Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 107


Nkeji 107

Mkpughe maka ọkwa nchụ-aja, e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, n’ụbọchị 28 Maach 1835 (History of the Church, 2:209–217). N’ụbọchị a akpọrọ aha, Iri na Abuọ ahụ zukọrọ na kansụl, na-ekwupụta na otu na otu adịgh-ike ha na a maghị-eme nile, na-ekwupụta nchegharị na na-achọ nduzi-ọzọ nke Onye-nwe. Ha chọọrọ ịgbasa gawa izisa ozi-ọma ebe nile ezigara ha. Ọbụ ezie na ufọdụ akụkụ na nkeji nke a ka anatara n’ụbọchị a akpọrọ aha, akụkọ ndekọta nile gosiri na ụfọdụ akụkụ ndị ọzọ ka-anatara n’oge dị iche-iche, ụfọdụ n’oge dịka mbido Novemba 1831.

1–6, E nwere ọkwa nchụ-aja abụọ; nke Melkizedek na nke Erọn; 7–12, Ndị ahụ ji ọkwa nchụ-aja Melkizedek nwere ike ịduzi n’ọkwa-ọrụ nile n’ime Nzukọ-nsọ; 13–17, otu-ndị Ụkọchukwu, nọ n’isi nke Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn, nke na-elekọta emume nsọ nile ana ahụ anya; 18–20, Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek ji ọtụghe ụzọ nile nke ngọzi nile nke mụọ; Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn ji ntụghe nile nke nkwusa ozi nke ndị mụọ-ozi; 21–38, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, Iri na Abụọ ahụ, na ndị Iri Asaa ahụ mejupụtara ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke nọ n’isi, nke mkpebi ha nile ka a ga-eme na n’idi na-otu na ezi omume; 39–52, Ehiwere usoro nke onye-isi ezi na ụlọ site na Adam ruo na Noah; 53–57, Ndị-nsọ mgbe ochie zukọtara na Adam-ondi-Ahman, na Onye-nwe gosiri ha onwe ya; 58–67, Ndị Iri na Abuọ ahụ ka ọdịrị ịhazi ndị-ọrụ nzukọ-nsọ n’usoro; 68–76, Ndị ụkọchukwu ga-arụ ọrụ dịka ndị ikpe ọha na Israel; 77–84, Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na ndị Iri na Abuọ ahụ ga-abụ ụlọ-ikpe kasị ukwuu na Nzukọ-nsọ; 85–100, Ndị-isi ọkwa onye nchụ-aja ga eduzi otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka ha n’ọtụ n’otu.

1 Enwere, n’ime nzukọ-nsọ, ọkwa nchụ-aja abụọ, n’ikpọ ha aha, nke aMelkizedek na bnke Erọn, ma-ọbụ Ọkwa Nchụ-aja nke Livaị.

2 Ihe mere eji kpọọ nke mbụ Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek bụ na aMelkizedek bụụrụ nnọọ nnukwu onye isi nchụ-aja.

3 Tutu oge ya a naara akpọ ya Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ, n’ịgbaso aUsoro ahụ nke Ọkpara nke Chineke.

4 Mana site na nkwanye ugwu ma-ọbụ ansọpụrụ nye aha nke Onye-Kachasị-Elu, ịkwụsị ị nakpọ aha ya ugboro, ugboro, ha nzukọ-nsọ, n’ụbọchị ndị ochie, kpọrọ ọkwa nchụ-aja ahụ aha Melkizedek, ma-ọbụ Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek.

5 Ikike ndị-ọzọ nile ma-ọbụ ọkwa-ọrụ nile n’ime nzukọ-nsọ bụ amgbakwụnye nye ọkwa nchụ-aja nke a.

6 Mana e nwere nkewa abụọ ma-ọbụ nnukwu nkewa abụọ-nke mbụ bụ Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek, ma nke ọzọ bụ Ọkwa Nchụ-aja Erọn ma-ọbụ aLivaị.

7 Ọkwa-ọrụ nke aonye okenye bịara n’okpuru ọkwa nchụ-aja nke Melkizedek.

8 Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek nwere ikike ahụ nke ịnọ n’otu ndị-isi nduzi, ma nwee ike na aikike n’ebe Ọkwa-ọrụ nile na nzukọ-nsọ n’oge nile nke ụwa, ilekọta n’ihe nile nke mụọ.

