Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 6


Nkeji 6

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Oliver Cowdery, na Harmony, Pennsylvania, Epril 1829 (History of the Church, 1:32–35). Oliver Cowdery bidoro ọrụ ya dịka onye ode-akwụkwọ na ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, 7 Epril 1829 O nwetaworịị aka-ebe nke mụọ maka ezi-okwu nke ọgbụgba-ama nke onye-amụma gbasara epekele ahụ ebe akanyere ndekọta nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Onye-amụma jụrụ Onye-nwe site na Urim na Tumim ma nweta ọzịza nkea.

1–6, Ndị-ọrụ n’ime ubi nke Onye-nwe ga-enweta nzọpụta; 7–13, O nweghị onyinye karịrị onyinye nzọpụta; 14–27, Aka-ebe nke ezi-okwu na-abịa site n’ike nke Mụọ; 28–37, Lekwasị Kraịst anya, ma mee iheọma esepụghị-aka.

1 Oke ọrụ dị aịtụ n’anya na-achọ ịpụta-ìhè rute ụmụ nke mmadụ.

2 Lee, a bụ m Chineke; gee ntị an’okwu m, nke dị ndu di kwa ike, bdị nkọ karịa mma-agha ọbụla nke nwere iru abụọ, ruo n’ịkewa ma njikọ ọkpụkpụ ma ụmị; ya mere gee ntị n’okwu m nile.

3 Lee, aụbị ahụ chara-acha na-echere owuwe ihe-ụbị; ya mere, onye chọrọ ịghọ, ka ọ tụba mma iwe ihe-ubi ya n’ike ya, ma ghọọ mgbe oge dị, ka ọ wee kpadokọtara mkpụrụ obi ya nzọpụta nke mgbe nile na-adigide n’ime ala-eze nke Chineke.

4 E, onye ọbụla aga-atụba mma iwe ihe-ubi ya ma ghọọ, onye ahụ ka Chineke kpọrọ.

5 Ya mere, ọ bụrụ na unu aga-arịọ m unu ga-anata; ọbụrụ na unu ga-akụ-aka a ga-emeghe-kwara unu.

6 Ugbụ a, dịka ị jụworo, lee, asị m unu, debe iwu-nsọ m nile, ma achọọ iwepụta ma hiwe ụzọ nke bZaịọn.

7 aA chọla bakụ na ụba kama chọọ camamihe, ma lee, dihe-omimi nile nke Chineke ka aga-egosi gị, ma mgbe ahụ ka a ga-eme ka ị baa ọgaranya. Lee, onye ahụ nke nwere endụ ebighi-ebi bụ ọgaranya.

8 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, ọbụna otu ahụ i si chọọ n’aka m otu ahụ ka ọ ga-adịrị gị; ma ọbụrụ na ị chọọ, ị ga-abụ ụzọ nke ime nnukwu ihe-ọma n’ọgbọ nke a.

9 Ekwụla ihe ọbụla ma ọbụghị anchegharị nye ọgbọ nke a; debe iwu-nsọ m nile, ma nyee aka iwepụta ọrụ nke m, dịka iwu-nsọ m nile siri dị, ma ị ga-abụ onye a gọzịrị-agọzị.

10 Lee ị nwere onyinye, ma ngọzi na-adịrị gị n’ihi onyinye gị. Cheta na ọ adị-nsọ ma sikwa n’elu bịa—

11 Ma ọbụrụ na ị aga-ajụ, ị ga-amata bihe-omimi nile dị nnukwu na ịtụ n’anya; ya mere ị ga-etinye conyinye gị n’ọrụ, ka i wee chọpụta ihe-omimi nile, ka i nwee ike ịkpọbata ọtụtụ na mmatazu nke ezi-okwu, e, ddoo ha anya bụ mmehie dị n’ụzọ ha nile.

12 Ekwela ka ndị ọzọ mata onyinye gị m’ọbụghị ndị gị na ha nọ n’otu okwukwe. Ejila ihe nile adị nsọ ka ihe efu.

13 Ọbụrụ na ị ga-eme ihe-ọma, e, ama kwesị bntụkwasị-obi ruo cọgwụgwụ, a ga-azọpụta gị n’ala-eze nke Chineke, nke bụ nke kachasị n’onyinye nile nke Chineke; n’ihi na ọdịghị onyinye karịrị onyinye nke dnzọpụta.

14 N’ezie, n’ezie, a sị m gị, ngọzi ga-adịrị gị n’ihi ihe ị meworo; n’ihi na ị ajụworo mụ, ma lee, dịka ọtụtu mgbe ị jụworo ị nataworo ntụzi-aka nke Mụọ m. A sị na ọbụghị otu a, ị garaghị abịaru n’ebe a ị nọ n’oge nkea.

15 Lee, ị matara na ị jụwo m ajụjụ ma e mere m ka auche gị mata; ma ugbua anam-agwa gị ihe ndị a nile ka ị wee mara na Mụọ nke ezi-okwu emewo ka ị mata;

16 E, a gwa m gị, ka ị wee mara na onweghị onye ọzọ n’abụghị nanị Chineke nke amatara uche gị nile na nzube nile nke bobi gị.

17 A na m agwa gị ihe ndịa dịka ihe aka-ebe nye gị—ma okwu nile ma-ọbụ ọrụ nke ị nọ na-ede bụ aezi-okwu.

18 Ya mere arusie ọrụ ike; bnyere nwa odibo m Joseph aka, na-ikwesi ntụkwasị-obi, n’ụdị ọnọdụ ihe-isi-ike nile ọbụla o nwere ike ịbanye n’ihi okwu ahụ.

