Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 62


Nkeji 62

Mkpụghe e nyere site n’aka Joseph Smith onye-amụma, akụkụ Osimiri Missouri na Chariton, Missouri, 13 Ọugọst 1831 (History of the Church, 1:205–206). N’ụbọchị nke a onye-amụma na ndị-otu ya, ndị nọ n’ụzọ ha site n’Independence ruo Kirtland, zutere ọtụtụ ndị-Okenye ndị nọ n’ụzọ ha ịgaru ala nke Zaịọn, na, mgbe ha kwesịrị ekele n’obi-ụtọ, nwetara mkpughe nke a.

1–3, Ama nile ka e dere ede n’elu-igwe; 4–9, Ndị-okenye nile ga-enye ma kwusaa dịka mkpebi ha siri dị ma dịka Mụọ si na-atụzi aka.

1 Lee, ma nụrụ, O unu ndị-okenye nke nzukọ-nsọ m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru, Ọbụna Jisus Kraịst, Onye ankwuchita-ọnụ unu onye maara adịghike nke mmadụ ma ụzọ esi benye aka nye ndị a cna-anwa ọnwụnwa.

2 Ma n’ezie anya m nile dịkwasịrị n’arụ ndị ahụ ruo ugbụ a n’ejeghi n’ala nke Zaịọn; ya mere mgbasa-ozi-ọma unu ezughịkwa oke.

3 Otu o sila dị, unu bụ ndị agọziri agozi, n’ihi na aama unu gbaworo ka bedekọtaworo n’elu-igwe ka ndị mụọ-ozi na-ele ha anya; ma ha na-an̄ụrị ọn̄ụ maka unu, ma cmmehie unu bụkwa ihe agbaghaworo unu.

4 Ma ugbụ a gaanụ n’iru na njem unu. Nweenụ ọgbakọ onwe unu n’ala nke aZaịọn; ma nweenụ nzụkọ ma n̄ụrịkọtanụ ọn̄ụ, ma nyenụ oriri-nsọ nye Onye-Kachasị Elu.

5 Ma mgbe ahụ unu nwere ike ịlọghachi ịgba ama, e, ọbụna unu nile, ma-ọbụ abụọ na abụọ, dịka ọ dị unu mma, ọdigh m mkpa; nanị kwesị ntụkwasị obi ma akwusaa ozi nile nke obi-ụtọ nye ndị bi n’ụwa, ma-ọbụ n’etiti ọgbakọ nile nke ndị ajọọ-mmadụ.

6 Lee, mụ, Onye-nwe akpọkọtawo unu ka e mezuo nkwa e kwere, ka e chekwaa ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’etiti unu ma n̄ụrịa nụ unu nile n’ala nke Missouri. Mụ, Onye-nwe ekwewo ndị kwesịrị ntụkwasị obi nkwa ma apụghị m ikwu aokwu ụgha.

7 Mu, Onye-nwe, dị na njikere, ọ bụrụ onye ọbụla n’etiti unu chọrọ ịgba n’elu ịnyịnya nile, ma-ọbụ n’elu ịnyịnya mule nile, ma-ọbụ n’elu ụgbọ-ala nile, ọ ga-enweta ụdị ngozi a, ọ bụrụ na ọ nata ya site n’aka nke Onye-nwe, n’obi nke aekele n’ihe nile.

8 Ihe ndị a ga a dịịrị unu ime dịka mkpebi na ntụzi-aka nile nke Mụọ siri dị.

9 Lee, aala-eze ahụ bụ nke unu. Ma na lee, ma hụrụ, a bnonyeere m ndị kwesịrị ntụkwasị obi oge nile. Ọbụna otu a. Amen.