9 aOtu ndị-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu, nke nọ na usoro nke Melkizedek, nwere ike iduzi n’ọkwa-ọrụ nile n’ime nzukọ-nsọ.

10 aNdị-isi nchụ-aja nke nọ na usoro nke Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek nwere ike biduzi, n’ọkwa ọrụ nke ha, n’okpuru ntụzi-aka nke otu ndị-isi nduzi, n’ilekọta n’ihe nile nke Mụọ, na kwa n’ọkwa-ọrụ nke onye okenye, onye nchụ-aja (nke usoro nke Livaị), onye-nkuzi, dikọn, na onye otu.

11 Onye okenye nwere ike iduzi n’ọkwa-ọrụ nke ya mgbe onye isi nchụ-aja na-anọghị.

12 Onye isi nchụ-aja na okenye ga-elekọta n’ihe nile nke Mụọ, n’usoro ọgbụgba ndụ ahụ nile na iwu-nsọ nile nke nzukọ-nsọ; ma ha nwere ike iduzi n’ọkwa-ọrụ nile ndị a nke nzukọ-nsọ mgbe n’enweghi ndị ikike dị-elu nọ n’ebe ahụ.

13 Ọkwa nchụ-aja nke abụọ ka a na-akpọ aỌkwa Nchụ-aja nke Erọn, n’ihi na enyefere ya n’isi bEron na mkpụrụ ya, n’ọgbọ ha nile.

14 Ihe e jiri kpọ ya ọkwa nchụ-aja nke nta bụ na ọ bụ amgbakwụnye nye nke nnukwu ma-ọbụ Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek na nwere ike n’ilekọta emume-nsọ nile pụtara ìhè.

15 aNdị-otu ụkọchukwu bụ ndị-isi nduzi nke ọkwa nchụ-aja nke a, ma na-ejide ọtụghe-ụzọ nile ma-ọbụ ikike nke ọkwa ahụ.

16 Onweghị onye nwere ike iwu kwadoro inye ọkwa-ọrụ nke a, ijide ọtụghe ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja nke a, m’ọbụghị ma-ọbụ aonye agbụrụ nke Erọn.

17 Mana dịka onye isi nchụ-aja nke Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek nwere ikike iduzi n’ọkwa-ọrụ nta nile, ọ ga-enwe ike iduzi n’ọkwa-ọrụ nke ụkọchukwu mgbe n’enweghi onye agbụrụ nke Erọn a hụrụ, ọ bụrụ raa na akpọrọ ya ọkpụkpọ na dopu ya iche na achiri ya echichi baa n’ike nkea site n’aka botu ndị-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Melkizedek.

18 Ike ahụ na ikike nke Ọkwa Nchụ-aja ma-ọbụ nke ka ukwuu nke Melkizedek bụ iji aọtụghe-ụzọ nile ahụ nke ngọzị nile nke mụọ nke Nzukọ-nsọ—

19 Inwe ohere nke ịnata aihe omimi nile nke ala-eze elu-igwe, inwe elu-igwe nile ahụ imepe nye ha, inwe mmekọrịta ya na bọgbakọ-ọha nile na nzukọ-nsọ nke Onye e Burụ Ụzọ muọ ahụ na inwe ọn̄ụ nke mkpakọrịta na iru nke Chineke Nna ahụ, na Jisus conye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ.

20 Ike ahụ na ikike nke ka nta, ma-ọbụ Ọkwa Nchụ-aja Erọn, bụ iji aọtụghe-ụzọ nile nke nkwusa-ozi nke ndị mụọ-ozi nile, na ilekọta bemume nsọ nile a na-ahụ-anya, nke okwu nke ozi-ọma, cbaptism nke nchegharị maka dnsachapụ nke mmehie nile, dabara n’ọgbụgba ndụ nile na iwu-nsọ nile.

21 Site na mkpa, enwere ndị-isi nduzi, ma-ọbụ ndị-ọrụ na-anọ n’isi na-etopụta ma-ọbụ ahọpụtara site ma-ọbụ sitere n’etiti ndị ahụ ndị echiri echichi baa n’ọtụtụ ọkwa ọrụ ruo n’ọkwa nchụ-aja abụọ ndịa.

22 Site na Ọkwa Nchụ-aja aMelkizedek, mmadụ atọ bNdị nọ-n’isi Ndị-isi-nchụ-aja, otu ahụ họpụtara, nye ọkwa na chie echichi baa n’ọkwa ọrụ ahụ, ma cakwadoro site na nchekwube, okwukwe, na ekpere nke nzukọ-nsọ, mejupụtara otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke Otu Ndị-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ.

