Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 132


Nkeji 132

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Nauvoo, Illinois, e dekọtara ya na 12 Julaị 1843, gbasara ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide, tinyere ọgbụgba ndụ mgbe ebighi-ebi nke ọlụlụ di na nwunye, na kwa ịlụ ọtụtụ nwunye (History of the Church, 5:501–507). Ọ bụ ezịe na e depụtara mkpughe ahụ na 1843, ọ pụtara ihe site n’akụkọ ndepụta nile na ozizi nile na ukpụrụ nile nke nọ n’ime mkpughe nke a ka Onye-amụma matawororịị site ke mgbe 1831.

1–6, Mbuli-elu ka a ga-enweta site na ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide; 7–14, Asụsụ nile na onodụ nile nke ọgbụgba-ndụ ahụ ka e gosipụtara; 15–20, Olụlụ di na nwunye nke selestịal na ịgan’iru nke njikọ ezi na ụlọ ga-emeka ndị mmadụ bia bụrụ chi; 21–25, Uzọ ahụ nke di warawara na mkpafa n’eduba na ndụ ebighi-ebi; 26–27, E nyere iwu gbasara ịkwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ; 28–39, Nkwa nile nke mmụba ebighi-ebi na mbuli-elu ka e mere nye ndị amụma na Ndị-nsọ nke ọgbọ nile; 40–47, Joseph Smith ka e nyere ike ijikọ na rachịe n’ụwa na n’elu-igwe; 48–50, Onye-nwe rachiri mbuli-elu ya n’isi ya; 51–57, Emma Smith ka e nyere ndụmọdụ ka okwesi-ntụkwasị-obi na bụrụ ezia; 58–66, Iwu nile na-achị ịlụ ọtụtụ nwunye ka e gosipụtara.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye gị nwa odibo m Joseph, na ọbụrụhaa na ị chọwo n’aka m ị mara na ịghọta ka mụ, Onye-nwe jiri nye Abraham, Isaac, na Jacob ndị odibo m nkwado ziri-ezi, na kwa Moses, David na Solomon, ndị odibo m, gbasara ụkpụrụ na ozizi nke ha inwe ọtụtụ anwunye na ọtụtụ enyi-nwanyị—

2 Lee, na hụrụ, a bụ m Onye-nwe Chineke gị, na ga-aza gị gbasara okwu nke a.

3 Ya mere, akwado obi gị ị nara na irube-isi nye ndụmọdụ nile nke m gaje inye unu, n’ihi ndị nile e kpughere iwu nke a nye ahaghị irube-isi nye ya.

4 N’ihi na lee, e kpughe m nye unu aọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide, na ọbụrụ na unu e rubeghị-isi nye ọgbụgba ndụ ahụ mgbe ahụ unu bụ ndị bikpe mara, n’ihi onweghị onye cga-enupu-isi nye ọgbụgba ndụ nke a na-ekwere ya ịba n’ebube nke m.

5 N’ihi na ndị nile ga-enweta angọzi n’aka m nile ga-erube isi nye biwu ahụ nke a họpụtāworo n’ihi ngọzi ahụ na-ọnọdụ nile nke ya, dịka e hiwere site tutu ntọ-ala nke ụwa.

6 Na gbasara ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na amgbe nile na-adigide, e hiwere ya maka uju nke bebube m; na onye ahụ nke nwetere uju nke ya ahaghị ịna-erube-isi n’iwu ahụ, ma-ọbụ ọ ga enwe ọmụma-ikpe ọku ala mụọ, ka Onye-nwe Chineke kwuru.

