Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 70


Nkeji 70

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 12 Novemba 1831 (History of the Church, 1:235–237). Akụkọ e dere site n’aka onye-amụma na-ekwu na ọgbakọ pụrụ-iche anọ ka e nwere site na 1 rue na 12 nke Novemba, sonyere. Na nke ikpe azụ n’ọgbakọ ndia, oke ịdị mkpa nke Book of Commandments (Akwụkwọ nke Iwụ-nsọ nile), nke e mesịrị kpọọ Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile, ka atulere; ma onye-amụma na-akpọ ya dịka ihe bụ ntọ-ala nke nzukọ-nsọ a n’ụbọchị ndị ikpe-azụ ndia, na ihe nrịta uru nye ụwa, na-egosi na ọtụghe ụzọ nile nke ihe omimi nile nke ala-eze nke Onye-nzọpụta anyị ka e nyefere mmadụ ọzọ (History of the Church, 1:235).

1–5, Ndị-ọrụ ka a họpụtara ibipụta mkpughe nile; 6–13, Ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ihe nke mụọ tozuru-oke iweta ụgwọ-ọrụ; 14–18, Ndị-nsọ kwesịrị ịha-otu n’ihe nile nke ụwa.

1 Lee, ma n̄aa-ntị, O unu ndị bị na Zaịọn na unu nile mmadụ nile nke nzukọ-nsọ m ndị dị ebe dị-anya, ma nụrụ nụ okwu nke Onye-nwe nke m nyere nwa odibo m Joseph Smith, Nta, na kwa nye nwa odibo m Martin Harris, na kwa nye nwa odibo m Oliver Cowdery, na kwa nye nwa odibo m John Whitmer na kwa nye nwa odibo m Sidney, Rigdon, na kwa nye nwa odibo m William W. Phelps, dịka e si nye ha n’iwụ-nsọ.

2 N’ihi na a na m enye ha iwu nsọ; ya mere n̄aa nụ ntị ma nụrụ, n’ihi na otu a ka Onye-nwe kwuru nye ha—

3 Mụ, Onye-nwe, a họpụtawo ha, ma chie ha echichi ịbụrụ andị-ọrụ n’elu mkpughe nile na iwu-nsọ nile nke m nyewọrọ ha, na nke m ga-enye ha ma-emesịa;

4 Ma nkọwasị nke ọkwa ọrụ nkea ka m ga-achọ n’aka ha n’ụbọchị nke ikpe.

5 Ya mere, a họpụtawọ m nye ha, ma nke a bụ ọrụ ha na nzukọ-nsọ nke Chineke, ijikwa ha na ihe nile gbasara ha, e, ihe nrite uru nile n’ebe ahụ.

6 Ya mere, iwu-nsọ ka m na-enye ha, na ha agaghị enye ihe ndia na nzukọ-nsọ, ọbụghị ma-ọbụ nye ndị ụwa;

7 Otu osila dị, ọ bụrụra na ha nata karịa nke ha chọrọ maka mkpa ha nile na ọchịchọ ha nile, a ga-enye ya an’ụlọ-akụ m;

8 Ma ihe nrite uru nile ka a ga-edo nsọ nye ndị nile bi na Zaịọn, na nye ọgbọ ha nile, ọ bụrụra ha abụrụ andị nketa nke ala-eze dịka iwu nile nke ala-eze.

9 Lee, nke a bụ ihe Onye-nwe chọrọ n’aka mmadụ ọbụla nọ an’ọkwa ọrụ ya, ọbụna dịka mụ, Onye-nwe, họpụtawọrọ ma-ọbụ ga-ahọpụta ma emesịa nye onye ọbụla.

10 Ma lee, onweghị onye a họpụrụ n’iwu nke a onye nọ na nzukọ-nsọ nke Chịneke dị ndụ;

11 E, ma-ọbụ ụkọchukwu, ma-ọbụ onye ana-anọchi anya onye na-edebe ụlọ akụ nke Onye-nwe ma-ọbụ onye a họpụtara n’ọkwa ọrụ ilekọta ihe nile nke ụwa.

12 Ya onye ahụ nke a họpụtara ilekọta ihe nile nke mụọ onye ahụ akwesịrị ụgwọ-ọrụ ya, ọbụna dịka ndị ahụ nke a họpụtara n’ọkwa ọrụ ilekọta ihe nile nke ụwa;

13 E, ọbụna karịa n’uju, karịa uju nke a mụbara nye ha site na ngosipụta nile nke Mụọ.

14 Otu osila dị, n’ihe nke ụwa nile unu unu aga-aha otu ma nke a abụghị na-enweghi mmasị, ma ọbụghị otu a uju nke ngosipụta nile nke Mụọ ka a ga-ejichị.

15 Ugbụ a, aiwu-nsọ nke a ka m na-enye unu ụmụ odibọ m maka ihe nrite uru ha mgbe ha na-adị ndụ; maka ngosipụta nke ngozi m nile n’elu isi ha, na maka ụgwọ-ọrụ nke bịrusị ọrụ ike ha na maka nchekwa ha.

16 Maka nri na auwe na maka ihe nketa; maka ụlọ nile na maka ala nile, ma n’ime ọnọdụ ọbụla mụ, Onye-nwe, ga-edota ha ma ebe ọbụla, mụ, Onye-nwe, ga-eziga ha.

17 N’ihi na ha ekwesịwo ntụkwasị-obi an’ọtụtụ ihe, ma ha e mewo nke-ọma ọbụrụra na ha emehiebeghi.

18 Lee, mụ, Onye-nwe, n’eme aebere ma a ga-agozi ha, ma ha ga-aba n’ọn̄ụ nke ihe ndịa. Ọbụna otu a Amen.