23 Mmadụ airi na abụọ ndị kansụl na-agagharị agagharị ka a kpọrọ i bụ bNdị-ozi Iri na Abụọ ahụ, ma-ọbụ ndị aka-ebe pụrụ-iche nke aha nke Kraịst n’ụwa nile—site otu a pụọ iche site na ndị-ọrụ ndị ọzọ nke nzukọ-nsọ, n’ọrụ nile nke ọkpụkpọ ha.

24 Na ha ga-abụ otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka hara-otu na ikike na ike ha nye ndị-isi nduzi atọ ndị ahụ akpọrọ aha na mbụ.

25 Ndị aIri Asaa ahụ kwa, ka akpọrọ ịma-ọkwa ozi-ọma ahụ, na ka ha bụrụ ndị aka-ebe pụrụ iche nye ndị Jentaịlụ nile na n’ime ụwa—Site otu a pụọ-iche site na ndị ozi nile ndị-ọzọ na nzukọ-nsọ n’ọrụ nile nke ọkpụkpọ ha.

26 Na ha ga-abụ otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka, hara-otu na ikike ka nke ndị aka-ebe Iri na Abuo pụrụ iche ma-ọbụ Ndị-ozi a kpọturu aha.

27 Na mkpebi ọbụla nke otu n’ime ọnụ-ọgụgụ-juru-aka ndị a mere ga-abụrịrị site na otu olu nke ha; nke bụ, onye ọbụla n’otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka ọbụla ga-ekwerịrị na mkpebi nile, iji mee ka mkpebi ha nile nwee otu ike na nnabata otu n’ibe ya.

28 Ndị ka n’ọnụ ọgụgụ nwere ike buru otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka mgbe ọnọdụ n’ekweghị ka ọ hara idi otu a.

29 M’ọbụghị na ọ dị otu a, mkpebi ha nile agaghị enweta ngọzi nile nke mkpebi nke otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nke ndị-isi nduzi atọ nwere mgbe ochie ndị echiri echichi baa na usoro nke Melkizedek, na bụrụ ndị ezi-omume na ndị dị nsọ.

30 Mkpebi nile nke otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nile a, ma-ọbụ otu n’ime ha, ka a ga-eme an’ezi-omume nile, n’ịdị nsọ, na n’inwe umeala-n’obi, idi-nwayọ na ogologo ntachi-obi, na n’okwukwe, na bezigbo omume na ọmụma ihe, nnagide, ndidi, ndụ iyi Chineke, obi-ebere-ụmụnna na afọ-ọma.

31 N’ihi na nkwa ahụ bụ nke a, ọ bụrụ na ihe ndị-a adị n’ime ha, ha a gaghị abụ ndị an’agaghị ami mkpụrụ n’ịmata-ihe nke Onye-nwe.

32 Ma ọ bụrụ na e mee mkpebi ọbụla nke ndị ọnụ-ọgụgụ-juru-aka ọbụla na ajọọ-omume, enwere-ike iwepụta ya n’iru ọgbakọ ọha nke ọtụtụ ọnụ-ọgụgụ-juru-aka, nke mejupụtara ikike nile nke ihe nke mụọ nke Nzukọ-nsọ; ma ọbụghị otu a, a gaghị enwe nkpesa megide mkpebi ha.

33 Iri na Abụọ ahụ bụ Ndị-isi Nduzi Kansụl Ngagharị dị Elu na-arụ ọrụ n’aha nke Onye-nwe, site na ntụzi-aka nke ndị Otu Ndị-isi Nduzi nke Nzukọ-nsọ, dabara na nhiwe nke elu-igwe; iwulite nzukọ-nsọ, na hazie ihe nile nke ya na mba nile, na mbụ nye andị Jentaịlụ na nke abụọ nye ndị Juu.