7 Na n’ezie a sị m unu, na aọnọdụ nile nke iwu nke a bụ ndị a: Ọgbụgba ndụ nile, ọrụngo nile, enweghị onwe nile, nkwa di nsọ nile, bịn̄ụ-iyi nile, nkwa nile, ihe omume nile, njikọ nile, otu nile, ma-ọbu nchekwube nile, ndị nke na-emeghị na banye na ya na crachie site na dMụọ Nsọ nke e kwere na nkwa, nke onye ahụ onye e tere mmanụ, ya na maka oge ndụ na mgbe ebighi-ebi nile, na kwa nke ahụ dịkarịrị nsọ, site na emkpughe na iwu nsọ site n’aka nke onye m tere mmanụ, nke m họpụtaworo n’elu ụwa ijide ike nke a (na-ahọpụtawo m nye nwa odibo m Joseph ijide ike nke a n’ụbọchị ikpe azụ nile, na ọdịghị ma-ọbụghị otu onye n’elu ụwa n’otu mgbe bu onye e nyefere ike nke a na fọtụghe ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja nke a) ha agaghị adị ire, nweghị ezi omume ma-ọbụ nwe ike na mbilite n’ọnwụ ma-ọbụ mbilite n’ọnwụ site na ndị nwụrụ anwụ gasịa; n’ihi na ọrụngo nile nke na-emeghị baa na nsọtụ nke a nwere ọgwụgwụ mgbe ndị mmadụ nwụrụ ọnwụ.

8 Lee, ụlọ nke m bụ ụlọ nke-usoro, ka Onye-nwe Chineke kwuru, na-ọbụghị ụlọ nke ọgba aghara.

9 Aga m anakwere aonyinye, Onye-nwe kwuru bụ nke na-enyeghị n’aha m?

10 Ma-ọbụ aga m anata n’aka nile unu nke ahụ mụ onwe m ana-akaghị aka?

11 Ma aga m aka-aka nye unu, ka Onye-nwe kwuru ma-ọbụghị site n’iwu, ọbụna dịka mụ na Nna m achiri echi nye unu tutu ụwa adịrị?

12 Abụ m Onye-nwe Chineke gị; na enye m unu iwu nsọ nke a—na-onweghị onye ọbụla aga-abịakwute Nna ahụ ma-ọbụghị site na m, ma-ọbụ site n’okwu nke m, nke bụ iwu m, ka Onye-nwe kwuru.

13 Na ihe nile nke dị n’ime ụwa, ọbụna nke ndị mmadụ chiri echi, site n’oche eze nile, ma-ọbụ ala ọkpara eze nile, ma-obụ ike nile, ma-ọbụ ihe nile a maara aha ha, ihe ọbụla ha ga-abụ, ndị na-adịghị site na m ma-ọbụ site n’okwu nke m, ka Onye-nwe kwuru, ka-aga-akwatu, na ha aagaghị afọdụ mgbe ndị mmadụ nwụsịworo ọnwụ, ọbụladị na mbilite n’ọnwụ ma-ọbụkwanụ mbilite n’ọnwụ gasịa, ka Onye-nwe Chineke gị kwuru.

14 N’ihi ihe ọbụla nile fọdụrụ sitere na m, na ihe ọbụla nile na-esiteghị na m ka a ga-eme ka ha maa jijiji na bibie.

15 Ya mere, ọbụrụ na nwoke aalụọ nwunye n’ime ụwa, na onye ahụ alụghị ya site na m ma-ọbụkwanụ site n’okwu m, na o mere ọgbụgba ndụ nye ya ogologo mgbe onye ahụ nọ n’ime uwa, na onye nwanyị ahụ na ya, ọgbụgba ndụ ha na ọlụlụ di na nwunye ha enweghị ikike mgbe ha nwụrụ ọnwụ, na mgbe ha pụrụ n’ụwa; ya mere ọdịghị agbụ iwu ọbụla kekọrọ ha mgbe ha siri n’ụwa pụọ.

16 Ya mere, mgbe ha pụrụ n’ụwa, ha alụghị ọlụlụ na, enyeghị kwa ha ana-ọlụlụ di na nwunye; kama enyere ha ọkwa dịka bndị mụọ-ozi dị n’elu-igwe, bụ ndị mụọ-ozi nkwusa ozi, na-eje ozi, na-ekwusa ozi nye ndị ahụ bụ ndị ka itozu oke karịa n’uju ebube di arọ dị kwa ebighi-ebi.

