Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 77


Nkeji 77

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Maach 1832 (History of the Church, 1:253–255). Onye-amụma dere, Gbasara ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ-nsọ nile, a natara m nkowa nke a maka Mkpughe nke Jọn Onye-Nsọ (History of the Church, 1:253).

1–4, Anụmanụ nile nwere mụọ nile ma ga-ebi n’oke on̄ụ ebighi-ebi n’ụwa anwụ-anwụ; 5–7, Ụwa nke a nwere oge ịnọ n’arụ nke puku afọ asaa; 8–10, Ndị mụọ-ozi dị iche-iche ga-ewetaghachi ozi-ọma ma jee ozi n’ụwa; 11, Nrachi ahụ nke pụkụ otu narị na iri anọ na anọ; 12–14, Kraịst ga-abịa na mmalite nke afọ pụkụ asaa; 15, Ndị-amụma abụọ ka a ga-akpọlite nye mba ndị Juu.

1 Ajụjụ. Gịnị bụ aoke osimiri eji enyo mee nke Jọn kwuru maka ya n’isi nke ano, na n’ama okwu nke isii nke akwụkwọ Mkpughe?Ọzịza. Ọ bụ bụwa, n’ọnọdụ ya nke e doro nsọ, anwụghị anwụ, na cnke ebigh-ebi.

2 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta na anụ-ọhịa anọ ahụ, e kwuru maka ya n’ime otu ama okwu ahụ?Ọzịza. Ha bụ aasụsụ-nka nile, nke Onye Mkpughe Jọn jiri, n’ịkowa belu-igwe, cParadaịs nke Chineke, dan̄ụrị nke mmadụ, na nke anụmanụ nile, na nke ihe nile na-akpụ-akpụ, na nke anụ-ufe nile nke ikuku; nke ahụ bụ nke mụọ ịdị n’oyiyi nke ahụ bụ nke arụ; ma nke ahụ nke bụ nke arụ ịdị n’oyiyi nke ahụ bụ nke mụọ; emuo nke mmadụ n’ụdị arụ nke onye ahụ, nakwa dịka fmụọ nke anụmanụ, na ihe ọbụla ọzọ e kere eke nke Chineke keworo.

3 Ajụjụ. Anụmanụ anọ ahụ ha bụ nanị ha anọ otu n’otu, ka obụ na ha n’ọchiri anya ụdị ha nile ma-ọbụ usoro ha nile?Ọzịza. Ha bụ nanị anụmanụ ano otu n’otu, nke e gosiri Jọn, inọchita-anya ebube nke ụdị nile nke ihe-ekereke nile n’ime usoro ha akaraaka ma-ọbụ aọnọdụ nke okike ha, n’ime ịn̄urị ọn̄ụ nke boke ọn̄ụ ebighi-ebi ha.

4 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta banyere anya nile na nku nile, nke anụmanụ ndị a nweere?Ọzịza. Anya ha nile bụ nnọchite-anya nke ìhè na ammata-ihe, nke bụ, ha jupụtara na mmata-ihe; ma nku ha nile bụ ihe nnọchite-anya nke bike, ịga ije, ime ihe, na ihe ndị ozo.

5 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghota site na andị-okenye anọ na iri abụọ ahụ, nke Jọn kwuru maka ya?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na ndị-okenye ndị ahụ Jọn hụrụ, bụ ndị okenye ndị kwesịworo bntụkwasị-obi n’ọrụ nke ịgbasa ozi-ọma ma ha anwụwo; ndị sonyere na nzukọ-nsọ casaa ahụ, ma nọ mgbe ahụ na paradaịs nke Chineke.

6 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site n’akwụkwọ ahụ nke Jọn hụrụ, nke aarachiri arachi n’azụ jiri nrachi asaa?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na ihe dị n’ime ya bụ echiche ahụ e kpughere, bihe omimi nile, na ọrụ nile nke Chineke; ihe nzuzo nile nke nhazi akụ ya gbasara cụwa nke a n’oge puku afọ asaa ahụ nke nnọgide ya, ma-ọbụ ọnọdụ nke arụ ya.

7 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site na nrachi asaa ahụ nke e ji rachie ya?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na nrachi nke mbụ nwere ihe nile nke puku afọ anke mbụ n’ime ya, ma nke abụọ kwa nke pụkụ afọ nke abụọ, ma si otua gaa n’iru ruo na nke asaa.

8 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site na ndị mụọ-ozi anọ, ekwụwọrọ maka ha n’isi nke asaa ma n’ama-okwu nke mbụ nke Mkpughe?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na ha bụ mụọ-ozi anọ e zipụrụ site n’aka Chineke, ndị e nyere ike nye akụkụ anọ ahụ nke ụwa, ịzọpụta ndụ na kwa ibịbị; ndị a bụ ha ndị nwere ozi-ọma amgbe nile na-adigide ahụ inyefe ya mba nile, ebo, ire, na ndị mmadụ, ebe ha nwere ike imechi elu-igwe nile, irachị nyefee baa na ndụ, ma-ọbụ chụdata baa na bmpaghara nile nke ọchịchịrị.