34 Ndị Iri Asaa ahụ ga-arụ ọrụ n’aha nke Onye-nwe, site na ntụzi-aka nke aNdị-ozi Iri na Abụọ ma-ọbụ kansụl ngagharị dị elu na iwulite nzukọ-nsọ na hazie ihe nile nke ya na mba nile, na mbụ nye ndị Jentaịlụ na emesie nye ndị Juu—

35 Iri na Abụọ ahụ ka a na ezipụ, n’ijide ọtụghe-ụzọ nile, iji mepee ọnụ-ụzọ site na ịma-ọkwa nke ozi-ọma nke Jisus Kraịst, na mbụ nye ndị Jentaịlụ na emesịa nye ndị Juu—

36 aNdị kansụl dị elu nọ, na stek nile nke Zaịọn, bụ otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka ha otu n’ikike n’ihe nile gbasara nzukọ-nsọ, na mkpebi ha nile, ya na ọnụ-ogụgụ-juru-aka ahụ nke otu ndị-isi nduzi, ma-ọbụ ya na ndị kansụl ngagharị dị elu ahụ.

37 Kansụl dị elu na Zaịọn bụ otu ọnụ-ọgụgụ-juru-aka ha-otu n’ikike n’ihe nile gbasara nzukọ-nsọ, na mkpebi ha nile, dịka kansụl nile nke Iri na Abụọ nọ na stek nile nke Zaịọn.

38 Ọ bụ ọrụ nke kansụl dị elu na-agagharị ị kpọku andị Iri Asaa ahụ, mgbe ha chọrọ e nyem-aka, ime ọkpụkpọ oku nile maka ima-ọkwa, n’ịhazi ọru ịgbasa ozi-ọma, ọ bụghị ndị ọzọ ọbula.

39 Ọ bụ ọrụ nke Iri na Abụọ ahụ, na ngalaba ukwu nile nke nzukọ-nsọ, ichi andị-mgbasa ozi-ọma echichi dịka a ga-esi-akpọ ha site na mkpughe—

40 Usoro nke ọkwa nchụ-aja nke a ka e hiwere ka enyefee site na nna ruo na nwa, ma bụrụ n’ezie ndị so n’agbụrụ nke mkpụrụ ahụ ahọrọworo, ndị ekwere nkwa nile ahụ.

41 Usoro nke a ka ehiwere n’ụbọchị nile nke aAdam, ma lọtue site bna-agbụrụ n’ụzọ dị otu a.

42 Site na Adam ruo aSet, onye nke Adam chiri echichi mgbe ọ nọrọ afọ iri-isii na itolu, ma bụrụ onye agọziri afọ atọ tutu ya (Adam) anwụọ, ma ọ natara ngọzi nke Chineke site na nna ya, na ụmụụmụ ya ga-abu ndị ahọọrọ nke Onye-nwe, ma na ha ga-abụ ndị echekwara ruo n’ọgwụgwụ nke ụwa;

43 N’ihi ya (Set) bụụrụ onye azuru-oke, na bụdị ya, bụrụ kwa oyiyi nke nna ya, nke ruru na ọ dịka ọchọrọ iyi nna ya n’ihe nile, na ihe a ga-eji amata ihe di iche bụ afọ-ọ gbara.

44 Inọs ka echiri echichi ka ọ gbara otu nari afọ na iri-anọ na ọnwa anọ, site n’aka nke Adam.

45 Chineke kpọrọ Kenan n’ime ọzara mgbe ọ di afọ iri-anọ; ma ọ biakutere Adam n’ije ya ị ga n’ebe Shedolamak. Ọ nọrọ afọ iri asaa mgbe ọ natara-echichi ya.

46 Mahalalel dị narị afọ anọ na iri-itolu na isii na ụbọchị asaa mgbe echiri ya echichi site n’aka nke Adam, onye gọzi-kwara ya.

47 Jared dị nari-afọ abụọ mgbe echiri ya echichi site n’aka Adam, onye gọziri-kwara ya.

48 aInọk dị iri afọ abụọ na ise mgbe echiri ya echichi site n’aka nke Adam; na ọ dịịrị iri afọ isii na ise mgbe Adam gọziri ya.

49 Na ọhụrụ Onye-nwe, na soro ya jegharịa, na ọ nọọrọ n’iru ya mgbe nile; na ya na Chineke ajegharịrị nari afọ-atọ na iri isii na ise, nke mere na ọ dị nari afọ anọ na iri atọ mgbe benwogharịrị ya.

50 aMetusela dịịrị otu nari afọ mgbe echiri ya echichi site n’aka nke Adam.

51 Lamek dịịrị iri afọ atọ na abụọ mgbe echiri ya echichi site n’aka nke Set.

52 aNoa dịịrị afọ iri mgbe echiri ya echichi site n’aka nke Metusela.