17 N’ihi na ndị mụọ-ozi nile ndị a edebeghị iwu nke m; ya mere, ha agaghị enwe mmụba kama ha ga-anọrọ onwe ha n’otu n’otu, na-enweghị mbuli elu n’ime ọnọdụ nzọpụta nke ha, ruo mgbe ebigh ebi nile; na site ugbụ a gawa ha abụghị chi, kama ha bụ ndị mụọ-ozi nke Chineke ruo mgbe nile na mgbe nile.

18 Na ọzọ, n’ezie asị m unu, ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye na mee ọgbụgba ndụ nye ya maka oge ndụ na mgbe ebighi-ebi nile, na ọgbụgba ndụ ahụ esiteghị na m ma-ọbụ n’okwu nke m, nke bụ iwu m, na a rachighi ya site na Mụọ Nsọ nke e kwere na nkwa, site n’onye ahụ onye nke m teworo mmanụ na nyefee ike nke a, mgbe ahụ ọ dịghị ire, o nweghị kwa ike mgbe ha pụrụ n’ụwa, n’ihi na ọbụghị m jikọrọ ha, ka Onye-nwe kwuru, ọ bụghị kwa site n’okwu m; mgbe ha pụrụ n’ụwa a gaghị anara ya ebe ahụ, n’ihi na ndị mụọ-ozi na chi ahụ nile ka ahọpụtaworo ebe ahụ, bụ ndị ha na-agaghị agafe, ya mere, ha agaghị eketa ebube nke m, n’ihi na ụlọ nke m bụ ụlọ nke usoro, ka Onye-nwe Chineke kwuru.

19 Na ọzọ, n’ezie asị m unu, ọbụrụ na nwoke alụọ nwunye site n’okwu m nke bụ iwu m, na site na ọgbụgba-ndụ aọhụrụ na mgbe nile na-adigide, na a brachiri ya site na Mụọ Nso nke e kwere na cnkwa, site n’onye ahụ e tere mmanụ, onye m họpụtaworo nye ike na dọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja nke a, na a ga-asị ha—Unu ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke mbụ, na ọ bụrụ mgbe mbilite n’ọnwụ nke mbụ gasịrị, na mbilite n’ọnwụ nke na-eso, na unu ga-eketa eoche eze nile, ala-eze nile, ala ọkpara-eze nile, na ike nile, ebe ọchịchị nile, ebe nile dị elu, na omimi nile; mgbe ahụ ka a ga-ede ya n’ime fAkwụkwọ nke Ndụ nke Nwa-atụrụ ahụ, na onye ahụ agaghị egbu ọchụ nke bụ ịkwafu ọbara onye ikpe na-amaghị, na ọbụrụ na unu erube isi nye ọgbụgba ndụ nke m na-egbughị ọchụ nke bu ikwafu ọbara onye ikpe na-amaghị, a ga-eme ihe nile nye ha bụ ihe ọbụla nke nwa odibo m tụkwasara n’isi ha, n’oge ndụ na n’ime mgbe ebighi-ebi nile, na ọ ga-ejupụta n’ike mgbe ha pụrụ n’ụwa; na ha ga-agafe n’akụkụ ndị mụọ-ozi ahụ na chi nile ahụ, bụ ndị nke e mere ka ha nọdụ ebe ahụ, ruo na gmbuli elu nke ha n’ebube n’ime ihe nile, dịka a rachiri n’elu isi ha, ebube ahụ nke g’abụ uju na igan’iru nke ịmịta mkpụrụ ruo mgbe nile na mgbe nile.

