Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 93


Nkeji 93

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 6 Mee 1833 (History of the Church, 1:343–346).

1–5, Mmadụ nile ndị kwesịrị-ntụkwasị-obi ga-ahụ Onye-nwe; 6–18, John gbara-ama na Nwa nke Chineke gara site n’amara rue n’amara rue mgbe ọ natara uju nke ebube nke Nna; 19–20, Ndị kwesịrị ntụkwasị-obi, na-aga site n’amara rue n’amara, ga kwa anata site n’uju nke ya; 21–22, Ndị ahụ a mụrụ site na Kraịst bụ Nzukọ-nsọ nke Onye e Burụ Uzọ mụọ; 23–28, Kraịst natara uju nke ezi-okwu nile, ma mmadụ site na nrube-isi ga-enwe ike ime otu ahụ; 29–32, Mmadụ na Chineke nọ na mmalite; 33–35, Ihe nile e jiri mee ihe na-adị ruo mgbe ebighi-ebi, ma mmadụ ga-enwe ike ịnata uju nke ọn̄ụ na Mbilite n’ọnwụ; 36–37, Ebube nke Chineke bụ akọn’uche; 38–40, Ụmụ-ntakịrị a daghị iwu n’iru Chineke n’ihi mgbapụta ahụ nke Kraịst; 41–53, Ụmụ nna ndị nwoke ndị na-edu nzukọ-nsọ ka e nyere iwu ka ha dozie ezi na ụlọ ha n’usoro.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru: Ọ ga-eru na mkpụrụ-obi ọbụla nke ahapụrụ mmehie ya nile ma bịakwute m, ma bna-akpọku aha m, ma cna-erube kwa isi n’olu m, ma na-edebe kwa iwu-nsọ m nile, dga-ahụ eiru m ma mata na a bụ m;

2 Ma na a bụ m ezi aìhè ahụ nke na-enye mmadụ nile na-abịa n’ime ụwa ìhè;

3 Ma na a nọ m an’ime Nna, ma na Nna nọ kwa n’ime m, na mụ na Nna bụ ọtụ—

4 Nna an’ihi na o bnyere m site n’uju ya, ma Ọkpara n’ihi na a nọrọ m n’ime ụwa ma mee canụ arụ ụlọ-ụka nke m, ma biri n’etiti ụmụ nke mmadụ.

5 A nọrọ m n’ime ụwa ma na-anata site na Nna m, ma aọrụ nke ya nile ka e gosipụtara n’ụzọ dị mfe ịghọta.

6 Ma aJọn hụrụ ma gbaa ama nke uju nke bebube m, na uju nke ama nke cJọn ga-abụ ihe a ga-ekpughe ma e mesịa.

7 Ma ọ gbara ama, na-asị: A hụrụ m ebube ya, na ọ nọọrọ na ammalite, tụtụ ụwa a nọrọ;

8 Ya mere, na mmalite aOkwu ahụ dị, n’ihi na ọ bụ ya bụkwa Okwu ahụ, ọbụna onye-ozi ahụ nke nzọpụta—

9 aỊ̀hè ahụ na bOnye-mgbapụta nke ụwa; Mụọ ahụ nke ezi-okwu, onye bịara n’ime ụwa, n’ihi na ọ bụ ya kere ụwa, ma n’ime ya ka ndụ nke ndị mmadụ na ìhè nke ndị mmadụ dị.

10 Ụwa nile bụ ya akere ha; mmadụ nile bụ ya kere ha; ihe nile ka e kere site n’aka ya, ma site na ya, ma siri na ya.

11 Ma mụ, Jọn, na-agba ama na a hụrụ m ebube ya, dịka ebube nke Onye Nna Mụrụ Nanị Ya, jupụtara n’amara ma n’ezi-okwu, ọbụna Mụọ nke ezi-okwu nke bịara ma biri n’anụ arụ, ma biri n’etiti anyị.

12 Ma mụ, Jọn hụrụ na ọ nataghị an’uju ya na mbụ, mana ọ natara bamara maka amara;

13 Ma ọ nataghi site n’uju ya na mbụ, mana ọ nọgidere site an’amara ruo n’amara, ruo mgbe ọ natara uju ya.

14 Ma site otu a ka a kpọrọ ya aỌkpara nke Chineke, n’ihi na ọ natagh n’uju ya na mbụ.

15 Ma mụ aJọn, na-agba ama, ma lee, elu-igwe nile ka e meghere, ma bMụọ Nsọ rịdatara n’elu ya n’ụdị nke cnduri ma nọrọ n’elu ya, ma olu dara site n’elu-igwe na-asị: Nke a bụ Ọkpara nke m dhụrụ n’anya.

