Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 71


Nkeji 71

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Hiram, Ohio, 1 Disemba 1831 (History of the Church, 1:238–239). Onye-amụma nọgịdere n’ịtụgharị-asụsụ nke Bible ya na Sidney Rigdon na dịka onye-ode akwụkwọ rue mgbe a natara mkpughe nke a, n’oge nke a kwusịrị nwa-oge-nta ka ha nwee ike imezu ntuzi-aka e nyere n’ebe a. Ụmụnna nwoke ga-apụ ikuzi ozi-ọma iji kwụsị mmetụta obi ọjọọ nile nke maliteworo imegide Nzukọ-nsọ maka mbipụta nke edemede n’akwụkwọ-akụkọ ụfọdụ nke Ezra Booth dere, onye nke gọnarịworo okwukwe.

1–4, Joseph Smith na Sidney Rigdon ka e zipụrụ ịma-ọkwa nke ozi-ọma; 5–11, Ndị-iro nke Ndị-nsọ ga-enwe mgbagwọ-ju-anya.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu ndị odibo m Joseph Smith, Nta, na aSidney Rigdon, na oge abịawo n’ezie mgbe o kwesịrị ma dị kwa mkpa nye m na unu ga-emepe ọnụ unu bn’ịma ọkwa nke ozi-ọma m, ihe ndị nke ala-eze na-akọwadaru-ala ihe comimi nile nke si n’akwụkwọ-nsọ nile, dịka akụkụ nke ahụ nke Mụọ na ike nke a ga-enye unu siri dị, ọbụna dịka m chọrọ.

2 N’ezie, a sị m unu maa nụ ọkwa nye ndị ụwa na mpaghara nile gbara gburu-gburu, ma kwa n’ime Nzukọ-nsọ, n’otu oge, obụna rue mgbe a ga-eme ka unu mata.

3 N’ezie nke a bụ ije-ozị nke otu oge, nke m na-enye unu.

4 Ya mere, rụọ nụ ọrụ n’ime ubi vine m. Kpọkuo nụ ndị nile bi n’ụwa, ma gbaa-ama, ma mezie ụzọ maka iwu-nsọ nile na mkpughe nile nke ga-abịa.

5 Ugbụ a, lee nke a bụ amamihe; onye nke gụrụ, ka ọ aghọta ma bnabatakwa;

6 N’ihi na nye onye ahụ nke nabatara ya ka a ga-enye an’uju karịa, ọbụna ike.

7 Ya mere, agbagwọjuo ndị-iro unu anya; kpọkuo ha ka ha bbịakwute unu ma n’iru ọha ma na nzuzo; ma ọbụrụ na unu ekwesị ntụkwasị-obi ihere ha ga-apụta ihe.

8 Ya mere, kwee nụ ka ha weta echiche ha nile siri ike imegide Onye-nwe.

9 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu—na onweghị angwa-agha ọbụla akpụworo i megide unu ga-eme nke ọma;

10 Ma ọbụrụ na onye ọbụla ewelite olu ya imegide unu a ga-eme ka o nwere mgbagwọ-ju-anya n’oge nke m.

11 Ya mere, debe nụ iwu-nsọ m nile; ha bụ ezi-okwu ma kwesị ntụkwasị-obi. Ọbụna otu a. Amen.