20 Mgbe ahụ ka ha ga-abụ chi nile, n’ihi na ha enweghị ngwụcha; ya mere, ha ga-adigide site na mgbe nile na-adigide ruo na mgbe nile na-adigide, n’ihi igan’iru ha; mgbe ahụ ha ga-adị elu karịa ihe nile, n’ihi na ihe nile nọ n’okpuru ha. Mgbe ahụ ha ga-abụ achi nile, n’ihi na ha ji bike nile, na ndị mụọ-ozi nile nọ n’okpuru nye ha.

21 N’ezie, n’ezie, asị m unu, ọbụrụ na unu edebeghị aiwu m, unu agaghị etoru na ebube nke a.

22 N’ihi na awarawara ka ọnụ ụzọ ama ahụ dị, na mkpafa ka bụzọ ahụ dịkwa nke na-eduba na mbuli-elu na ịgan’iru nke cndụ nile, ma na ole na ole dị bụ ndị na-achọta ya, n’ihi unu anabataghị m n’ime ụwa, unu amaghị kwa m.

23 Mana ọbụrụ na unu anabata m n’ime ụwa, mgbe ahụ unu ga-amara m, na nweta mbuli elu unu, ka an’ebe mụ onwe m nọ unu ga-anọ kwa.

24 Nke a bụ ndụ aebighi ebi nile—ka amara nanị onye amamihe ahụ na ezi Chineke, na Jisus Kraịst, onye o bzitere. Abụ m ya. Ya mere, nara nụ, iwu m.

25 aObosara ka ọnụ ụzọ ama ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dị kwa nke na-eduba bn’ọnwụ nile; na ọtụtụ ka ha dị bụ ndị na-aba na ya, n’ihi ha canabataghị m, ha anaghị erube isi nye iwu m.

26 N’ezie, n’ezie, asị m unu, ọbụrụ na nwoke alụọ nwunye dịka okwu m sị dị, na a rachie ha site na aMụọ Nsọ nke e kwere na nkwa, dịka mụ onwe m họpụtaworo, na onye ahụ ma-ọbụ nwunye ya e mee mmehie ọbụla ma-ọbụ njehie nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide ihe ọbụla, na ụdị nkwuhie Chineke nile, na ọbụrụ na ha begbughị ọchụ nke n’ime ya ha akwafuo ọbara onye ikpe na-amaghị, emesịa ha ga-apụta n’ime mbilite n’ọnwụ nke mbụ na bata n’ime mbuli elu nke ha; mana a ga-ebibi ha n’anụ arụ na cnyefee ha n’aka ihe otiti nke dSetan ruo ụbọchị nke mgbapụta, Onye-nwe Chineke kwuru.

27 aIkwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ ahụ, nke bna-agaghị agbaghara n’ime ụwa, ma-ọbụ apụọ n’ụwa di n’ime unu igbu ọchụ nke n’ime ya unu ga-akwafu ọbara onye ikpe na-amaghị na kweta ọnwụ nke m, mgbe unu nwetasịworo ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide, Onye-nwe Chineke kwuru, na onye ahụ nke na-erubeghị isi nye iwu nke a enweghi ike ibata n’ime ebube nke m, mana ọ ga-enweta cọmụma ikpe, ka Onye-nwe kwuru.

28 Abụ m Onye-nwe Chineke gị, na aga m enye gị iwu nke Ọkwa Nchụ-aja nke m Dị Nsọ dịka mụ onwe m na Nna m chiri echi tutu ụwa a dịrị.

29 aAbraham nwetara ihe nile, ọbụla o nwetara, site na mkpughe na iwu nsọ, site n’okwu m, Onye-nwe kwuru, na ọ bawori n’ime mbuli elu nke ya ma na-anọdụ n’oche-eze ya.

