Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 103


Nkeji 103

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 24 Februarị 1834 (History of the Church, 2:36–39). Mkpughe nke a bụ nke enwetara mgbe Parley P. Pratt na Lyman Wight bịarutesịrị na Kirtland, Ohio, ndị sitere Missouri bịa ị nụrụ ndụmọdụ onye-amụma maka enyem-aka na ndozigharị nke Ndị-nsọ n’ala ha nile na Ógbè Jackson.

1–4, Ihe mere Onye-nwe jiri hapụ ndị nsọ nile nọ na Ógbè Jackson ka ha nwee nsogbu; 5–10, Ndị nsọ nile ga-emeri ma ọ bụrụ na ha edebe iwu-nsọ nile; 11–20, Mgbapụta ahụ nke Zaịọn ga-abia site n’ike, ma Onye-nwe ga-eburu ndị ya ụzọ gaa; 21–28, Ndị nsọ nile ga-agbakọta na Zaịọn, ma ndị tufuru ndu ha ga-achọta ha ọzọ; 29–40, Ọtụtụ ụmụ nna ka-akpọrọ ihazi ebe Izu-ike nke Zaịọn ma gaa Zaịọn, e kwere ha nkwa mmeri ma ọ bụrụ na ha kwesịrị ntụkwasị-obi.

1 N’ezie a si m unu, ndị enyi m, lee, a ga m enye unu otu mkpughe na iwu-nsọ, ka unu jiri mara otu unu ga-eji amee omume n’ịrụ ọrụ unu nile gbasara nzọpụta na bmgbapụta nke ụmụ nna unu, ndị ekposasiworo n’ala nke Zaịọn.

2 Ndị aachụpụrụ ma gbue site n’aka ndị iro m nile, ndị m ga-awụsa oke iwe m n’enweghi atụ n’oge nke m.

3 N’ihi a nagidewo m ha rue ugbụ a, ka ha nwee-ike amejupụta ihe arụ nke njehie ha nile, ka iko ha wee ju;

4 Ma ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha n’aha m kwesịrị aka-ata ha ahụhụ nwaoge nta jiri ntara m ahụhụ dị mgbu ma dịkwa ike n’ihi na ha e bgeghị ntị ha nile nye ntụzi aka nile na iwu-nsọ nile nke m nyere ha.

5 Mana n’ezie a sị m unu, na e nyewo m iwu ọkụ nke ndị m ga-amata, ọ bụrụra na ha an̄a nti-site na awa nke a kpọm-kwem nye andụmọdụ nke m, Onye-nwe Chineke ha, ga-enye ha.

6 Lee ha ga, n’ihi e kwuwo m ya, malite ibili megide ndị iro m nile site na-awa nke a.

7 Ma site an’ị-n̄a nti na idebe okwu nile nke m, Onye-nwe Chineke ha, ga-ekwuru ha, ha agaghị akwụsị imeri rue mgbe a kwaturu bala eze nile nke ụwa n’okpuru ụkwụ m, ma ụwa ahụ ka cenyere dndị-nsọ nile, ị enwere ya ruo mgbe nile na mgbe nile.

8 Mana ọ bụrụ na ha e adebeghị iwu-nsọ m nile, na n̄aghị ntị idebe okwu m nile, ala-eze nile nke ụwa ga-ebili imeri ha.

9 N’ihi e debere ha ị bụrụ aìhè nye ụwa, ma bụrụkwa ndị nzọpụta nke ndị mmadụ;

10 Ma ọ bụrụra na ha abụghị ndị nzọpụta nke ndị mmadụ, ha dị dịka annu na-etufụwo ụtọ ya, ma mgbe ahụ ọdịghị kwa ihe ọdị-nma ya nani ka etufuo ya na ka ndị mmadụ na-azọ ya ụkwụ.

11 Mana n’ezie a sị m unu, e nyewo m iwu-ọkụ ka ụmụ nna unu ndị ekposasịrị lọghachi an’ala nile nke ihe nketa ha nile, na wulie ebe nile bụ nkpọnkpọ ebe nke Zaịọn, elu.

12 N’ihi mgbe aọtụtụ mkpagbu gasịrị, dịka m nyeworo gị n’ịwu-nsọ ochie, ọtụtụ ngọzi ga-abịa.

13 Lee, nke a bụ ngọzi nke m kweworo na-nkwa mgbe ọtụtụ mkpagbu gasịrị, na ọtụtụ mkpagbu nke ụmụ nna unu—mgbapụta unu, na mgbapụta ahụ nke ụmụ nna unu, ọbụna ịkpọghachita ha n’ala nke Zaịọn, ihiwe ha, a gaghị kwa akwatu ha ọzọ.

14 Otu o sila dị, ọ bụrụ na ha emerụọ ihe nketa ha nile, a ga-akwatu ha; n’ihi a gaghị m edebe ha ọbụrụ na ha emerụọ ihe nketa ha nile.

15 Lee, a sị m unu, mgbapụta ahụ nke Zaịọn dị mkpa ịbịa site n’ike;

16 Ya mere, a ga m akpọlite nye ndị m otu nwoke, onye ga-edu ha dika aMoses duru ụmụ nke Israel.

17 N’ihi unu bụ ụmụ nke Israel, na amkpụrụ nke Abraham, ma ọ dị nkpa n’edupụtara unu site n’ịbụ-oru site n’ike, ma jiri ogwe-aka e setịpụrụ esetipụ.

