Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 24


Nkeji 24

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Oliver Cowdery, na Harmony, Pennsylvania, Julaị 1830 (History of the Church, 1:101–103). Ọbụ e zie na odi-ala karia ọnwa anọ gasiworo site na mgbe ehiwere Nzukọ-nsọ mkpagbu bịara sie ike ma ndị ndu bidoro chọọ nchekwa mgbe ụfọdụ. Mkpụghe atọ ndị a na-eso bu ndị e nyere n’oge ndị a iji gbaa ume, janye ike, ma nye ha ndụmọdụ.

1–9, Joseph Smith ka a kpọrọ ịtụgharị asụsụ, ikwusa ozi-ọma, na ịkọwadaruo-ala akwụkwọ nsọ nile; 10–12, Oliver Cowdery ka a kpọrọ ikwusa ozi-ọma; 13–19, E kpughere iwu metụtara ọrụ ebube nile, ọbụbụ ọnụ nile, itichapụ uzuzu dị n’okpuru ụkwụ onye, na ị ga-n’ejighi akpa ego ma-ọbụ akpa ije.

1 Lee, a kpọwọ gị ma họpụtawo gị ide Akwụkwọ nke Mọmọn, ma nye ije ozi nke m, ma e buliwokwa m gị elu pụọ na mkpagbu gị nile, a dụwo m gị ọdụ, nke bụ na a napụtawo gị site n’aka ndị-iro gị nile, ma a napụtawo gị site n’ike nile nke Setan ma site na ọchịchịrị!

2 Otu osila dị, i nweghị ngọpụ na anjehie gị nile; otu osila dị, gaa nke gị ma emehiela ọzọ.

3 aBulite ọkpụkpọ gị; ma emesịa mgbe ikụchara n’ubi gị ma chekwaa ha, gaa ngwa ngwa na Nzukọ-nsọ dị na bColesville, Fayette, na Manchester, na ha cga-enyere gị aka ma a ga m agozi ha ma na nke mụọ ma na nke arụ;

4 Kama ọ bụrụ na ha anabataghị gị; a ga m ezitara ha ọbụbụ-ọnụ n’ọnọdụ ngọzi.

5 Ma i ga-anọgide n’akpọ Chineke n’aha m, ma na-ede ihe nile nke a ga-enye gị site n’aka aOnye-nkasị-obi, ma ịkọwadaruo ala akwụkwọ-nsọ nile nye Nzukọ-nsọ.

6 Ma a ga-enye gị n’oge ahụ ihe i aga-ekwu ma dee, ma ha ga-anụ ya, ma-ọbụ a ga m ezitara ha ọbụbụ-ọnụ n’ọnọdụ ngọzi.

7 N’ihi na ị ga-enyeferịrị aịgba-mbọ gị nile n’ime Zaịọn, ma nime nke a ka ị ga-enwe ume.

8 Nwee andidi n’ime bmkpagbu nile, n’ihi na ị ga-enwe ha ọtụtụ, kama ị cga-anagide ha, n’ihi lee, Mu onwe m nọnyeere gị ọbụna rụọ dn’ọgwụgwụ ụbọchị gị nile.

9 Ma n’ọrụ nile nke arụ ị gaghị enwe ume, n’ihi na nke a abụghị ọkpụkpọ gị. Kpachapụ anya an’ọkpụkpọ gị ma ịga-enwe ihe ị chọrọ iji bulite ọkpụkpọ gị ma n’ịkọwadaru akwụkwọ-nsọ nile ma ga-n’iru n’ibịkwasị aka n’isi ma n’eme ndị otu nile ndị nzukọ-nsọ.

10 Ma nwanne gị nwoke Oliver ga a ga-n’iru n’ebu aha m n’iru ụwa, makwa nye ndị Nzukọ-nsọ. Ma ọ gaghị eche na ya ga-ekwu nke zuru oke na ihe gbasara ọrụ m ma lee, a nọnyere m ya ruo ọgwụgwụ.

11 N’ime m ka ọ ga-enwe ebube, ma ọbụghị nke onwe ya, ma-ọbụ n’adịghị ike ma-ọbụ n’ume, ma-ọbụ n’oru ma-ọbụ n’inwere onwe;

12 Ma mgbe nile, ma n’ebe nile, ọ ga-emehepụ ọnụ ya ma akwupụta ozi-ọma m dịka iji olu nke bopi, ma n’ehihie ma n’abali, ma a ga m enye ya ume dịka ụdị nke ana-amaghị n’etiti ndị mmadụ.

13 Achọla aọrụ ebube nile ewezuga ma m ga-enye unu biwu, ewezuga cịchụfu dekwensu nile; eịgwọ ndị-ọrịa, ma megide fagwọ-ọtanye nsi nile, ma megide nsi ọbụla na-ebute ọnwụ nile;

14 Ma aihe ndị a nile ka unu n’agaghị eme, ma ọbụghị ma a chọrọ ya n’aka unu site na ndị chọrọ ya, ka e mezue akwụkwọ nsọ nile n’ihi unu ga-eme dịka ihe ahụ edere ede.

15 Ma n’ebe ọbụla unu abara, ma ha anabataghị unu n’aha m, unu ga-ahapụ ọbụbụ-ọnụ n’ọnọdụ ngọzi, site na ịtịchapụ buzuzu dị n’okpuru ụkwụ unu megide ha dịka ihe ịgba-ama, ma sachapụ ụkwụ unu n’akụkụ ụzọ.

16 Ma ọ ga-eru na ndị ọbụla nke ga-emetu unu aka n’obi ụfụ, unu ga-enye iwụ ka emekpaa ha arụ n’aha m; ma lee, a ga m emekpa ha arụ, dịka okwu unu siri dị, na mgbe oge nke m.

17 Ma onye ọbụla ga-akpọ unu gaa n’iwu ga-enweta ọbụbụ ọnụ site n’iwụ.

18 Ma unu a gaghị eji aakpa ego ma-ọbụ akpa-ije ma-ọbụ uwe-ime abuọ, n’ihi na Nzukọ-nsọ ga-enye unu n’ime oge ahụ kpọm-kwem, ihe unu chọrọ maka nri na akwa oyiyi, ma akpụkpọ-ụkwụ nile na ego, ma akpa ije.

19 N’ihi na a kpọrọ unu aibecha ubi-vine m jiri oke mbecha, e, ọbụna nke ikpe azụ; e, makwa ndị nile ahụ bi chiri echichi ma ha ga-eme ọbụna dịka ihe nlere anya nke a. Amen.