Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 43


Nkeji 43

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, na Februarị 1831 (History of the Church, 1:154–156). N’oge nke a ụfọdụ ndị-otu nke Nzukọ-nsọ nwere nsogbu site n’aka ndị mmadụ ndị na-adọ ịbụ ndị mkpughe. Onye-amụma jụrụ Onye-nwe ma nata okwu nke a ekwuru nye ndị okenye nke Nzukọ-nsọ. Akụkụ nke mbụ na-ekwu maka ọchịchị Nzukọ-nsọ, akụkụ nke ikpe-azụ bụ ịdọ-aka-na-ntị nke ndị okenye nye mba nile nke ụwa.

1–7, Mkpughe nile na iwu-nsọ nile na-abịa nanị site n’aka onye a họpụtara; 8–14, Ndị-nsọ nile ka e doro-nsọ site n’ime ihe nile n’ịdị-nsọ n’iru Onye-nwe; 15–22, Ndị okenye ka e zipụrụ iti-mkpu nchegharị ma jikere ndị mmadụ maka nnukwu ụbọchị nke Onye-nwe; 23–28, Onye-nwe na-akpọ ndị mmadụ site n’olu nke ya ma site n’ihe ike nile nke okike; 29–35, Oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa puku afọ na ike-agbụ nke Setan ga-abịa.

1 O n̄aa-ntị, unu ndị okenye nke Nzukọ-nsọ m. Ma gee nụ ntị n’okwu nile nke m kwuru nye unu.

2 N’ihi na lee, n’ezie, n’ezie, a sị m unu, na unu anataworịị otu iwu-nsọ ka ọ bụrụ aiwu nye nzukọ-nsọ m, site n’aka ya onye nke m họpụtaworo nye unu ka ọ nata biwu-nsọ nile na mkpughe nile sitere n’aka m.

3 Ma nke a ka unu ga-ama n’ezie—na ọdịghị onye ọzọ a họpụtara nye unu ịnata iwu-nsọ nile na mkpughe nile rue mgbe a ga-ewere ya, ma ọbụrụ na ọ anọrọ n’ime m.

4 Mana n’ezie, n’ezie, a sị m unu na aonweghị onye ọzọ a ga-ahọpụta nye onyinye nke a ewezuga na ọ bụ site na ya; n’ihi na ọ bụrụ na a napụ ya, ọ gaghị enwe ike m’ọbụghị ịhọpụta onye ọzọ n’ọnọdụ ya.

5 Ma nke a ga-abụ iwu nye unu, na unu agaghị anata nkụzi nile nke onye ọbụla ga-abịa n’iru unu dịka mkpughe nile ma-ọbụ iwu nsọ nile;

6 Ma nke a ka m na-enye unu ka unu ghara ibu ndị e aduhiere, ka unu wee mata na ha abụghị site na m.

7 N’ihi n’ezie a sị m unu, na onye ọbụla e achiri echichi site na m ga-abata site bn’ọnụ ụzọ ama ma e chie ya echichi dịka m gwaworo unu na mbụ, ka unu kụzie mkpughe nile ndi ahụ unu nataworo ma ga-anata site na ya, onye nke m họpụtaworo.

8 Ma ugbua, lee, e nye m unu iwu-nsọ, na mgbe unu ga-agbakọta ọnụ, unu aga-akụzi na wulie onwe unu, ka unu wee mata ihe unu ga-eme ma duzie nzukọ-nsọ m, ihe unu ga-eme n’elu isi okwu ihe nile nke iwu m na iwu-nsọ m nile, nke m nyeworo.

9 Ma otu a, unu ga-abụ ndị akụziiri n’iwu nke nzukọ-nsọ m, ma bụrụ ndị aedoro-nsọ site na nke ahụ unu nataworo, ma unu ga-ejịkọ onwe unu ọnụ ime ihe n’ịdị nsọ nile n’iru m—

10 Na ọbụrụra na unu e mee nke a, a aga-atụkwasị ebube n’ala-eze nke unu nataworo. Ọbụrụra na unu emeghị nke a, a bga-ewere ya, ọbụna nke ahụ unu nataworo.

11 Sachapụ nụ aajọọ-omume nke dị n’etiti unu; doo nụ onwe unu nsọ n’iru m;

12 Ma ọbụrụ na unu achọọ ebube nile nke ala-eze, họpụta nụ nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ma akwado ya n’iru m site n’ekpere nke okwukwe.

13 Ma ọzọ, a sị m unu, na ọbụrụ na unu achọọ aihe omimi nile nke ala-eze, dotara nụ ya nri na uwe, na ihe ọbụla ọ chọrọ iji mezuo ọrụ nke m nyeworo ya n’iwu;

14 Ma ọbụrụ na unu emeghị ya ọ ga-anọgide nye ha ndị nabatara ya, ka m wee kwado nye onwe m ndị an’enweghi ntụpọ n’iru m.

15 Ọzọ a sị m, n̄aa ntị unu ndị okenye nke nzukọ-nsọ m, ndị m họpụtaworo: Ezipụghị unu ka a kụziere unu ihe, kama ka unu akụziere ụmụ nke mmadụ ihe nile nke m tinyeworo unu n’aka site n’ike nke bMụọ m.

16 Ma a aga-akụziri unu site n’elu. bSachaa nụ onwe unu ma a ga-eji ike cnye unu onyinye dị nsọ, ka unu wee nye ọbụna dịka m kwuworo.