53 Afọ atọ tutu Adam anwụọ, ọ kpọrọ Set, Inọs, Kenan, Mahalalel, Jared, Inọk na Metusela, ndị bụụrụ andị-isi-nchụ-aja, tinyere ndị ọzọ n’ime ụmụụmụ ndị bụ ndị ezi-omume, baa na ndịda nke bAdam-ondi-Ahman, nọọ n’ebe ahụ nye ha ngọzi nke ikpe-azụ.

54 Na Onye-nwe gosiri ha onwe ya, na ha biliri ọtọ ma gọzie aAdam, na kpọọ ya bMaikel, ọkpara-eze ahụ, onye-isi muọ-ozi ahụ.

55 Na Onye-nwe nyere Adam nkasi-obi, na sị ya, E mewo m gị ka ị nọ n’isi; igwe nke mba nile ga-esi na gị pụta, na ị bụ aọkpara-eze ga-achi ha ruo mgbe nile.

56 Na Adam biliri ọtọ n’etiti nke ọgbakọ ahụ; na n’agbanyeghị nhuda ya maka afọ nka ya, ebe o jupụtara na Mụọ Nsọ, o akwupụtara ihe ọbula ọbụ gaje i dakwasị ụmụụmụ ya ruo na ọgbọ nke ikpeazụ.

57 Ihe ndia nile ka edeworo n’akwụkwọ nke Inọk, na bụkwara nke a ga-agba ama ya mgbe oge ya ruru.

58 Ọ bụ ọrụ nke aIri na Abụọ ahụ kwa, bichi echichi ma doo n’usoro ndị-ọrụ ndị-ọzọ nile nke nzukọ-nsọ dabara na mkpughe nke na-asi.

59 Nye nzukọ-nsọ nke Kraịst n’ala nke Zaịọn, tinyere aiwu nile nke nzukọ-nsọ gbasara ọrụ nzukọ-nsọ—

60 N’ezie, a sị m unu, ka Onye-nwe nke Usuu nile nke ndị agha kwuru, a ga-enwerịrị andị-isi nduzi ndị okenye ga-anọ-n’isi ilekọta ndị ahụ nọ n’ọkwa-ọrụ nke okenye;

61 Na kwa andị nchụ-aja ga-anọ n’isi ilekọta ndị ahụ nọ n’ọkwa-ọrụ nke onye nchụ-aja;

62 Na kwa ndị nkuzi aga-anọ n’isi ilekọta ndị ahụ nọ n’ọkwa-ọrụ nke onye nkuzi; n’otu aka ahụ, na kwa ndị ọkwa dikọn—

63 Ya mere, site na dikọn, ruo na onye nkuzi, na site na onye nkuzi ruo n’onye nchụ-aja, na site onye nchụ-aja ruo na okenye, n’otu n’otu dịka a họpụtara ha, dịka ọgbụgba-ndụ nile na iwu-nsọ nile nke nzukọ-nsọ.

64 Mgbe ahụ abịa na Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu, nke bụ nke kachasị ha-nile.

65 Ya mere, ọ dị mkpa ka a họpụta otu onye site na Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu ịnọ n’isi ilekọta ọkwa onye nchụ-aja ahụ, na a ga-akpọ ya Onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu nke Nzukọ-nsọ;

66 Ma-ọbụ, asụgharịa ya aOnye isi-nduzi Onye Isi Nchụ-aja n’elekọta Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu nke Nzukọ-nsọ.

67 Site n’otu ebe ahụ abịa na nlekọta nke emume-nsọ nile na ngọzi nile nye nzukọ-nsọ, site an’ibikwasị aka abụọ n’isi.

68 Ya mere, ọkwa-ọrụ nke aụkọchukwu enweghi-ike ịha ka ya; n’ihi na ọkwa-ọrụ nke ụkọchukwu bụ n’ilekọta ihe nile nke ụwa nkea:

69 Otu o sila dị, onye ụkọchukwu ga-abụrịrị onye a họpụtara site na aỌkwa Nchụ-aja Di Elu, nanị ma-ọbụ bonye agbụrụ nke Erọn;

70 N’ihi nanị ma-ọbụ onye agbụrụ Erọn ọ gaghị e ji ọtụghe ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja ahụ.

71 Otu ọ sina dị, onye isi nchụ-aja, nke bụ, dịka usoro nke Melkizedek siri dị; ka enwere ike i dopụ iche maka ilekọta ihe nile nke ụwa, ebe ọ ga-amata banyere ha site na mụọ nke ezi-okwu;

72 Na kwa ị bụ aonye ikpe na Israel, ịrụ-ọrụ nile nke nzukọ-nsọ, ị nọdụ n’ikpe-ikpe megide ndị njehie n’elu ịgba-ama dịka a ga-agba ya n’iru ya dịka iwu nile siri dị, site na enyem-aka nke ndị-ndụmọdụ ya, ndị ahọrọworo ma-ọbụ na a ga-ahọrọ n’etiti ndị okenye nke nzukọ-nsọ.