30 Abraham nwetara ankwa nile gbasara mkpụrụ nke ya na mkpụrụ nke úkwù ya nile—onye búkwù nile ya ka unu si, aha ndị dịka; nwa odibo m Joseph—ndị kwesịrị igan’iru mgbe nile ha nọ n’ime ụwa; na gbasara Abraham na mkpụrụ ya, na a pụọ n’ụwa, ha kwesịrị igan’iru; na n’ime ụwa, na a pụọ n’ụwa ha kwesịrị igan’iru bụ ndị na-apụghị ịgụta ọnụ dịka ckpakpando nile, ma-ọbụ asị na unu gaara agụ aja ahụ nke nọ n’elu ikpere mmiri unu apụghị ịkpọ ọnụ ọgụgụ ha.

31 Nkwa nke a bụkwa nke unu, n’ihi unu sitere na aAbraham, na e kwere ya bụ nkwa nye Abraham; na ọrụ nile nke Nna m na-aga n’iru site na iwu nke a, site na ya ka-onyeworo onwe ya otuto.

32 Ya mere, gaa nụ, na rụọ aọrụ nke Abraham, bata nụ n’ime iwu m na a ga-azọpụta unu.

33 Mana ọbụrụ na unu abataghị n’ime iwu m, unu agaghị anata nkwa nke Nna m, nke o kwere Abraham.

34 Chineke nyere Abraham aiwu, ma bSera nyere cHega n’aka Abraham ịbụ nwunye. Ma gịnị mere o ji mee nke a? N’ihi na nke a bụ iwu ahụ, na site na Hega ka ọtụtụ mmadụ si dịrị. Ya mere, nke a bụụrụ mmejupụta nkwa ahụ tinyere ihe ndị ọzọ nile.

35 Nke a o mere Abraham ịnọ n’okpuru ọmụma ikpe? N’ezie, asị m unu, Ọdịghị, n’ihi na mụ onwe m bụ Onye-nwe nyere aiwu a.

36 Abraham ka e nyere aiwu ka o were bAịsak nwa ya nwoke chụọ aja nye Chineke, otu o sila dị, e dere ya: Gị cegbula mmadụ. Na-agba-nyeghị, Abraham ajụghị, ma a gụrụ nke a nye ya dịka dezi omume.

37 Abraham nwetara ọtụtụ aenyị nwanyị, na ha mụtaara ya ụmụ; na a gụrụ nke a nye ya dịka ezi omume, n’ihi na e weere ha nye ya, na o rubere isi nye iwu m, dika Aịsak kwa, na bJekọb emeghị ihe ndị ọzọ ma-ọbụghị nke ahụ e nyere ha n’iwu, na n’ihi na ha emeghị ihe ndị ọzọ ma-ọbụghị nke ahụ e nyere ha n’iwu, ha a bataworị na cmbuli elu nke ha, dịka nkwa ahụ nile siri dị, na nọdụ n’oche eze nile, na ha abụghị ndị mụọ-ozi kama ha bụ chi nile.

38 aDevid nwetakwara bọtụtụ nwunye na ndị enyi nwanyị, na Solomon kwa, na Moses ndị odibo m, dịka ọtụtu ndị ọzọ kwa ndị odibo m, site na mbido nke okike ruo oge nke a, ma ha emehieghị n’ime ihe ọbụla ma-ọbụghị n’ihe ndị ahụ ha na-enwetaghị site na m.

39 Ndị nwunye Devid nile na ndị enyi ya nwanyị ka aenyere ya site na m, site n’aka Netan nwa odibo m na ndị ọzọ ndị amụma ndị ji bọtụghe ụzọ nile nke ike nke a, na ọdịghị nke o mehiere n’ime ihe ndị a nile megide m, ma-ọbụghị n’okwu nke cUraịa na nwunye ya; na, ya mere ọ dawo site na mbuli elu nke ya, na nata òkè ahụhụ nke ya; na ọ gaghị eketa ha na-apụọ n’ụwa, n’ihi dna-enyewo m ha n’aka onye ọzọ, ka Onye-nwe kwuru.