9 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site na mụọ-ozi nke na-agbago site n’ọwụwa anyanwụ, Akwụkwọ Mkpughe isi nke asaa na ama-okwu nke abụọ?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na mụọ-ozi ahụ na-agbago site n’ọnwụwa anyanwụ bụ onye ahụ nke enyere akara-nrachi nke Chineke di ndụ nye agbụrụ iri na abụọ nke aIsrael; ya mere, ọ na-akpọku ndị mụọ-ozi anọ ahụ ndị ji ozi-ọma mgbe nile na-adigide, na-asị: Emejọkwala ụwa, ọbụghị ma-ọbụ osimiri, ma-ọbụ osisi, ruo mgbe anyị ga-akasiwo ndị odibo Chineke anyị akara-nrachi bn’egedege iru ha nile. Ma, ọbụrụ na ị ga-anata ya, nke a bụ cElaias nke gaara abịa ịkpọkọta agbụrụ nile nke Israel ma dweghachi ihe nile.

10 Ajụjụ. Ole mgbe ihe ndia nile ekwuworo maka ha n’isi nke a ga-abịa na mmezu?Ọzịza. Ha ga-abịa na mmezu na afọ puku nke aisii, ma-ọbụ na mmepe nke nrachi nke isii.

11 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site na nrachi nke aotu narị puku, iri puku anọ na anọ, site n’agbụrụ nile nke Israel—puku iri na abụọ site n’agbụrụ ọbụla?Ọzịza. Anyị ga-aghota na ndị ahụ a kara akara-nrachi bụ bndị-isi-nchụ-aja, e chiri echichi baa n’ụsọrọ nsọ nke Chineke, ilebara ozi-ọma mgbe nile na-adigide anya; n’ihi ha bụ ha ndị e chiri echichi site na mba ọbụla, ebo, ire na ndị mmadụ, site n’aka ndị mụọ-ozi ndị e nyere ike nye mba nile nke ụwa, ịkpọta ka ha ra bụ ndị ga-abịa na nzukọ-nsọ nke cOnye e Buru Ụzọ mụọ.

12 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site n’ịfụ aopi nile, ekwuturu maka ya n’isi asatọ nke akwụkwọ Mkpughe?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na dịka Chineke kere ụwa ahụ n’ime mkpụrụ-ụbọchị isii, ma n’ụbọchị nke asaa ọ rụchara ọrụ ya, ma bdoo ya nsọ, na kwa kpụọ mmadụ site cn’uzuzu nke ala, obụna otu a, na mmalite nke afo nke puku asaa ka Onye-nwe Chineke dga-edo ụwa nsọ, ma mezue nzọpụta nke mmadụ, ma ekpee ihe nile ikpe, ma fga-agbapụta ihe nile, ewezuga nke ahụ nke ọ n’etinyeghị n’ike ya, mgbe ọ rachisiworo ihe nile, ruo n’ọgwụgwụ nke ihe nile; ma ịfụ opi nile nke ndị mụọ-ozi asaa ahụ bụ njikere na ọgwụgwụ nke ọrụ ya, na mmalite nke afọ puku asaa ahụ—njikere nke ụzọ ahụ tutu oge ahụ nke ọbịbịa ya.

13 Ajụjụ. Olee mgbe ihe ndia ga-abịa na mmezu, nke e dewọrọ n’isi nke iteghete nke akwụkwọ Mkpughe?Ọzịza. Ha ga-abịa na mmezu mgbe e mepesịrị nrachi nke asaa, tutu ọbịbịa nke Kraịst.

14 Ajụjụ. Gịnị ka anyị ga-aghọta site na akwụkwọ nta ahụ nke Jọn atara, dịka e siri kwuo ya n’isi nke iri nke akwụkwọ Mkpughe?Ọzịza. Anyị ga-aghọta na ọ bụ ọrụ mgbasa ozi-ọma, na emume-nsọ, maka ya bịkpọkọta agbụrụ nile nke Israel; lee, nke a bụ Elaias, onye, dịka e deworo ya, na-aghaghị ịbịa ma cweghachita ihe nile.

15 Ajụjụ. Gịnị ka a ga-aghota site na andị aka-ebe abụọ ahụ n’isi nke iri na otu nke akwụkwọ Mkpughe?Ọzịza. Ha bụ ndị-amụma abụọ nke a ga-akpọlite nye mba bndị Juu n’ụbọchị ndị cikpeazụ, n’oge nke dmwetaghachi, na ibu amụma nye ndị Juu mgbe akpọkọtasịrị ha ma wusiwo obodo-ukwu nke Jerusalem en’ala nke ndị Nna ha.