Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 1


Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile

Nkeji 1

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, mgbe e nwere ọgbakọ ọpụrụ-iche nke ndị-okenye nke Nzukọ-nsọ, e mere na Hiram, Ohio, 1 Novemba 1831 (History of the Church, 1:221–224). E nwetawo ọtụtụ mkpụghe site n’aka Onye-nwe tutu oge a, mana nchịkọta nke mkpụghe ndị a maka mbipụta n’ụdị akwụkwọ bụ otu isi-ọkwu pụtara ìhè anakweere n’ọgbakọ a. Nkeji nke a bụ okwu-mmalite nke Onye-nwe nye ozizi nile, ọgbụgba-ndụ nile, na iwu-nsọ nile e nyere ọgbọ nke ugbụ a.

1–7, Okwu nke ịdọ-aka-na-ntị na-adara mmadụ nile; 8–16, Ngọnarị okwukwe na ajọọ-omume ga-abịa tutu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ; 17–23, A kpọrọ Joseph Smith ka ọ wetaghachi n’ụwa nke a ezi-okwu nile na ikike nile nke Onye-nwe; 24–33, E wepụtara Akwụkwọ nke Mọmọn na hiwekwa ezi Nzukọ-nsọ ahụ; 34–36, Udo ka aga ewepụ site n’ụwa; 37–39, Nyochaa iwu-nsọ ndị a.

1 N̄aa-ntị, O unu ndị anzukọ-nsọ m, ka olu onye ahụ bi n’elu kwuru, na onye banya ya nile nọ n’elu mmadụ nile, e n’ezie a sị m: cN̄aa ntị unu ndị si ebe dị anya; na unu nọ n’ala nile ọke osimiri gbara gburu gburu, gekọta nụ ntị.

2 N’ihi n’ezie aolu nke Onye-nwe na-adara ụmụ mmadụ nile, ma enweghi bonye ga-agbapụ; ma ọdịghị anya nke na-agaghị ahụ, ma-ọbụ ntị nke na-agaghị anụ; ma-ọbụ cobi nke a na-agaghị aba n’ime ya.

3 Ma ndị annupụ-isi ka a ga-adụpu n’iru-uju dị-ukwuu; n’ihi na ajọọ-omume nile ha ka a bga-ekwupụta n’elu-ụlọ nile, na omume nzuzo ha nile ka a ga-ekpughepụ.

4 Ma aolu nke ịdọ-aka-na-ntị na-adara mmadụ nile, site n’ọnụ nile nke ndị na-eso ụzọ m, ndị m họpụtawororịị bn’ụbọchị ndị ikpe-azụ a.

5 Ma ha ga-agapụ, ma enweghi onye ga-egbochi ha, n’ihi na mụ Onye-nwe nyere ha iwu.

6 Lee, nke a bụ aikike m, na ikike ndị odibo m, na okwu mmalite m, nke akwụkwọ iwu-nsọ m nile, nke m nyeworo ha bịma-ọkwa nye unu, O ndị bi n’elu ụwa.

7 Ya mere, atụọ nụ ụjọ maakwa nụ jịjịjị, O unu ndị mmadụ, n’ihi na ihe mụ Onye-nwe nyere n’iwu-ọkụ n’ime ha bga-emezurịrị.

8 Ma n’ezie a sị m unu, na ndị ga-agagharị, iburu ozi-ọma ndị a nye ndị nile bi n’elu ụwa, e nyere ha ike airachị ma n’ụwa ma n’elu-igwe, ndị n’ekweghị-ekwe na bndị nnupụ-isi;

9 E, n’ezie, irachikọta ha ruo n’ụbọchị a ga-awụsa aoke iwe nke Chineke na-enweghị atụ n’elu bndị ajọọ mmadụ—

10 Ruo an’ụbọchị ahụ Onye-nwe ga-abịa bịkwụghachi onye ọbụla dịka cọrụ ya siri dị, ma dtụọrọ onye ọbụla dịka o si tụọrọ mmadụ ibe ya.

11 Ya mere, olu nke Onye-nwe na-agaru nsọtụ nile nke ụwa, ka ndị nile ga-anụ nwee-ike-ịnụ:

12 Kwadobe nụ, kwadobe nụ maka nke ahụ ga-abịa n’ihi na Onye-nwe dị nso;

13 Ma a kpalitawo aiwe nke Onye-nwe, ma a sachawo bmma-agha ya n’elu-igwe, ma ọ ga-adakwasị, ndị bi n’ụwa.

14 Ma aogwe-aka nke Onye-nwe ka a ga-ekpughepụ; ma ụbọchị ahụ na-abịa na ha bụ ndị na-agaghị banụ olu nke Onye-nwe, ma-ọbụ olu ndị odibo ya, ma-ọbụ cn̄aa ntị n’okwu nile nke ndị-amụma na ndị-ozi nile, a dga-ebepụ ha site n’etiti ndị mmadụ ahụ;

15 N’ihi na ha aakpafuwo site bn’emume-nso m nile, ma cmebiwo dọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide m;

16 Ha anaghị aachọ Onye-nwe ihiwe ezi-omume ya, mana onye ọbụla na-aga bn’ụzọ nke cya; ma na-achụso dụdị chi nke ya, nke ụdị ya nọ n’oyiyi nke ụwa, na nke ihe-eji kpụọ ya bụ nke arụsi akpụrụ-akpụ, nke ena-aka nka ma ga-ala n’iyi na fBabịlọn, ọbụna Babịlọn ukwu ahụ, nke ga-ada.

