Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 61


Nkeji 61

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, n’akụkụ Osimiri Missouri, McIlwaine’s Bend, 12 Ọugọst 1831 (History of the Church, 1:202–205). Na ilọta njem ha na Kirtland, Onye-amụma na ndị okenye iri ejeworịị mgbada Osimiri Missouri n’ụgbọ. N’ụbọchị nke atọ n’ije ahụ, ọtụtụ ihe egwu nile dakwasịrị ha. Okenye William W. Phelps, n’ọ́hụ̀ nke ehihie, hụrụ onye-mbibi ahụ ka ọ na-eje n’ike n’elu iru nke mmiri nile.

1–12, Onye-nwe enyewo iwu-ọkụ ime ọtụtụ mbịbị nile n’elu mmiri nile; 13–22, Mmiri nile a ka Jọn bụrụ ọnụ, ma onye-mbibi ahụ na-agba n’elu iru ha; 23–29, Ụfọdụ nwere ike inye mmiri nile iwu; 30–35, Ndị-Okenye ga-eje abụọ na abụọ ma kwusaa ozi-ọma; 36–39, Ha ga-akwado maka ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ.

1 Lee, ma n̄aa-ntị nye olu onye ahụ nke nwere aike nile, onye site na mgbe nile na-adigide ruo na mgbe nile na-adigide, ọbụna bAlfa na Omega, mmalite na ọgwụgwụ.

2 Lee, n’ezie otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu, O unu ndị-okenye nke nzukọ-nsọ m, ndị gbakọrọ n’ebe a, ndị agbagharaworo mmehie unu ugbụ a, n’ihi na mụ, Onye-nwe, ana-agbaghara mmehie nile, ma a dị m bobi ebere nye ndị nke ckwupụtara mmehie ha nile jiri obi nile dị umeala;

3 Mana n’ezie a sị m unu, na ọ dịghị mkpa na igwe ndị-Okenye nke m nke a na-eje ngwa ngwa n’elu mmiri nile, mgbe ndị bi n’akụkụ abụọ ya na-ala n’iyi n’ekweghị-ekwe.

4 Otu o sila dị, a tara m ahụhụ ahụ ka unu gbaa ama; lee, e nwere ọtụtụ ihe egwu n’elu mmiri nile, ma nke ka nke ma emesịa;

5 N’ihi na mụ, Onye-nwe, enyewo iwu-ọkụ n’iwe m ọtụtụ mbibi n’elu mmiri nile; e, ma nke ka nke n’elu mmiri ndị a nile.

6 Otu o sila dị, anụ arụ nile dị n’aka m, ma onye ahụ nke kwesịrị ntụkwasị-obi n’etiti unu a gaghị ala n’iyi site na mmiri nile.

7 Ya mere, ọ dị mkpa na nwa odibo m Sidney Gilbert na nwa odibo m aWilliam W. Phelps ga-eme ọsọ-ọsọ n’ije-ozị ma na mgbasa ozi-ọma ha.

8 Otu o sila dị, a gaghị m ekwe ka unu gbasasịa ruo mgbe a ataworo unu ahụhụ n’ihi mmehie unu nile, ka unu bụrụ otu, ka unu ghara ịla n’iyi n’ime bajọọ-omume;

9 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m, ọ dị m mkpa ka unu gbasasịa. Ya mere ka ụmụ odibo m Sidney Gilbert na William W. Phelps were ndị-otu ha mbụ, ma ka ha gaa njem ha ọsọ-ọsọ ka ha wee rụzuo ọrụ mgbasa ozi-ọma ha, ma site n’okwukwe ha ga-enwe mmeri;

10 Ma ọbụrụraa na ha ekwesị ntụkwasị-obi a ga-edota ha, ma mụ, Onye-nwe, ga anọnyere ha.

11 Ma ka nke fọdụrụ were nke ahụ dị mkpa maka akwa-oyiyi.

12 Ka nwa odibo m Sidney Gilbert werekwa ihe ndị ahụ na-adighị mkpa, dịka unu ga-ekwekọrịta.

13 Ma ugbụ a, lee, maka aọdịmma nke unu e nyere m unu biwu-nsọ gbasara ihe ndị a ma mụ, Onye-nwe, ga-atụgharị uche mụ na unu dịka ọ dịirị ndị mmadụ n’oge mgbe ochie.

14 Lee, mụ, Onye-nwe, na mmalite gọziri ammiri nile; kama n’ụbọchị ndị ikpe-azụ a, site n’ọnụ nwa odibo m Jọn, babụrụ m mmịrị nile ọnụ.

15 Ya mere, ụbọchị ndị ahụ na-abịa mgbe n’onweghị anụ arụ ga-enwe nchekwa n’elu mmiri nile.

16 Ma a ga-ekwu ya n’ụbọchị ndị na-abịa na ọ dịghị onye nwere ike ịgbago n’obodo nke Zaịọn n’elu mmiri nile, kama onye ahụ nke guzozịrị n’obi.

17 Ma, dịka mụ, Onye-nwe na mmalite abụrụ ala ọnụ, ọbụna otu a n’ụbọchị ndị ikpe-azụ ka m gọziwọro ya, n’oge ya, maka iji rụọ ọrụ nke ndị-nsọ m, ka ha wee soro keta oke uru si na ya.

