Far West, Missouri, 8 Julaị 1838, gbasara ọru nile nke ugbua nke William Marks, Newel K. Whitney, na Oliver Granger (History of the Church, 3:45–46).

1–9, Ndị odibọ nke Onye-nwe a gaghị enwe anya-ukwu n’ihe nke ụwa nile, n’ihi gịnị bụ arịa-ụlọ nye Onye-nwe?; 10–16, Ha ga-ahapụ enweghị-obi siri-ike, na aja ha nile ga-adị nsọ nye Onye-nwe.

1 N’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru nye nwa odibo m William Marks, na kwa nye nwa odibo m Newel K. Whitney, ka ha mezie ọrụ nke ha ọsọ-ọsọ na pụọ site n’ala nke Kirtland, tutu mụ, Onye-nwe, e ziga akụ-igwe nile ọzọ n’elu ụwa.

2 Ka ha teta, na bilite, na pụta, na ọ bụghị ị nọrọ, n’ihi mụ, Onye-nwe, enyewo ya ka iwu.

3 Ya mere, ọ bụrụ na ha a nọrọ ọ gaghị adịrị ha na mma.

4 Ka ha chegharịa site na mmehie ha nile, na ọchichọ anya-ukwu ha nile, n’iru m, ka Onye-nwe kwuru; n’ihi gịnị bụ aarịa-ụlọ nye m? Ka Onye-nwe kwuru.

5 Ka arịa-ulọ nile nke Kirtland bụrụ ihe erepụrụ maka aụgwọ nile, ka Onye-nwe kwuru. Ka ha pụọ, ka Onye-nwe kwuru, na ihe ọbụla nke fọdụrụ, ka ọfọdụ n’aka unu, ka Onye-nwe kwuru.

6 Ma-ọbụ na m enweghị anụ-ufe nile nke elu-igwe, na kwa azụ nile nke oke osimiri, na anụ ọhịa nke ugwu ukwu nile? Ọ bụ na mụ ekeghị ụwa? Ọ bụ na mụ ejighị aeke nile nke ndị-agha nile nke mba nile nke ụwa?

7 Ya mere, ọ bụna mụ apụghị ime ka ebe nile atọgbọrọ n’efu ka o puo na haa ifuru, na mịa nkpụrụ na uju? Ka Onye-nwe kwuru.

8 Ọ bụ n’enweghi ohere zuru-oke n’ugwụ nile nke aAdam-ondi-Ahman, na-ala larịị nile nke Olaha bShinehah, ma-ọbụ cala ahụ ebe Adam biri, na unu ga-enwe anya ukwu na nke ahụ bụ ntasa mmiri, na hapụ atụmatụ nile dị oke mkpa?

9 Ya mere, gbagote nụ n’ebe a rute n’ala nke ndị m, ọ bụna Zaịọn.

10 Ka nwa odibo m William Marks akwesi ntụkwasị-obi n’ilekọta ihe ole na ole, na ọ ga-abụ onye ọchịchị ga-elekọta ọtụtụ. Ka ọ nọ-n’isi n’etiti ndị m na mba nke Far West, na ka e jiri ngọzi nile nke ndị m gọzie ya.

11 Ka nwa odibo m Newell K. Whitney nwee ihere nke ndị otu aNikolaitane na maka ihe arụ bnzuzo ha nile, na nke enweghi obi siri-ike ya nile n’iru m, ka Onye-nwe kwuru, na gbagota n’ala nke Adam-ondi-Ahman, na bụrụ onye cụkọchukwu nye ndị m, ka Onye-nwe kwuru, ọ bụghị n’aha mana n’omume, ka Onye-nwe kwuru.

12 Na ọzọ, a sị m unu, e chetara m nwa odibo m aOliver Granger; lee, n’ezie a sị m ya na aha ya bụ ihe a ga-enwe na ncheta dị nsọ site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ruo mgbe nile na mgbe nile, ka Onye-nwe kwuru.

13 Ya mere, ka o jiri mgbalị lụọ-ọgụ n’ihi mgbapụta nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ nke Nzukọ-nsọ m, ka Onye-nwe kwuru; ma mgbe ọ dara ọ ga-ebili ọzọ, n’ihi na aaja nke ya ga-adị nsọ karịa nye m ọbụna karịa mmụba ya, ka Onye-nwe kwuru.

14 Ya mere, ka ọ gbagote ebe a ọsọ-ọsọ, rute ala nke Zaịọn; na mgbe oge ya ruru a ga-eme ya onye-ahịa nye aha nke m, ka Onye-nwe kwuru, maka nrite uru nke ndị m.

15 Ya mere, ka onye ọbụla ghara ileda nwa odibo m Oliver Granger anya, kama ka ngọzi nile nke ndị m dakwasị ya ruo mgbe nile na mgbe nile.

16 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ka ndị odibo m nile n’ala nke Kirtland cheta Onye-nwe ha na Chineke ha, na ụlọ nke m kwa, idebe na iche-kwa ịdị-nsọ ya, na ịchụpụsị ndị mgbanwe ego mgbe oge nke m ruru, ka Onye-nwe kwuru. Ọbụna otu a. Amen.