40 Abụ m Onye-nwe Chineke gị, na enyere m gị, nwa odibo m Joseph, ọkwa, ma na-aeweghachi ihe nile. Rịọ ihe bụ ọchịchọ gị, na a ga-enye gị ya dịka okwu m siri dị.

41 Na n’ihi na ị jụwo banyere ịkwa ịko, n’ezie, n’ezie, asi m gị, ọbụrụ na mmadụ enweta nwunye n’ime ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide, na ya na nwoke ọzọ enwee mmekọ, na e nyeghị m ya ọkwa nke a site na-ite mmanụ dị nsọ, ọ kwawo iko, na a ga-ebibi ya.

42 Ọbụrụ na-ọnọghị na ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide, na ya na nwoke ọzọ enwee mmekọ, ọ akwawo iko.

43 Na ọbụrụ na di ya na nwanyị ọzọ e nwee mmekọ, na ya nọ n’okpuru ankwa, o bibiwo nkwa ya na kwawo iko.

44 Na ọbụrụ na nwanyị ahụ akwaghị iko, mana ikpe a maghị ya, o bibighi kwa nkwa ya, na ọ matara nke a, na a na m ekpughe ya nye gị, nwa odibo m Joseph, mgbe ahụ ka ị nwere ike, site na ike nke Ọkwa Nchụ-aja Dị Nsọ nke m, ịkpọrọ ya nye n’aka nwoke ahụ nke na-akwaghị iko, mana ọ bụ onye akwesịrị ntụkwasị obi, n’ihị na-aga eme ya onye ọchịchị nye ọtụtụ ihe.

45 N’ihi na-enyefewo m gị aọtụghe-ụzọ nile na ike nke ọkwa nchụ-aja nke m sitere na ya beweghachi ihe nile, na mee ka ị mara ihe nile na-ozuzu oge.

46 Na n’ezie, n’ezie asị m gị, na ihe ọbụla ị arachiri n’elu ụwa, ka aga arachi n’ime elu-igwe, na ihe ọbụla i jikọrọ n’elu ụwa, n’aha m na site n’okwu m, Onye-nwe kwuru, a ga-ejikọ ya ebighi-ebi n’ime elu-igwe nile; na mmehie nile ọbụla ị bgbaghaara n’elu ụwa, a ga-agbaghara ha ebighi-ebi n’elu-igwe nile, na mmehie nile ọbụla ị na-ejide n’elu ụwa, a ga-ejide ha n’elu-igwe.

47 Na ọzọ, n’ezie asị m, onye ọbụla ị na-agọzi, aga m agozi, na onye obula ị na-abụ ọnụ, aga m aabụ ọnụ, Onye-nwe kwuru; n’ihi na m, Onye-nwe, abụ m Chineke gị.

48 Na ọzọ, n’ezie asi m gị, nwa odibo m Joseph, na ihe ọbụla ị nyere n’elu ụwa, na onye ọbụla nke ị weere onye ahụ nye n’elu ụwa, site n’okwu m na dịka iwu m siri dị, a ga-eji ngọzi nile leta ya na abụghị ịbụ ọnụ nile, na jiri ike nke m, ka Onye-nwe kwuru, na ọ ga-adị na-enweghị ọmụma ikpe n’elu ụwa na n’elu igwe.

49 N’ihi na-abụ m Onye-nwe Chineke gị, na aga m anọnyere gị ọbụna ruo na angwụcha nke ụwa na gafee mgbe ebighi-ebi nile, n’ihi n’ezie, a na m barachi n’isi gị cmbuli elu gị, na kwado oche-eze nye gị n’ime ala-eze nke Nna m, tinyere Abraham dnna gị.

50 Lee, ahụwo m aaja nile gị, na ga-agbaghara mmehie gị nile, ahụwo m aja gị nile ị chụrụ na nrube isi nye ihe ndị ahụ m gwaworo gị. Ya mere, gaa, aga m emere gị ụzọ mgbapụ, dịka m bnataworo onyinye nke Abraham nke ọkpara ya Aịsak.