18 Ma dịka e jiri duo nna unu na mbụ, ọbụna otu a ka mgbapụta nke Zaịọn ga-adị.

19 Ya mere, ka obi ghara ịda unu mba, n’ihi a sịghị m unu dịka m gwara nna unu ha: aMụọ ozi m ga na-eje n’iru unu, mana ọbụghị mụ bonwe m.

20 Mana a sị m unu: aNdị mụọ-ozi m ga na-eje n’iru unu, na kwa mụ onwe m, ma n’oge nta, unu bga-enweta ala-ọma ahụ.

21 N’ezie, n’ezie a sị m unu, na nwa odibo m Joseph Smith, Nta, bụ anwoke ahụ m ji-tụnyere nwa odibo ahụ nke Onye-nwe bubi-vine kwuru okwu n’ilu ahụ nke m nyere unu.

22 Ya mere ka nwa odibo m Joseph, nta, kwuo nye aume nile nke ụlọ m, ụmụ okorọbịa m na ndị di nkpa—kpọkọta onwe unu ọnụ n’otu ebe n’ala nke Zaịọn, n’elu ala nke m zụtaworo jiri ego nke e doro-nsọ nye m.

23 Ma ka ndị nzukọ-nsọ nile zipụ ndị amamihe ya na ego ha nile, ma azụọ-ala nile ọbụna dịka m nyere ha n’iwu.

24 Ma ọbụrụ na ndị iro m abịa imegide unu ichụpụ unu site an’ala ọma ahụ, nke m doworo-nsọ ị bụ ala nke Zaịọn, ọbụna site n’ala nke unu nile mgbe agbasiri-ama nile, nke unu wetara n’iru m megide ha, unu ga-abụ ha ọnụ.

25 Ma onye ọbụla unu bụrụ-ọnụ, a ga m abụ-ọnụ, ma unu ga-abọrọ m-ọbọ n’aka ndị iro m nile.

26 Ma a ga m a nọnyere unu ọbụna an’ibọrọ m-ọbọ n’aka ndị iro m nile, rue n’ọgbọ nke atọ na nke anọ nke ha ndị kpọrọ m asị.

27 Ka onye ọbụla ghara itụ-egwu ịtọgbọ ndụ ya n’aha m, n’ihi onye ọbụla nke atufuru ndụ ya n’aha m ga-ahụ ya ọzọ.

28 Ma onye ọbụla nke n’adigh na-njikere itufu ndụ ya n’ihi m abụghi onye n’eso ụzọ m.

29 Ọ bụ uche m ka nwa odịbọ m aSidney Rigdon welie olu ya n’ọgbakọ nile na mba ọwụwa anyanwụ nile iji kwado Nzukọ-nsọ nile idebe iwu-nsọ nile nke m nyeworo ha gbasara mwetaghachi ahụ na mgbapụta nke Zaịọn.

30 Ọ bụ uche m ka nwa odibo m Parley P. aPratt na nwa odibo m Lyman Wight ghara ilaghachi n’ala nke ụmụ nna ha, rue mgbe ha nwetachara ọgbọ ndịkom nile ahaziri nke ha ji aga ala nke Zaịọn, site na iri-iri, ma-ọbụ ịrị-abụọ-iri-abụọ, ma-ọbụ iri-ise iri-ise, ma-ọbụ site na otu nari, rue mgbe ha nwetara ruo nari ise nke bume nke ulo m.

31 Lee nke a bụ uche m, rịọ ma unu ga arịọta, mana ndị mmadụ aanaghi kwa eme uche m oge nile.

32 Ya mere, ọbụrụ na inweghị-ike inweta nari ise, chọsie ike n’eleghị-anya i ga-enweta nari atọ.

33 Ma ọ bụrụ na inweghị-ike inweta nari atọ, chọsie ike n’eleghị-anya i ga-enweta otu nari.

34 Mana n’ezie a sị m unu, otu iwu-nsọ ka m na-enye unu, ka i ghara iga-pụ jee n’ala nke Zaịọn ruo mgbe inwetazuru otu nari nke ume nke ụlọ m nke i ga-eji gawa n’ala nke Zaịọn.

35 Ya mere, dịka m kwuru nye unu, rịọ na unu ga-arịọta, kpesie ekpere ike ka eleghị-anya nwa odibo m Joseph Smith, Nta, nwee ike soro unu, na nọrọ n’isi n’etiti ndị m, na hazie ala-eze m n’elu ala ahụ aedoro nsọ, na hiwe ụmụ nke Zaịọn n’elu iwu nile na iwu-nsọ nile nke dịwo adị na nke a ga-enye unu.

36 Nmeri nile na otuto ka ewetazuworo oke nye gị site na aịrụsi-ọrụ ike, ikwesị-ntụkwasị-obi nile na bekpere nile nke okwukwe.

37 Ka nwa odibo m Parley P. Pratt jee-ije, ya na nwa odibo m Joseph Smith, Nta.

38 Ka nwa odibo m Lyman Wight jee-ije, ya na nwa odibo m Sidney Rigdon.

39 Ka nwa odibo m Hyrum Smith jee-ije, ya na nwa odibo m Frederick G. Williams.

40 Ka nwa odibo m Orson Hyde, jee-ije ya na nwa odibo m Orson Pratt, ebe ọbụla nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ga-enye ha ndụmọdụ, iji nweta nmezu nke iwu-nsọ nile nke m nyeworo unu, ma hapụ nke fọdụrụ n’aka m abuọ. Ọbụna otu a. Amen.