Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 83


Nkeji 83

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Independence, Missouri, 30 Epril 1832 (History of the Church, 1:269–270). Mkpughe nke a ka a natara dịka Onye-amụma na ụmụnna ya ndị nwoke nọ na kansụl.

1–4, Ndị nwanyị na ụmụ-ntakịrị nwere ihe ruru ha n’ebe ndị di ha na ndị nna ha nọ maka nkwado ha; 5–6, Ụmụ nwanyị ndị di ha nwụrụ na ụmụ-ntakịrị na-enweghi nne na nna nwere ihe ruru ha n’ime Nzukọ-nsọ maka nkwado ha.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwụrụ, na mgbakwụnye n’iwu nile nke nzukọ-nsọ gbasara ụmụ nwanyị na ụmụ-ntakịrị, ndị bụ ndị nke nzukọ-nsọ, ndị di ha ma-ọbụ nna ha anwụworo:

2 Ụmụ nwanyị nwere aihe ruru ha n’ebe di ha nọ maka nkwado ha, ruo mgbe a ga-ewere di ha; ma ọbụrụ na ahụtaghị ha ka ndị njehie ha ga-enwe mmekọrịta na nzukọ-nsọ.

3 Ma ọbụrụ na ha ekwesịghị ntụkwasị-obi ha agaghị enwe mmekọrịta na nzukọ-nsọ; kama ha nwere ike ịnọrọ n’ihe nketa ha nile dịka iwu nile nke ala ahụ siri dị.

4 aỤmụ-ntakịrị nile nwere ihe ruru ha n’ebe nne na nna ha nọ maka nlekọta ha ruo mgbe ha tozuru oke.

5 Ma mgbe oge ahụ gasịrị ha nwere ihe ruru ha site n’aka nzukọ-nsọ, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ an’ụlọ akụ nke Onye-nwe, ọbụrụ na nne na nna ha enweghi ihe iji nye ha ihe-nketa nile.

6 Ma ụlọ-akụ ahụ ka a ga-edebe site na nnyefechasị nile nke nzukọ-nsọ; ma ụmụ anwanyị ndị di ha nwụrụ na ụmụ-ntakịrị n’enweghi nne na nna ga-enwe, ihe e dotaara ha dịka kwa bndị ogbenye. Amen.