51 N’ezie, asi m gị: Iwu nsọ ka m na-enye oru m nwanyị, Emma Smith, nwunye gị, onye nke m nyeworo gị, ka o jide onwe ya, na ghara ikere-oke na nke ahụ bụ nke m nyeworo gị n’iwu ka i nye ya; n’ihi na emere m ya, ka Onye-nwe kwuru, iji nwalee unu nile, dika m mere Abraham, na ka m wee chọta onyinye n’aka unu site na ọgbụgba ndụ na ichụ-aja.

52 Na ka oru m nwanyị aEmma Smith, nara ndị ahụ nile bụ ndị m nyeworo nwa odibo m Joseph, na ndị bụ ndị ezi omume na-enweghị ntụpọ n’iru m, na ndị ahụ nwere ntụpọ, na kwuo na ha enweghị ntụpọ, ka a ga-ebibi, ka Onye-nwe Chineke kwuru.

53 N’ihi abụ m Onye-nwe Chineke gị, na unu ga-erube isi nye olu okwu m; na ana m ekwe nwa odibo m Joseph nkwa na-aga eme ya onye ọchịchị nye ọtụtụ ihe nile, n’ihi ana-o kwesiwo ntụkwasị-obi n’ime ihe ole na ole, na site ugbua gawa, aga m agba ya ume.

54 Na enye m oru m nwanyị Emma Smith, ịwu, ka-ọ nọnyere ma rapara n’arụ nwa odibo m Joseph, na ọbụghị onye ọzọ. Mana ọ bụrụ na-o nọgideghị n’iwu nsọ nke a, a ga-ebibi ya, ka Onye-nwe kwuru, n’ihi abụ m Onye-nwe Chineke gị, na ga ebibi ya ma ọbụrụ na ọ nọgideghị n’iwu m.

55 Na-ọbụrụ na ọ gaghị anabata ịwụ nsọ nke a, mgbe ahụ ka nwa odibo m Joseph ga-eme ihe nile nye ya, ọbụna ka o kwuru, na aga m agọzi ya na mụbaa ya, na nye ya aotu okpukpu narị n’ime ụwa nke a, nke nna nile, na nne nile, ụmụ nne ndịkom nile na ụmụnne ndị nwanyị nile, ulo nile, na-ala nile, ndị nwunye nile, na ụmụ, na okpu eze nke ndụ bebighi-ebi nile n’ime ụwa ebighi-ebi nile.

56 Ọzọ kwa, n’ezie asi m, ka oru m nwanyị agbaghara nwa odibo m Joseph mmehie ya nile; na mgbe ahụ ka a ga-agbaghara ya mmehie nile, nke o mere megide m, na mụ Onye-nwe Chineke gị, aga m agọzi ya, na mụbaa ya, na mee k’obi ya n̄ụrịa ọn̄ụ.

57 Ọzọ kwa, asị m, ka nwa odibo m Joseph ghara iwezuga arịa ya n’aka ya nile, ka onye iro ghara ịbịa na bibie ya; n’ihi Setan ana-achọ ka o bibie; n’ihi na-abụ m Onye-nwe Chineke gị, na ọ bụ nwa odibo m; ma lee, ma hụrụ, ana m anọnyere ya, dịka m nọnyeere Abraham, nna gị, ọbụladị ruo bmbuli elu ya na ebube.

58 Ugbua, n’ihe metụtara iwu nke aọkwa nchụ-aja, ha dị ọtụtụ ihe gbasara nke a.

59 N’ezie, ọbụrụ na Nna m, akpọọ onye ọbụla dịka ọ kpọkwara aErọn, site n’olu okwu nke m, na site n’olu okwu nke onye ahụ nke zitere m, na enyefewo m ya bọtụghe ụzọ nile nke ike ọkwa nchụ-aja nke a, ọbụrụ na o mee ihe ọbụla n’aha m na dịka iwu m siri dị, na site n’okwu m, onye ahụ agaghị emehie, na aga m eme ya ka o zie ezie.

