Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 119


Nkeji 119

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Far West, Missouri, 8 Julaị 1838, na ọziza nye arịrịọ ya: “O Onye-nwe! Gosi nwa odibọ gị ihe bu ihe i chọrọ site na arịa nile nke ndị gị maka ikwu otu-ụzọ-n’ụzọ iri” (History of the Church, 3:44). Iwu nke otu ụzọ n’ụzọ iri dịka aghọtara taa, ka n’enyebeghi nzukọ-nsọ tutu mkpughe nke a. Okwu ahụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’ekpere nke a ekwuru maka ya na mkpughe ndị ochie nile (64:23; 85:3; 97:11) apụtaghi nani otu ụzọ n’uzọ iri, mana onyinye afọ ofufe nile, ma-ọbụ ụtụ nile, atụnyere na akpa nzukọ-nsọ. Onye-nwe e nyewo nzukọ-nsọ na mbụ iwu nke inyefechasị na ngụzi ije-ozị nke arịa, nke ndị otu (nke ka nke ndị ndu ndị okenye) bara nime ya site na ọgbụgba-ndụ nke g’adị ruo mgbe nile na-adigide. N’ihi ọtụtụ enweghị ike imezu ọgbụgba ndụ nke a, Onye-nwe weghachiri ya na oge ahụ na nye n’ọnọdu ya iwu nke otu ụzọ n’ụzọ iri maka Nzukọ-nsọ nile. Onye-amụma jụrụ Onye-nwe ụzọ ole n’aria ụlọ ha ka a chọrọ maka ihe nile dị-nsọ. Aziza ya bụ mkpughe nke a.

1–5, Ndị nsọ nile ga-akwu aria nile ha nwere karia na mgbe ahụ nye, dịka otu ụzọ n’ụzọ iri ha, otu ụzọ na ụzọ iri na uru ha n’afọ nile; 6–7, Ụzọ dị otu a ga-edo nsọ ala nke Zaịọn.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru, a chọrọ m arịa nile ha nwere akarịa ka ọ bụrụ ihe etinyere n’aka onye ụkọchukwu nke nzukọ-nsọ m na Zaịọn.

2 N’ihi owuwu nke aụlọ nke m, na n’ihi iji wee tọọ ntọ-ala nke Zaịọn na n’ihi ọkwa nchụ-aja, na n’ihi ụgwọ nile nke Otu Ndị-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ m.

3 Na nke a ga-abụ mmalite nke aịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị m.

4 Na nke ahụ gasia, ndị ahụ kwụworo otu-ụzọ n’ụzọ iri ha ga-akwụ otu ụzọ n’ime uzọ iri nke uru ha n’afọ nile; na nke a ga-abụ iwu ga-anọgide nye ha ruo mgbe nile, n’ihi Ọkwa Nchụ-aja Dị-nsọ, ka Onye-nwe kwuru.

5 N’ezie a sị m unu, ọ ga-eru na ndị nile ga-agbakọta n’ala nke aZaịọn ga akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri maka arịa ha nwere karịa, na ha ga-edebe iwu nke a, ma-ọbụ a gaghị ahụ ha ka ndị kwesịrị-ekwesị ịnọ n’etiti unu.

6 Na a sị m unu, Ọ bụrụ na ndị m edebeghị iwu nke a, ido ya nsọ, na site n’iwu nke a doo ala nke aZaịọn nsọ nye m, ka iwu m edere ede nile na mkpebi ikpe m nile bụrụ ihe edebere ebe ahụ, ka o wee dị nsọ karịa, lee, n’ezie a sị m unu ọ gaghị abụ ala nke Zaịọn nye unu.

7 Na nke a ga-abụ ihe nlere-anya nye astek nile nke Zaịọn. Ọ bụna otu a. Amen.