Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 137


Nkeji 137

Ọ́hụ̀ e nyere Joseph Smith Onye-amụma n’ime temple na Kirtland, Ohio, 21 Jenuarị 1836 (History of the Church, 2:380–381). Oge ahụ bụụrụ nleba anya nke emume-nsọ nile nke onyinye nsọ dịka e kpugheworo ha.

1–6, Onye-amụma hụrụ nwanne ya nwoke Alvin n’ime ala-eze nke selestịal; 7–9, Ozizi nke nzọpụta nye ndị nwụrụ-anwụ ka e kpughere; 10, Ụmụaka nile ka a zọpụtaworo n’ime ala-eze nke selestịal.

1 aElu-igwe nile meghere nye anyị, na m wee hụ ala-eze bselestịal nke Chineke na ebube nke dị na ya, ma anọ cn’arụ ma-ọbụ pụta site n’arụ enweghị m ike ịkọ.

2 M wee hụ ịdị nma nke karịrị akarị nke aọnụ-ụzọ-ama ahụ ebe ndị nketa oke nke ala-eze ahụ ga-esi banye, nke dịka bire ọkụ gbara okirikiri;

3 Nakwa oche-eze nke Chineke nke ana-enwu ka ọkụ na-ere ere ebe bNna na cỌkpara ahụ na-anọdụ n’elu ya.

4 M wee hụ okporo ụzọ ọma nile nke ala-eze ahụ nke nwere oyiyi ihe akpụrụ n’ọrụ aka nke aọla-edo.

5 M wee hụ Nna aAdam na bAbraham; na cnna m na dnne m, nwanne m nwoke eAlvin, nke dawororị n’ụra ogologo oge;

6 Ma o juru m anya otu o si bụrụ na o nwetawo aòkè n’ime ala-eze ahụ, ọ hapuwororị ndụ nke a tutu Onye-nwe e setipụ aka ya ikpọkọta Israel nke bugboro abụọ, na o cmeghị baptism n’ihi nsachapụ mmehie nile.

7 Otu a ka aolu-okwu nke Onye-nwe bịakwutere m na-asị: Ka ha ra bụ ndị nwụworo bna-amaghị maka ozi-ọma nke a, ndị gaara anata ya ma ọbụrụ na ekwere ka ha nọgide, ga-abụ cndị nketa òkè nke ala-eze dselestịal nke Chineke;

8 Otu aka ahụ kwa ka ha ra bụ ndị ga-anwụ site ugbu a gawa na-amataghị ya ndị agaara anata ya n’obi ha nile, ga-abụ ndị nketa òkè nke ala-eze ahụ;

9 N’ihi na mụ bụ Onye-nwe, aga-ekpe mmadụ nile ikpe dịka bọrụ ha nile siri dị, dịka cọchịchọ nke obi ha nile siri dị.

10 Na m wee hụkwa na ụmụ-ntakịrị nile ndị nwụrụ tutu ha eruo aafọ nke nkọwasị ka a bzọpụtara n’ime ala-eze selestịal nke elu-igwe.