19 Baa mba n’iri mpe ya nile, nakwa nabatakwa ịba mba nke ya. Nwee ndidi; nwee anya udo; jisikwa onwe gị ike; nwee ndidi, okwukwe, olile-anya na afọ-ọma.

20 Lee, gị bụ Oliver, ma agwawo m gị okwu maka ọchịchọ gị nile; ya mere akpadokọta okwu ndị a n’obi gị. Kwesị ntụkwasị-obi ma na-arụsị ọrụ ike n’idebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma a ga m ewere aka nke ihu-n’anya m gbaa gị gburu gburu.

21 Lee, a bụ m Jisus Kraịst, aỌkpara nke Chineke. A bụ m onye ahụ bịakwutere nke bm, ma nkem anabataghị m. A bu m cìhè ahụ na-amụke dn’ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ aghọtaghị ya.

22 N’ezie, n’ezie, a si m gị, ọbụrụ na ị chọọ ihe aka-ebe ọzọ, kpọrọ uche gị gaa n’abalị ahụ ị kwaara mụ akwa n’ime obi gị, ka ị wee mara amaka ezi-okwu dị n’ihe ndị a.

23 Ọ bụ na mụ ekwughị audo nye obi gị gbasara okwu a? Gịnị bụ baka-ebe dị nnukwu ị ga-enweta karia site n’aka Chineke?

24 Ma ugbua, lee, ị natawo ihe aka-ebe; n’ihi ọbụrụ na m agwawo gị ihe nile nke n’enweghị mmadụ ọbụla maara ya, ọ bụ na ị nwetabeghi ihe aka-ebe?

25 Ma, lee, e nyewo m gị onyinye, ọbụrụ na ị chọrọ ịnata m, aịtụgharị-asụsụ, ọbụna dịka nwa odibo m Joseph.

26 N’ezie, n’ezie, a sị m gị na e nwere aakụkọ-ndekọta nile nke nwere ọtụtụ nke ozi-ọma m, nke ejichiworo n’ihi bajọọ-omume nke ụmụ mmadụ;

27 Ma ugbụ a e nye m gị iwu, na ọbụrụ na i nwee ọchịchọ nile dị mma—ọchịchọ nke ikpadokọtara onwe gị akụ nile n’elu-igwe—mgbe ahụ ka ị ga-enye aka iwepụta n’ìhè, site n’onyinye gị, akụkụ aAkwụkwọ nsọ m nile ndị nke e zoro n’ihi ajọọ-omume.

28 Ma ugbụ a, lee, e nye m gị, ma kwa nwa odibo m Joseph, ọtụghe-ụzọ nile nke onyinye nke a, nke ga-ewepụta n’ìhè mgbasa-ozi nke a; ma n’ọnụ andị-aka-ebe abụọ ma-ọbụ atọ ka a ga ehiwe mkpụrụ-okwu ọbụla.

29 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, ọ buru na ha ajụ okwu m nile, na akụkụ nkea nke ozi-ọma m na mgbasa-ozi m, ngọzi na-adịrị unu, n’ihi na ha agaghị eme nye unu karịa nke ha mere nye m.

30 Ma ọbụrụ na ha aeme nye unu ọbụna dịka ha meworo nye m, ngọzi na-adịrị unu, n’ihi na mụ na unu bga-anọ cn’ebube.

31 Kama ọ bụrụ na ha aajughị okwu m nile, nke a ga-ehiwe site bn’ịgba-ama nke a ga-enye, ngọzi na-adịrị ha, ma mgbe ahụ ka unu ga-enwe ọn̄ụ n’ime mkpụrụ nke ọrụ unu nile.

32 N’ezie, n’ezie, a sị m unu, dịka m gwara ndị na-eso-ụzọ m, ebe mmadụ abụọ ma-ọbụ atọ azukọworo n’aha m, dịka gbasara otu ihe, lee, n’ebe ahụ ka m ga-anọ bn’etiti ha—ọbụna otu ahụ ka m nọ n’etiti unu.

33 Unu aatụla egwu ime ihe-ọma, ụmụ m ndịkom, n’ihi na mkpụrụ ọbụla mmadụ bna-akụ, nke ahụ ka ọ ga-aghọkwa, ya mere, ọbụrụ na i kụọ mkpụrụ ọma ị ga-aghọta ihe-ọma ka ụgwọ-ọrụ gị.

34 Ya mere, atula egwu, igwe-anụ nta; mee ihe-ọma; ka ụwa na ala-mụọ gwakọta megide gị, n’ihi na ọbụrụ na e wuru unu n’elu aoke nkume m, ha agaghị emeri unu.

35 Lee, a naghị m ama unu ikpe; gaanụ n’ụzọ unu nile ma unu aemehiekwala ọzọ; rụọ nụ n’anya udo ọrụ nke m nyeworo unu n’iwu.

36 aLekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi-abụọ, atụla ụjọ.

37 aLee mmerụ-arụ nile nke dụpuru akụkụ m, nakwa apa bntu nile nọ n’aka m abụọ ma n’ukwu m abụọ; kwesi ntụkwasị-obi, debe iwu-nsọ m nile, ma unu cga-eketa dala-eze nke elu-igwe. Amen.