60 Ya mere, ka onye ọbụla ghara ikwụtọ nwa odibo m Joseph; n’ihi na-aga m akwado ya ka ozie ezie; n’ihi na ọ ga-achụ aja nke m chọrọ n’aka ya nile maka njehie ya nile, ka Onye-nwe Chineke gị kwuru.

61 Ọzọ kwa dịka gbasara iwu nke ọkwa nchụ-aja—ọbụrụ na nwoke alụọ anwagbọghọ na-amaghị nwoke, nwekwara ọchịchọ ịlụ bọzọ, na nke mbụ enye ya nkwado, na ọbụrụ na ya alụọ nke abụọ, na ha bu ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, ha ekweghị kwa nkwa nye nwoke ọzọ, mgbe ahụ onye ahụ ziri ezi, ọ kwaghi iko, n’ihi na e nyere ha n’aka ya, n’ihi na o nweghị ike ịkwa iko nyere nke ahụ bụ nke ya na-abụghị nke onye ọzọ.

62 Ma ọbụrụ na o nwere ụmụ agbọghọ iri ndị e nyere ya site n’iwu nke a, o nweghị ike ịkwa iko, n’ihi na ha bụ nke ya, na e nyere ha n’aka ya; ya mere o ziri ezi nye ya.

63 Mana ọbụrụ n’otu ma-ọbụ nke ọbụla n’ime ụmụ agbọghọ iri ndị a mgbe alụchara ya, ya na nwoke ọzọ ga-enwe mmekọ, ọ kwawo iko, a ga-ebibikwa ya, n’ihi na-enyere ha n’aka ya aịmụba na juputa ụwa, dịka iwu nsọ m si dị, na mezuo nkwa ahụ nke Nna m nyere tutu ntọ-ala nke ụwa, na n’ihi mbuli elu nke ha n’ime ebighi-ebi ụwa nile, ka ha wee buo mkpụrụ-obi nile nke mmadụ, n’ihi n’ime nke a ka bọrụ nke Nna m na-aga n’iru ka e wee nye ya otuto.

64 Ọzọ kwa, n’ezie, n’ezie, asị m unu, ọbụrụ na nwoke ọbụla nwere nwunye, bụ onye ji ọtụghe ụzọ nile nke ike nke a, na onye ahụ a kụzie iwu nke ọkwa nchụ-aja nke m nye ya, gbasara ihe nile ndị a, mgbe ahụ ka ọ ga-ekwere na lekọta onye ahụ, ma-ọbụ e bibie ya, ka Onye-nwe Chineke gị kwuru, n’ihi aga m ebibi ya, n’ihi na aga m ebulite aha m n’elu nye ndị ahụ nile bụ ndị nwetara na nọgide n’ime iwu nke m.

65 Ya mere, o kwesịrị ekwesị n’iwu n’ime m, ọbụrụ na ọ nabataghị iwu nke a, nke onye ahụ ji enweta ihe nile ọbụla mu, Onye-nwe Chineke ya ga-enye ya, n’ihi na nwanyị ahụ ekwenyeghị na lekọta ya dịka okwu m si dị, mgbe ahụ kwa ọ ga-abụrụ nwanyị ahụ njehie, na nwoke ahụ ka-ewezugara site n’iwu Sera, onye lekọtara Abraham dịka iwu ahụ si dị, mgbe m nyere Abraham iwu ka ọ kpọrọ Hega dịka nwunye.

66 Na ugbu a, n’ihe gbasara iwu nke a, n’ezie, n’ezie, asị m gị, aga m ekpughere gị nke karịrị akarị ma emesịa, ya mere, kwe kwa ka nke a zuo n’oge nke a. Lee, abụ m Alfa na Omega. Amen.