Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 69


Nkeji 69

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Novemba 1831 (History of the Church, 1:234–235). Nchịkota nke mkpughe nile nke akwadoro maka mbipụta ọsọ-ọsọ ka a nabataworo n’ọgbakọ pụrụ iche nke 1 November. Na 3 Novemba, mkpughe nke a na-apụta ebe a dịka nkeji 133 ka e tinyere ma kpọkwa ya ihe Mgba kwụnye. Sita na nkwerịkọta nke ndị ọgbakọ, Oliver Cowdery ka a họpụtara iburu ndere na-aka nke mkpughe nile na iwu-nsọ nile a chikọtara gaa Independence, Missouri, maka mbipụta. O ga-eji kwa ego nile nke a tụkọtara maka iwuli Nzukọ-nsọ na Missouri. Ebe ụzọ ije ahụ ga-edu ya site n’otu mba ndị di-ala n’ọnụ ọgụgụ rue n’ebe mba di n’oke ala ya, onye nso m-eje ya na ya ga-eso ka-achọrọ.

1–2, John Whitmer ga-esoro Oliver Cowdery gaa Missouri; 3–8, Ọ ga-kwa ekwusa ozi-ọma ma nata, detuo, ma dee akụkọ ndekọta.

1 N̄aa nụ ntị nye m, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru, n’ihi nwa odibo m aOliver Cowdery. Ọbụghị amamihe n’ime m na a ga-enyefe ya iwu-nsọ nile na ego nile nke o ga-ebụrụ rue n’ala nke Zaịọn, ewezuga ma onwere onye ya na ya soro ga-abụ onye ezi-okwu ma kwesị ntụkwasị obi.

2 Ya mere, mụ, Onye-nwe chọrọ na nwa odibo m, aJohn Whitmer, ga-esoro nwa odibo m Oliver Cowdery jee;

3 Na kwa na ọ ga-aga n’iru n’ide ma n’ina-eme aakuko ndekọta nke ihe nile dị mkpa nke ọ ga-ahụ ma mata gbasara nzukọ-nsọ nke m;

4 Na kwa, ka o nata andụmọdụ na enye m-aka site n’aka nwa odibo m Oliver Cowdery na ndị ọzọ.

5 Na kwa, ụmụ odibo m ndị gakesiri n’ime ụwa ga-ezipụta nkọwasị nke aọrụ ha nile rute n’ala nke Zaịọn;

6 N’ihi na ala nke Zaịọn ga-abụ oche na ebe a ga-anabata ma mee ihe ndị a nile.

7 Otu osila dị, ka nwa odibo m John Witmer gaa ọtụtụ ugboro site n’otu ebe rue n’ebe ozo, ma site na nzukọ-nsọ rute na nzukọ-nsọ, ka ọ nwe ike inweta ọmụma-ihe n’uzọ dị mfe karịa—

8 Na-ekwusa ozi-ọma ma na-akọwadaru-ala, na-ede, na-ejịje-odide, na-ahọpụta, ma na-enweta ihe nile ga-abụ maka ọdị mma nke nzụkọ nsọ, na maka ọgbọ nile ndị na-abịa nke ga-etopụta n’ala nke aZaịọn, inwe ya site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ruo mgbe nile na mgbe nile. Amen.