17 Ya mere, mụ Onye-nwe, ebe m maara ọdachi ga-adakwasị ammadụ nile bi n’ime ụwa, kpọrọ odibo m Joseph Smith, Nta, ma gwa ya okwu site n’elu-igwe, ma nyekwa ya iwu-nsọ nile;

18 Ma kwa nye ndị ọzọ iwu-nsọ nile, ka ha maa okwa ihe ndia nile nye ụwa; ma ihe nkea nile ka e nwee ike mezuo ya, nke bụ ihe e dere site n’aka ndị-amụma—

19 aIhe na-adịghị-ike nile nke ụwa ga-apụta ma bibie ihe ndị dị nnukwu ma sie ike, ka mmadụ ghara ịdụ mmadụ ibe ya ọdụ, ma-ọbụ btụkwasị obi n’aka nke anụ-arụ—

20 Mana ka onye ọbụla nwee ike akwuo n’aha nke Chineke Onye-nwe, ọbụna Onye-nzọpụta nke ụwa;

21 Ka okwukwe nwe-ike ịbawanye n’ime ụwa;

22 Ka e nwee ike ihiwe aọgbụgba-ndụ mgbe nile na-adigide m;

23 Ka e nwee ike aikwusa uju nke bozi-ọma m site n’aka ndị cna-adịghị ike na ndị dị mfe ruo na nsọtụ nke ụwa ma n’ịrụ ndi-eze na ndị-ọchịchị.

24 Lee, a bụ m Chineke ma e kwuwo m ya; aiwu-nsọ ndị a bụ nke m, ma e nyere ha ndị odibo m n’ime adịghi-ike ha, n’ụdị basụsụ ha ka ha wee bịa na cnghọta.

25 Ma ọbụrụ na ha mejọrọ a ga-eme ka ọ pụta ìhè;

26 Ma ọbụrụ na ha chọrọ aamamihe a ga-enye ha;

27 Ma ọbụrụ na ha mehiere a aga-eti ha ihe otiti, ka ha wee bchegharịa;

28 Ma ọbụrụ na ha nwere aumeala a ga-eme ka ha sie ike, ma a gọziekwa ha site n’elu, ma nata bọmụma-ihe site n’oge ruo n’oge.

29 Ma mgbe ọ natasịrị akụkọ-ndekọta nke ndị Nifaị, e, ọbụna nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ga-enwe ike ịtụgharị-asụsụ site n’ebere nke Chineke, site n’ike nke Chineke, aAkwụkwọ nke Mọmọn.

30 Na kwa ka ndị ahụ e nyere iwu-nsọ nile, nwee aike ịtọ ntọ-ala bnzukọ-nsọ nkea, na kwa iwepụta ya ìhè site n’ebe nzuzo na site cn’ọchịchịrị, bụ nanị ezi dnzukọ-nsọ ahụ dị ndụ n’elu iru nke ụwa nile, bụ nke mụ, bụ Onye-nwe, enwere mmasị na ya, na-ekwuru nzukọ-nsọ nile ejikọtara ọnụ ma na ọbụghị n’otu n’otu—

31 N’ihi na mụ Onye-nwe enweghị ike iji inwe-ohere kachasị-ntakịrị lekwasị ammehie anya;

32 Otu osila dị, onye ọbụla nke chegharịrị ma dobe kwa iwu-nsọ nile nke Onye-nwe ga-enwetarịrị amgbaghara;

33 Ma onye ahụ nke an’echegharịghị, site na ya ka a bga-anapụ ọbụna ìhè nke ahụ ọ nataworo; n’ihi na cMụọ nkem agaghị danọgide ya na mmadụ oge nile, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị-agha kwuru.

34 Ma ọzọ, n’ezie a sị m unu, O ndị bi n’elu ụwa: Mụ Onye-nwe dị na njikere ime ka ihe ndia nile pụta ìhè nye aanụ-arụ nile;

35 N’ihi na abụghị m onye ana-ele mmadụ anya n’iru, ma chọrọ ka mmadụ nile mata na bụbọchị ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ; ma awa ahụ erubeghị, mana ọ dịkwa n’ọba-aka, mgbe a ga-ewepụ cudo site n’etiti ụwa, ma dekwensu ahụ ga-enwe ike n’ebe ọchịchị ndị nke ya nọ.

36 Ma ọzọ Onye-nwe ga-enwe ike n’ebe andị-nsọ ya nọ, ma bga-achị cn’etiti ha, ma ga arịdakwa dn’ikpe n’elu eỊdumia, ma-ọbụ ụwa.

37 Nyochaa nụ aiwu-nsọ ndia nile, n’ihi na ha bụ ezi-okwu ma kwesị ntụkwasị-obi, ma ibu-amụma nile na bnkwa nile ndị nọ n’ime ha ga-emezụrịrị.

38 Ihe mụ bụ Onye-nwe kwuru, e kwuwo m, ma a naghị m ewezuga onwe m, ma asị-na elu-igwe nile na ụwa gabiga, aokwu m agaghị agabiga, mana ha nile bga-emezurịrị, ma-ọbụ site cn’olu nke m ma-ọbụ site n’olu dụmụ odibo m, ọ bụ eotu ihe ahụ.

39 N’ihi na lee, ma hụrụ, Onye-nwe bụ Chineke, ma aMụọ ahụ na-agba-ama, ma ama ahụ bụ ezi okwu, ma bezi okwu ahụ na-adịgide ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.