16 Ma mụ Jọn na-agba ama na ọ natara uju nke ebube nke Nna ahụ;

17 Ma ọ natara aike bnile, ma n’elu igwe ma n’ụwa, ma ebube ahụ nke cNna nọnyere ya, n’ihi na ọ nọ kwa n’ime ya.

18 Ma ọ ga-eru, na ọ bụrụ na i kwesị ntụkwasị obi ị ga-anata uju nke ndepụta nke Jọn.

19 E nye m unu okwu ndia nile ka unu wee nwee ike ghọta ma mata otu kwesịrị iji afee-ofufe, ma mata ihe ị na-efe ofufe, ka i nwee ike ịbịakwute Nna n’aha m, ma n’ozuzu oge nke m nata uju nke ya.

20 N’ihi na ọ bụrụ na unu edebe aiwu-nsọ m nile unu ga-anata buju nke ya, ma nata cotuto n’ime m dịka m n’ime Nna; ya mere, a sị m unu, unu ga-anata damara n’ihi amara.

21 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, a nọ m na ammalite mụ na Nna, ma a bụ m bOnye e Buru Ụzọ mụọ;

22 Ma ndị nile ahụ nke amụrụ site na m bụ andị-nketa nke bebube otu-ụdi ahụ, ma bụrụ nzukọ-nsọ nke Onye e Burụ Ụzọ mụọ.

23 Unu nọ kwarịị na mmalite unu ana Nna; nke ahụ nke bụ Mụọ, ọbụna Mụọ ahụ nke ezi-okwu;

24 Ma aezi-okwu bụ bmmata nke ihe nile dịka ha dị, ma ka ha dịịrị, ma dịka ha ga-adị n’oge na-abịa;

25 Ma ihe ọbụla dị aelu karịa ma-ọbụ dị-ala karịa nke a bụ mụọ nke ajọọ onye ahụ onye bụ bonye ụgha site na mmalite.

26 Mụọ ahụ nke aezi-okwu bụ nke Chineke. A bụ m Mụọ nke ezi-okwu, ma Jọn gbara ama maka m, na-asị: Ọ natara uju nke ezi-okwu, e, ọbụna ezi-okwu nile;

27 Ma onweghị onye na-anata auju ewezuga ma ọ na-edebe iwu-nsọ ya nile.

28 Onye ahụ nke ana-edebe iwu-nsọ ya nile na-anata ezi-okwu na bìhè, ruo mgbe ọ natara otuto site n’ezi-okwu ma cmazue ihe nile.

29 Mmadụ nọkwarịị na ammalite ya na Chineke. bAkọn’uche, ma-ọbụ ìhè nke ezi-okwu a bụghi ihe e kere-eke ma-ọbụ mee, ọbụghị ma-ọbụ n’ọ ga a bụ.

30 Ezi-okwu nile nwere onwe ha n’oghere ahụ nke Chineke dotara ya, ị arụ ọrụ maka onwe ya, dịka akọn’uche nile kwa; ma ọbụghị otu a onweghị ndụ dị.

31 Lee, nkea bụ aohere ịhọrọ nke mmadụ, ma nke a bụ amamikpe nke mmadụ, n’ihi na nke ahụ dị site na mmalite bụ nke egosipụtara n’ụzọ bdị mfe ịghọta nye ha, ma ha anataghị ìhè ahụ.

32 Ma mmadụ ọbụla nke mụọ ya n’anabataghị aìhè ahụ nọ n’okpuru amamikpe.

33 N’ihi na mmadụ bụ amụọ. bIhe nile e jiri mee ihe na-adị ruo mgbe ebighi-ebi, ma mụọ na ihe nile ejiri mee ihe, jikọrọ n’enweghi nkewa, na-anata uju nke ọn̄ụ;

34 Ma mgbe e akewapụrụ, mmadụ enweghi ike ịnata uju nke bọn̄ụ.

35 aIhe nile e jiri mee ihe bụ ụlọ-ụka nke Chineke; e, mmadụ bụ ụlọ-ụka nke Chineke, ọbụna btemple nile; ma temple ọbụla nke e merụrụ, Chineke ga-ebibi temple ahụ.

36 aEbube ahụ nke Chineke bụ bakọn’uche, ma-ọbụ n’okwu ọzọ, cìhè na ezi-okwu.