17 N̄aa-nu ntị, n’ihi na, lee, annukwu bụbọchị nke Onye-nwe dịkwa nso.

18 N’ihi na ụbọchị ahụ na-abịa mgbe Onye-nwe ga-ekwu an’olu ya sịte n’elu-igwe; elu-igwe nile bga-eme mkpọtu ma ụwa cga-ama jijiji, ma dopi nke Chineke ga-ada ogologo oge ma dasikwa ike, ma ga-asị mba ndị nọ na-ụra: Unu ndị-nsọ nile ebilie ma dịrị ndụ; unu ndị mmehie fnọrọ nụ na-a grahụ-ụra ruo mgbe m ga-abịa ọzọ.

19 Ya mere kee ihe-okike n’ụkwụ gị nile, ka a ghara ịchọta gị n’etiti ndị ajọọ-mmadụ.

20 Welite olu unu nile elu ma egbochila. Kpọkuo mba nile ka ha chegharịa, ma okenye ma nwata, ma ohu ma ndị nwere onwe ha, na-asị: Jikere nụ onwe unu maka nnukwu ụbọchị ahụ nke Onye-nwe;

21 N’ihi ọbụrụ na mụ, onye bụ nwoke, na-ewelite olu m ma na-akpọ unu ka unu chegharịa ma unu na-akpọ m asị, gịnị ka unu ga-asị mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe aegbe elu-igwe nile ga-ekwu olu ha nile site na nsọtụ nile nke ụwa, na-ekwu nye ntị nile nke ndị dị ndụ, na-asị—Chegharịa, ma jikere maka nnukwu ụbọchị ahụ nke Onye-nwe?

22 E, ma ọzọ, mgbe amụma elu nile na-adọ akara ya site n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda anyanwụ, ma ga-ekwu olu ha nile nye ndị nile dị ndụ, ma mee ntị nile ọbụla ga-anụ ya zụọ wuruwuru, na-ekwu okwu nile ndị a—Chegharịa nụ, n’ihi na nnukwu ụbọchị nke Onye-nwe na-abịa?

23 Ma ọzọ, Onye-nwe ga-ekwu olu ya site n’elu-igwe, na-asị: N̄aa nụ ntị, O unu mba nile nke ụwa, ma nụrụ okwu nile nke Chineke onye kere unu.

24 O, unu mba nile nke ụwa, ugboro ole ka m kwesịrị ịkpọkọta unu ọnụ dịka annekwu-ọkụkọ na-esi achikọ ụmụ-ya n’okpuru nku ya abụọ, mana unu bachọghị!

25 Ugboro ole ka m akpọworo unu site n’ọnụ nke bndị odibo m, ma site na cnkwusa-ozi ọma nke ndị muo-ozi, ma site n’olu nke m, ma site n’olu nke egbe elu-igwe nile, na site n’olu amụma-elu nile, na site n’olu nke oke-ikuku mmiri nile na site n’olu nke ala-ọma jijiji nile, na nnukwu ụzụ mmiri na-enwe akụ mmiri igwe nile, na site n’olu dụnwụ nile na ajọọ-ọrịa nile n’ụdị ọbụla, na site na nnukwu ụda nke opi, na site n’olu nke ikpe, na site n’olu nke eebere n’ogologo ụbọchị nile, na site n’olu nke ebube na nsọpụrụ na akụ na ụba nile nke ndụ ebighi-ebi, ma gaara azọpụta unu n’ime nzọpụta fmgbe nile na-adigide, ma unu achọghị!

26 Lee, ụbọchị ahụ abịawo mgbe iko nke ọnụma nke iwe ọkụ m juru.

27 Lee, n’ezie a sị m unu, na ndị a bụ okwu nile nke Onye-nwe Chineke unu.

28 Ya mere, rụọ nụ ọrụ, arụọ nụ n’ụbị vine m maka oge nke ikpeazụ—maka oge nke ikpe-azụ kpọkuo ndị nile bi n’ụwa.

29 N’ihi na n’oge nke m ka m aga-abịa n’elu ụwa n’ikpe, ma ndị nke m ka a ga-agbapụta ma ga-esoro m chịa n’ụwa.

30 N’ihi na aOtu puku afọ ahụ Jisus ga-abịa n’ụwa chịa, nke m kwuworo site n’ọnụ ụmụ odibo m, ga-abịa:

31 N’ihi na aSetan ka a bga-eke agbụ, ma mgbe a tọpụrụ ya ọzọ, ọ ga-achị nanị cnwa-oge nta, mgbe ahụ ka dọgwụgụ nke ụwa ga-abịa.

32 Ma onye ọbụla nke biri an’ezi-omume bga-agbanwe n’otu ntabi-anya, ma ụwa nile ga-agafe otu ahụ dịka site n’ọkụ.

33 Ma ndị ajọọ-mmadụ ga-agapụ baa n’ime aọkụ na-anaghị ekwe mmenyụ, ma nsọtụ ha onweghị onye ma ya n’ụwa, ma-ọbụ ga-amata ya mgbe ọbụla, rụọ mgbe ha ga-abịa n’iru m bn’ikpe.

34 N̄aa nụ ntị n’okwu ndia. Lee, abụ m Jisus Kraịst, aOnye-nzọpụta nke ụwa. bChekwaa ihe ndịa nile n’obi unu nile, ma kwe ka cịdị mkpa nile nke mgbe ebighi-ebi dnọrọ en’uche unu nile.

35 Nwee aanya udo. Debe iwu-nsọ m nile. Ọbụna otu a. Amen.