73 Nke a bụ ọrụ nke ụkọchukwu na-abụghị onye agbụrụ nke Erọn, mana echiwo ya echichi baa na Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu dịka usoro nke Melkizedek siri dị.

74 Otu a ka ọ ga-abụ onye ikpe, ọbụna onye ikpe ọha n’etiti ndị bi na Zaịọn, ma-ọbụ na stek nke Zaịọn, ma-ọbụ na ngalaba ọbụla nke nzukọ-nsọ ebe a ga-edopụ ya iche n’ije ozi nke a, ruo mgbe oke-ala nile nke Zaịọn ga-agbasa, na ọ dị mkpa ka e nwee ndị ụkọchukwu ma-ọbụ ndị ikpe na Zaịọn ma-ọbụ ebe ọzọ.

75 Na ọbụrụ raa na e nwere ndị ụkọchukwu ọzọ ahọpụtara ha ga-arụ n’otu ọkwa-ọrụ ahụ.

76 Mana Onye agbụrụ nke Erọn nwere nkwado nke iwu i bụ onye-isi nduzi nke ọkwa nchụ-aja nke a, iji aotughe-ụzọ nile nke ije-ozị nke a, ịrụ n’ọkwa-ọrụ nke ụkọchukwu nke onwe ya n’enweghị ndị ndụmọdụ, e wezuga ma-ọbụ ebe Onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu, dịka usoro nke Melkizedek siri dị, ka-anwalere, ị nọdụ dịka onye ikpe na Israel.

77 Na ime mkpebi nke ọbụla n’ime kansụl ndia, ga-adabere na iwu-nsọ nke n’asị.

78 Ọzọ, n’ezie, a sị m unu, ọrụ ahụ kachasị mkpa na nzukọ-nsọ, na ikpe ndị ahụ kachasị aike nke nzukọ-nsọ, ọbụrụ raa na enweghị afọ ojuju na mkpebi nke-onye ụkọchukwu ma-ọbụ ndị ikpe, a ga-enyefe ya ma bulie ya zigara kansụl nke nzukọ-nsọ, tupu ezigara ya bOtu Ndị-isi Nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu.

79 Na Otu Ndị-isi Nduzi nke kansụl nke Ọkwa Nchụ-aja Di Elu ga-enwe ike ịkpọ ndị-isi-nchụ-aja ndị ọzọ, ọ bụna, iri-na abụọ, inye-aka dịka ndị ndụmọdụ; na site otu a Otu Ndị-isi Nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Di Elu na ndị ndụmọdụ ya ga-enwe ike ikpebi site na ama dịka iwu nile nke nzukọ-nsọ.

80 Na mgbe e nwechara mkpebi nke a, a gaghị e chetekwa ya ọzọ n’iru Onye-nwe; n’ihi nke a bụ kansụl kachasị-elu nke nzukọ-nsọ nke Chineke, na mkpebi nke ikpeazụ n’elu ịrụrita ụka nile n’ime okwu nile nke mụọ.

81 O nweghị onye ọbụla nke nzukọ-nsọ bụ onye agụpụrụ site na kansụl nke a nke nzukọ-nsọ.

82 Na ọbụrụ raa na Onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Di Elu e mehie, a ga-echeta kwa ya n’iru kansụl ọha nke nzukọ-nsọ, onye ndị ndụmọdụ iri na abụọ nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Elu ga-enyere aka;

83 Na mkpebi ha n’isi ya ga-abụ nke ikpeazụ n’elu ịrụrita-ụka gbasara ya.

84 Otu a, o nweghị onye a ga-agụpụ site an’ikpe ziri-ezi na iwu nile nke Chineke, ka e wee mee ihe nile na usoro na idere-duu n’iru ya, dịka ezi-okwu na ezi-omume siri dị.

