Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 26


Nkeji 26

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, Oliver Cowdary, na John Whitmer, na Harmony, Pennsylvania, Julaị 1830 (History of the Church, 1:104). (Lee isi okwu nke Nkeji 24.)

1, Atụziiri ha aka ịmụ akwụkwọ-nsọ nile ma kwusaa ozi-ọma; 2, Iwu nke nkwekọrịta ka akwadoro.

1 Lee, a sị m unu na unu ga-enye aọmụmụ nke akwụkwọ nsọ nile oge unu, na ikwusa ozi-ọma, ma ịbịkwasị ndị mmadụ aka n’isi ime ha ndị otu nzukọ-nsọ na bColesville, ma ịrụ ọrụ ubi unu nile n’ala, dịka osi kwesi, ruo mgbe e mesịrị unu ga-aga na ọdịda anyanwụ ga nwee ọgbakọ nke na-eso, ma mgbe ahụ a ga-eme ka unu mara ihe unu ga-eme.

2 Ma ihe nile ka a ga-eme site na ankwekọrịta zuru ọnụ na nzukọ-nsọ, site na nnukwu ekpere na okwukwe, n’ihi ihe nile ka unu ga-anata site na okwukwe. Amen.