Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 89


Nkeji 89

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 27 Februarị 1833 (History of the Church, 1:327–329). Maka ụmụ nna nwoke ndị mbụ na-an̄ụ anwụrụ n’ọgbakọ ha nile, Onye-amụma ka e duuru ịtụgharị uche maka ihe ahụ; site na nke a, ọ jụrụ Onye-nwe gbasara ya. Mkpughe nke a, nke a matara dịka Okwu nke Amamihe, bụ nsonazụ ya. Ama-okwu atọ ndị mbụ ka e dere na mbụ dịka okwu mmalite na nkọwa ka Onye-amụma nwetara site na nkwalite nke mụọ.

1–9, Ihe eji mmanya eme, ihe ọn̄ụn̄ụ nile siri ike, anwụrụ ihe ọn̄ụn̄ụ nile dị ọkụ ka amachiri; 10–17, Ahịhịa ọhịa nile, mkpụrụ-osisi nile, anụ, na akụkụ-ubi ka a gọziri maka oriri nke mmadụ na nke anụmanụ nile; 18–21, Nrube-isi nye iwu nke ozi-ọma, tinyere Okwu nke Amamihe, na-eweta ngọzi nile nke arụ na nke mụọ.

1 aOkwu nke Amamihe, maka nrite uru nke ndị kansụl nke ndị isi nchụ-aja, ndị zukọrọ na Kirtland, na ndị nzukọ-nsọ, na kwa ndị-nsọ nọ na Zaịọn—

2 Ka e zipụrụ ha ozi ekele; ọbụghị n’ụzọ ịwụ-nsọ ma-ọbụ mmagide, kama site na mkpughe na okwu nke amamihe, na-egosipụta usoro na aechiche nke Chineke n’ime nzọpụta nke arụ nke ndị-nsọ nile n’ụbọchị ndị ikpe-azụ a—

3 Nke e nyere n’ihi ụkpụrụ nke nwere ankwa, nke a nabatara na inwe nnagide nke ndị n’adịghị ike na ndị kachasị n’adịghị ike n’etiti bndị-nsọ, ndị bụ ma-ọbụ e nwere ike ịkpọ ha ndị nsọ.

4 Lee, n’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu: N’ihi aihe ọjọọ nile na atụmatụ nile nke nọ ma nke ga-anọ n’obi nile nke ndị bna-agba izuzu ihe ọjọọ n’ụbọchị ndị ikpe-azụ a, a cdọwo m unu aka na ntị, ma maa ọkwa ịdọ unu aka na ntị, site n’inye unu okwu nke amamihe nke a site na mkpughe—

5 Na ọbụrụra na onye ọbụla an̄ụọ ammanya ma-ọbụ ihe ọn̄ụn̄ụ na-aba n’anya n’etiti unu, lee ọ dịghị mma, ọbụghị ihe kwesịrị ekwesị n’iru nke Nna unu, nanị n’ịkpọkọta onwe unu ọnụ inyefe oriri-nsọ unu nile n’iru ya.

6 Ma, lee, nke a ga-abụ mmanya, e, aezigbo mmanya nke mkpụrụ-osisi grape nke vine, nke unu mere n’aka unu.

7 Ma ọzọ, aihe ọn̄ụn̄ụ na-aba n’anya abụghị maka afọ, kama maka nsacha nke arụ unu nile.

8 Ma ọzọ, anwụrụ abụghị maka aarụ, ọbụghị ma-ọbụ maka afọ, ma o dịghị mma maka mmadụ, kama-ọbụ ahịhịa maka ebe emerụrụ arụ nile na ehi nile nọ n’orịa, nke a ga-eji mee-ihe na ikpe na ime nka.

9 Ma ọzọ, ihe ọn̄ụn̄ụ nile dị ọkụ abụghị maka arụ ma-ọbụ afọ.

10 Ma ọzọ n’ezie a sị m unu, aahịhịa ọhịa nile kwesịrị oriri ka Chineke gọziri maka ndozi, ọdịdị, na nke mmadụ ga-eji mee ihe—

11 Ahịhịa ọhịa ọbụla na mgbe ya, na mkpụrụ osisi ọbụla na mgbe ya, ihe ndia nile ka a ga-eri jiri ịkpachapụ anya na ainye ekele.

12 E, aanụ arụ nke banụ ọhịa kwa na nke anụ-ufe nile nke ikuku, mụ, Onye-nwe, gọziworo maka mmadụ ijiri mee ihe n’inye ekele; otu o sila dị a ga na-eri ha cnke nta nke nta;

13 Ma o dị mma nye m ka a ghara iri ha, ewezuga n’oge oke oyi, ma-ọbụ nke oyi, ma-ọbụ ụnwụ.

14 aAkụkụ-ubi nile ka a gọziri maka nri nke mmadụ na nke anụ ọhịa nile, ka ọ bụrụ nkpa-n’aka nke ndụ, ọbụghị nanị maka mmadụ mana n’ihi anụ ọhịa nile nke ubi, na anụ ufe nile nke elu-igwe, ma anụmanụ nile nke oke ọhịa nke na-agba-ọsọ ma-ọbụ na-akpụ n’elu ala;

15 Ma ndia ka Chineke mere maka nri nke mmadụ, nanị n’oge nile nke ụnwụ na mgbe agụụ karịrị.

16 Akụkụ-ubi nile dị mma maka nri nke mmadụ; dịka kwa mkpụrụ-osisi nke vine, nke ahụ nke na-amịpụta mkpụrụ-osisi, ma ọbụ n’ime ala ma-ọbụ n’elu ala—

17 Otu o sila dị, mkpụrụ akụkụ ọka maka mmadụ, ma ọka maka oke ehi, na oats maka ịnyịnya, na raị maka anụ ufe nile ma n’ihi ezi, ma n’ihi anụ ọhịa nile nke ubi, ma balị maka anụ bara uru, na maka mmanya dị juu, dịka kwa akụkụ-ubi ndị ọzọ.

18 Ma ndị-nsọ nile ndị chetara idebe ma mee ihe ndia e kwuru, na-aga na nrube-isi nye iwu-nsọ nile, ga-anata aarụ-ike n’otubo ha, na ụmị nye ọkpụkpụ ha nile;

19 Ma ha ga-achọta aamamihe na nnukwu akụ nile nke bnmụta, ọbụna akụ nile nke zoro-ezo;

20 Ma ha aga-agba ọsọ, ike agaghị-agwụ ha, ma ha ga-aga ije ma ha agaghị, ada mba.

21 Ma mụ, Onye-nwe, na-ekwe ha otu ankwa, na mụọ-ozi nke mbibi bga-agafe n’akụkụ ha, dịka ụmụ nke Israel, ma ghara igbu ha. Amen.