37 Ìhè na ezi-okwu na-agbanarị aajọọ-onye ahụ.

38 Mụọ ọbụla nke mmadụ nọ an’enweghi ụta na mmalite; ma Chineke mgbe ọ bgbapụtasịrị mmadụ site na cọdịda ahụ, ndị mmadụ bụrụ kwa ọzọ, n’ụdị nwata ha, dn’enweghi ụta n’iru Chineke.

39 Ma ajọọ onye ahụ bịara ma awerekwa ìhè na ezi-okwu ahụ, site na nnupụ-isi, sitere n’aka ụmụ nke mmadụ, na maka bomenala nke ndị nna ha.

40 Mana e nyewo m unu iwu ka unu zụlite aụmụ unu na ìhè ma n’ezi-okwu.

41 Mana n’ezie a sị m gị, nwa odibo m Frederick G. Williams, ị nogidewo n’okpuru amamikpe nkea;

42 I akụzirighị ụmụ gị ìhè na ezi-okwu, dịka iwu-nsọ nile siri dị; ma ajọọ onye ahụ nwere ike, dịka ugbụ a, megide gị, ma nke a bụ ihe kpatara nsogbu gị nile.

43 Ma ugbụ a iwu-nsọ ka m na-enye gị—ọbụrụraa na a ga-anapụta gị ị ga-edozi an’usoro ụlọ nke gị, n’ihi na ọtụtụ ihe dị nke n’ezighị-ezi n’ụlọ gị.

44 N’ezie, a sị m nwa odibo m Sidney Rigdon, na n’ụfọdụ ihe na o debeghị iwu-nsọ nile gbasara ụmụ ya; ya mere, buru ụzọ dozie ụlọ gị n’usoro.

45 N’ezie, a sị m nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, a ga m akpọ unu andị enyi, n’ihi na unu bụ ndị enyi m, na unu ga-enwe ihe nketa unu na m—

46 A kpọrọ m unu andị odibo maka ndị ụwa, ma unu bụ ndị odibo ha n’ihi m—

47 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m nye Joseph Smith, Nta—I debebeghi iwu-nsọ nile ahụ, ma kwesịrị iguzoro nara aịba-mba n’iru Onye-nwe;

48 aEzi na ụlọ gị kwesịrị ichegharị ma hapụ ụfọdụ ihe, ma n̄aa ezi ntị karịa nye okwu gị nile, ma-ọbụ ewezuga ha site n’ọnọdụ ha.

49 Ihe m na-ekwu nye otu onye ka m na-ekwu nye mmadụ nile; akpee ekpere oge nile ma-ọbụghị otua ajọọ-onye ahụ ga-enwe ike n’ime gị, ma wepụ gị site n’ọnọdụ gị.

50 Nwa odibo m Newel K. Whitney kwa, onye ụkọchukwu nke nzukọ-nsọ m, kwesịrị ka ataa ya ahụhụ, ma dozie n’usoro ezi na ụlọ ya, ma hụ na ha rụsiri ọrụ ike karịa ma nwee mmetụta n’ụlọ, ma na-ekpe ekpere oge nile, ma-ọbụ a ga-ewepụ ha site an’ọnọdụ ha.

51 Ugbụ a, a sị m unu, ndị enyi m, ka nwa odibo m Sidney Rigdon gawa na njem ya, ma mee ngwa ngwa, na kwa maa ọkwa afọ nke annabata nke Onye-nwe n’anara mmadụ nke ọma, na ozi-ọma nke nzọpụta, dịka m ga-enye ya nkwuwa okwu; ma site n’ekpere nke okwukwe unu jiri otu nkwekọrịta a ga m akwado ya.

52 Ma ka ụmụ odibo m Joseph Smith, Nta, na Frederick G. Williams mee kwa ngwa ngwa ma a ga-enye ha ọbụna dịka ekpere nke okwukwe siri dị; ma ọbụrụraa na unu edebe okwu m nile unu agaghị enwe mgbagwọ-ju-anya n’ụwa nke a, ọbụghị ma-ọbụ n’ụwa nke na-abia.

53 Ma, n’ezie a sị m unu, na ọ bụ uche m ka ị mee ngwa ngwa an’ịtụgharị asụsụ akwụkwọ-nsọ m nile, na binweta cmmata nke akụkọ, na maka mba nile, na ala-eze nile, na iwu nile nke Chineke na mmadụ, ma ihe nile nke a maka nzọpụta ahụ nke Zaịọn. Amen.