Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 85


Nkeji 85

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 27 Novemba 1832 (History of the Church, 1:298–299). Nkeji nke a bụ ihe e depụtara site n’akwụkwọ-ozi nke Onye-amụma degara W.W. Phelps, onye bi na Independence, Missouri. E nyere ya iji zaa ajụjụ nile gbasara Ndị-nsọ ndị ahụ kwapụrụ gaa Zaịọn mana ndị n’enwetabeghi ihe-nketa dịka usoro e hiwere n’ime Nzukọ-nsọ.

1–5, Ihe nketa nile nke Zaịọn ka a ga-enweta site na nnyefechasị; 6–12, Otu onye dị ukwuu ma dị ike ga-enye Ndị-nsọ nile ihe nketa ha na Zaịọn.

1 Ọ Bụ ọrụ dịrị onye-ode-akwụkwọ nke Onye-nwe, onye ọ họpụtara, idebe akụkọ, na andekọta zuru ọha nke nzukọ-nsọ nke ihe nile na-eme na Zaịọn, na maka ndị ahụ nile nke bna-enyefechasị arịa ha nile, ma nata ihe-nketa nile iwu kwadoro, site n’aka onye ụkọchukwu;

2 Na kwa ụdị ndụ ha na-ebi, okwukwe ha, na ọrụ ha nile; na kwa maka ndị dapụrụ n’okwukwe ndị na-agọnarị okwukwe ha mgbe ha natasịrị ihe-nketa ha nile.

3 Ọ na-emegide uche na iwu-nsọ nke Chineke na ndị n’enwetaghị ihe nketa ha site na annyefechasị, dịka iwu ya kwadoro, nke o nyeworo, ka o wee naa ndị ya botu ụzọ n’ụzọ iri, iji jikere ha maka ụbọchị ahụ nke cịbọ-ọbọ na nrepịa, kwesịrị ka e denye aha ha nile ha na ndị nke Chineke.

4 Ọbụghị ma a ga-edota akụkọ-agbụrụ ha, ma-ọbụ enwee ha n’ebe a ga-achọta ya na nke ọbụla n’ime ndekọta nile ma-ọbụ akụkọ nke nzukọ-nsọ.

5 Aha ha nile ekwesịghị ka a chọta, ọbụghị ma-ọbụ aha nile nke ndị nna ha, ma-ọbụ aha nile nke ụmụ ha ebe e dere ha an’akwụkwọ nke iwu nke Chineke, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha kwuru.

6 E, otu a ka olu ahụ adị nwayọ dị kwa ntakịrị kwuru, nke na-ataka ụka gamie ma bna-akpọpu ihe nile, ma ọtụtụ mgbe nile na-eme ka ọkpụkpụ m nile maa-jijiji mgbe dịka ọ na-egosipụta, na-asị:

7 Ma ọ ga-eru na mụ, Onye-nwe Chineke, ga-ezipu otu onye dị ukwuu na dị ike, ji mkpan’aka nke ike n’aka ya, e yikwasịrị ìhè ka ihe mgbochi, onye ọnụ ya ga-ekwu okwu nile, okwu nile nke ebighi-ebi; ebe afọ ya nile ga-abụ isi mmiri nke ezi-okwu, idozi n’usoro ụlọ nke Chineke, na ihazi site na-inye ha nza ihe-nketa nile nke ndị-nsọ ndị a chọtara aha ha, na aha nile nke ndị nna ha, na nke ụmụ ha, e debara n’ime akwụkwọ nke ịwụ ahụ nke Chineke;

8 Ebe onye ahụ, nke Chineke kpọrọ ma họpụta, nke na-esetipụ aka ya idozi aigbe nke Chineke, ga-ada site n’akụ nke ọnwụ, dịka osisi nke akụ amụma a hụrụ anya tidara.

9 Ma ha nile ndị n’achọtaghị ebe e dere aha ha an’akwụkwọ nke ncheta a gaghị achọta ihe-nketa ọbụla n’ụbọchị ahụ, mana a ga-ekewasị ha, ma oke ha ka a ga-enye ha n’etiti ndị n’ekweghị-ekwe, ebe bịkwa-arịrị na ịta ikikere eze dị.

10 Ihe ndia nile ekwughị m na nke onwe m; ya mere, dịka Onye-nwe kwuru, ọ ga kwa emezu.

11 Ma ha ndị bụ nke Ọkwa Nchụ-aja nke dị Elu, ndị a n’achọtaghị ebe e dere aha ha an’akwụkwọ nke iwu, ma-ọbụ ndị a chọpụtara na ha bagọnarịwo okwukwe, ma-ọbụ ndị a cchụpụrụ site na nzukọ-nsọ, na kwa ndị ọkwa nchụ-aja dị nta, ma-ọbụ ndị-otu, n’ụbọchị ahụ a gaghị achọta ihe-nketa n’etiti ndị-nsọ nke Onye Kachasị Elu.

12 Ya mere, a ga-emere ha dịka ụmụ nke onye nchụ-aja ahụ, dịka a ga-achọta ebe e dekọtara ya n’isi nke abụọ na ama-okwu iri isii na otu na abụọ nke akwụkwọ nke Ezra.