85 Na ọzọ, n’ezie a sị m unu, ọrụ nke onye-isi nduzi nye ọkwa-ọrụ nke adikọn bụ ịnọ-n’isi ndị ọkwa dikọn iri na abụọ, i nye ha ndụmọdu, na bikụziri ha ọrụ ha, n’enyerịta aka otu onye na ibe ya, dịka e nyeworo ya n’usoro nke Ọgbụgba ndụ nile.

86 Na kwa ọrụ nke onye-isi nduzi nye ọkwa-ọrụ nke andị nkuzi bụ ịnọ-n’isi nye ndị nkuzi iri abụọ na anọ, na ịnọ na-enye ha ndụmọdụ, na-akụziri ha ọrụ nile nke ọkwa-ọrụ ha, dịka e nyere ya na ọgbụgba ndụ nile.

87 Na ọrụ onye-isi nduzi nye Ọkwa Nchụ-aja nke Eron bụ ịnọ n’isi andị nchụ-aja iri-anọ na asatọ, na inọ na-enye ha ndụmọdụ, ikuziri ha ọrụ nile nke ọkwa-ọrụ ha, dịka e nyere ya na ọgbụgba ndụ nile—

88 Onye-isi nduzi a, ga abụ onye aụkọchukwu; n’ihi na nke-a bụ otu n’ime ọrụ nile nke ọkwa nchụ-aja nke a.

89 Ọzọ, ọrụ nke onye-isi nduzi nye ọkwa-ọrụ nke andị okenye bụ ị nọ n’isi ndị okenye iri-itolu na isii, na inọ na-enye ha ndụmọdụ, na na-akụziri ha dịka Ọgbụgba ndụ nile siri dị.

90 Otu ndị-isi nduzi nke a pụrụ iche site na nke ndị iri asaa ahụ, na e mere ya maka ndị n’agaghị aagagharị n’ime ụwa nile.

91 Na ọzọ, ọrụ nke Onye-isi nduzi nke Ọkwa Nchụ-aja Di Elu bụ ịnọ an’isi nzukọ-nsọ nile, na i dịkwa ka bMoses

92 Lee, nke a bụ amamihe; e, ịbụ aonye ọhụ ụzọ, bonye mkpughe, onye ntụgharị asụsụ, na conye-amụma, na-enwe donyinye nile nke Chineke nke o nyekwasịrị n’elu isi nke nzukọ-nsọ.

93 Na ọ bụ dịka ọhụ na-egosi usoro nke andị Iri Asaa ahụ, na ha ga-enwe ndị-isi nduzi asaa ga-anọ n’isi ha, a họpụtara site n’ọnụ-ọgụgụ nke iri asaa ahụ;

94 Na onye nke asaa n’ime ndị-isi nduzi a ga-anọ n’isi isii ndị ọzọ;

95 Na ndị-isi nduzi asaa ndịa ga-ahọpụta iri asaa ndị ọzọ n’abụghi iri asaa nke mbụ ebe ha nọ, na ha ga-anọ n’isi ha;

96 Na kwa iri asaa ndị ọzọ, ruo mgbe iri asaa mụbara ụzọ asaa, ọ bụrụ na ọrụ dị n’ubi vine nwere mkpa ịchọ ya otu a.

97 Na ndị iri asaa ndị a, ga-abụ andị mgbasa ozi na-ejegharị-ejegharị, rute ndị Jentaịlụ mbụ na kwa rute ndị Juu.

98 Ebe ọbụ na ndị-ọrụ ndị-ọzọ nke nzukọ-nsọ, ndị n’abụghi Iri na Abụọ ahụ, ma-ọbụ ndị Iri Asaa ahụ, enweghi ọrụ nke ijeghari na mba nile, mana ha ga-eje dịka ọnọdụ ha ga-ekwe, n’agbanyeghị na ha ji ọkwa-ọrụ nile di elu na dị kwa mkpa na nzukọ-nsọ.

99 Ya mere, ugbua ka onye ọbụla mụta aọrụ ya, na rụwa n’ọkwa-ọrụ ebe a kpọrọ ya bn’irụsi-ọrụ ike.

100 Onye nke bụ aonye-ume-ngwụ, a gaghị a gụ ya na bikwesị-ekwesị iguzo, na onye ahụ n’amụtaghị ọrụ ya na n’ezipụta onwe ya ka onye n’anabataghị, a gaghị agụ ya onye kwesịrị-ekwesị iguzo. Ọbụna otu a. Amen.