18 Ma ugbụ a enye m unu iwu-nsọ na ihe m kwuru nye otu onye e kwuru m ya nye mmadụ nile, ka unu dọọ ụmụnne unu aka na ntị gbasara mmiri nile a ka ha ghara ịbịa site n’ije njem n’elu ha, ka okwukwe ha ghara ịda ma jide ha n’ọnya nile;

19 Mụ, Onye-nwe, enyewo iwu-ọkụ, ma onye-mbibi na-agba n’elu iru ya, ma akagbụghị m iwu-ọkụ a.

20 Mụ, Onye-nwe, were iwe megide unu unyahụ, kama taa iwe m a tụgharị-pụwo.

21 Ya mere, ka ndị ahụ o gbasara ndị ahụ m kwuworo, ndị ga-aga njem ha ọsọ-ọsọ—ọzọ a sị m unu, ka ha gaa njem ha ọsọ-ọsọ.

22 Ma onweghị ihe ọpụtara nye m, ma nwa oge nta gasịrị, ma ọbụrụ na ha ejezuo mgbasa ozi-ọma ha, ma ha jere site na mmiri ma-ọbụ site n’ala; ka nke a dịrị dịka a na-ekpughere ha dịka mkpebi ha nile sirị dị ma emesịa.

23 Ma ugbụ a, gbasara ụmụ odibo m, Sidney Rigdon, Joseph Smith Nta, na Oliver Cowdery, ka ha ghara ịbịa njem ọzọ n’elu mmiri nile nanị ma-ọbụ n’opi-mmiri mgbe ha na-ala n’ụlọ ha nile; ma-ọbụ n’asụsụ ọzọ ha agaghị abia n’elu mmiri nile, ịga njem, nanị ma-ọbụ n’elu opi mmiri ahụ.

24 Lee, mụ, Onye-nwe, ahọpụtawo ụzọ maka ije nke ndị-nsọ m; ma lee, nke a bụ ụzọ—na mgbe ha ga-ahapụ opi mmiri ha ga-esi n’ala, ọbụrụraa na e nyere ha iwu-nsọ ịga njem ma ga-ruo n’ala nke Zaịọn;

25 Ma ha ga-eme dịka ụmụ nke Israel, ana-arụnye ụlọ-ikwuu ha nile n’ogologo ụzọ ahụ.

26 Ma, lee, iwu-nsọ nke a ka unu ga-enye ụmụnna unu nile.

27 Otu o sila dị, onye ọbụla e nyere aike ịchị mmiri nile, onye ahụ ka e nyere site na Mụọ ịmata ụzọ ya nile;

28 Ya mere, ka o mee dịka Mụọ nke Chineke dị ndụ dụziri ya, ma-ọbụ n’elu ala ma-ọbụ n’elu mmiri nile, dịka ọ fọdụrụ mụ ime ma-emesịa.

29 Ma unu ka e nyere ụzọ njem nke ndị-nsọ nile, ma-ọbụ ụzọ nke ndị-nsọ nile nke ebe izu-ike nke Onye-nwe, ịga njem.

30 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, ndị odibo m, Sidney Rigdon, Joseph Smith, Nta, na Oliver Cowdery, agaghị emepe ọnụ ha n’ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ ruo mgbe ha ga-abịaru Cincinnati;

31 Ma n’ebe ahụ ha ga-ewelite olu ha nile elu nye Chineke megide ndị ahụ, e, nye ya onye iwe ya dị ọkụ megide ajọọ-omume ha, mmadụ ndị ana-achamiwo nke ọma maka mbibi.

32 Ma site n’ebe ahụ ka ha gaa njem maka ọgbakọ nile nke umunna ha, n’ihi ọrụ ha nile ọbụna ugbụ a ka a chọrọ karịa n’etiti ha karịa n’etiti ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ.

33 Ma ugbụ a, gbasara ndị fọdụrụ, ka ha gaa njem ma akwupụta okwu ahụ n’etiti ọgbakọ nile nke ndị ajọọ mmadụ, ọbụruraa dịka e nyere ya;

34 Ma ọbụrụraa na ha emee nke a ha aga-asachapụ uwe-nsọ nile, ma ha agaghị enwe ntụpọ n’iru m.

35 Ma ka ha jeekọta ma-ọbụ aabụọ abụọ, otu o si masị ha nanị ka nwa odibo m Reynolds Cahoon, na nwa odibo m Samuel H. Smith, onye ihe ya dị m ezi nma, ghara ịnọ iche-iche ruo mgbe ha laghachiri n’ụlọ ha nile, ma nke a maka ihe nke mụ onwe m maara.

36 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, ma ihe m kwuru nye otu onye ekwuru m nye mmadụ nile, nọọ n’ezigbo ọn̄ụ, aụmụ-ntakịrị; n’ihi na a nọ m bn’etiti unu, ma a chapụghị m kwa unu;

37 Ma ọ bụrụraa na unu emewo onwe unu umeala n’iru m, ngozi nile nke aala-eze ga-abu nke unu.

38 Kee ihe-okike n’ukwu gị ma nọrọ na anche ma nwee anya udo, na-ele anya maka ọbịbịa nke Ọkpara nke Mmadụ, n’ihi na ọ ga-abịa n’oge awa unu na-echeghi.

39 aKpee ekpere oge nile ka unu ghara ịba n’ime bọnwụnwa, ka unu nwee ike ịnọrọ ụbọchị nke ọbịbịa ya, ma-ọbụ na ndụ ma-ọbụ n’ọnwụ. Ọbụna otu a. Amen.