Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 105


Nkeji 105

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma na Osimiri Fishing, Missouri, 22 Jun 1834 (History of the Church, 2:108–111). Otu ọgba-aghara ike megide Ndị nsọ nile nọ na Missouri na-abawanye, ma ọtụtụ otu ahaziri sitere n’ọtụtụ ogbe amawori ọkwa echiche ha ibibi ndị ahụ. Onye-amụma abịawo site na Kirtland duru ndị otu anakpọ ebe Izu-ike nke Zaịọn, na-eweta uwe na ihe ndị ọzọ. Mgbe otu a bịara nọrọ na Osimiri Fishing, Onye-amụma natara mkpughe a.

1–5, Zaịọn ga-abụ ebe ewuliri site na irube isi nye iwu Ala-eze Selestịal; 6–13, Mgbapụta ahụ nke Zaịọn ka eyigharịrị maka nwa oge nta; 14–19, Onye-nwe ga-alụ agha nile nke Zaịọn; 20–26, Ndị nsọ nile ga-abụ ndị nwere uche ma ghara ịnya-isi maka ọtụtụ oke ọrụ mgbe ha gbakọrọ; 27–30, Ala nile dị na Jackson na ogbe nile gbara ya gburugburu ka a ga-azụ; 31–34, Ndị okenye ga-anata onyinye dị-nsọ n’ulọ nke Onye-nwe na Kirtland; 35–37, Ndị nsọ ndị akpọrọ na họpụtakwa ka a ga-edo nsọ; 38–41, Ndị nsọ ga-ebuli ọkọlọtọ nke udo nye ụwa.

1 N’ezie a sị m unu ndị kpọkọtara onwe unu n’otu ebe ka unu wee mata uche m gbasara amgbapụta ahụ nke ndị m nwere mkpagbu—

2 Lee, a sị m unu, na, ma ọbụghị maka anjehie nile nke ndị m, n’ikwu gbasara nzukọ-nsọ na abụghi n’otu otu, ha gaara abụ ndị agbapụtaworo ọbụna ugbu a.

3 Mana lee, ha amụtabeghị irube-isi nye ihe nile nke m chọrọ n’aka ha nile kama ha juputara na ụdị ihe ọjọọ nile, ma ha adịghị aenyepụ ihe ha nwere, dịka o kwesịrị ndị nsọ, nye ndị ogbenye na ndị nwere mkpagbu n’etiti ha;

4 Na ha adịghị an’otu dịka njikọ-n’otu a chọrọ site n’iwu ahụ nke ala-eze Selestịal.

5 Na enweghi-ike iwuli aZaịọn bma ọbụghị ma-ọbụ site na ụkpụrụ nile nke ciwu ahụ nke ala-eze Selestịal, ma ọ bụghị otu a, a gaghị m anabata ya nye onwe m.

6 Na ndị m nwere mkpa aịta ha ahụhụ ruo mgbe ha mụtara birube-isi, ọ bụrụ na ọ ga-abụrịrị, site na ahụhụ nile ndị ha na-ata.

7 Ekwughị m gbasara ndị ahụ ahọpụtara iduzi ndị nke m, ndị bụ ndị okenye ambụ nke nzukọ-nsọ m, n’ihi na ha nile a nọghi n’okpuru amamikpe nke a.

8 Mana e kwuru m gbasara nzukọ-nsọ m nile na mba ndị ọzọ—Ọ dị ọtụtụ ndị ga-asị; Olee ebe Chineke ha nọ? Lee, ọ ga-anapụta ha n’oge nsogbu, m’ọbụghị otu a anyị a gaghị agbago baa na Zaịọn, ma anyị ga-edota ego anyị nile.

9 Ya mere, n’ihi anjehie nile nke ndị m, echere m na ọ dị mkpa na ndị okenye nke m ga-echere nwoge nta maka mgbapụta nke Zaịọn.

10 Ka ha onwe ha dịrị na njikere, na ka akụziere ndị nke m ihe karịa n’ụzọ zuru-oke, na nwere uche, na mara karia n’ụzọ zuru-oke gbasara aọrụ ha, na ihe nile m chọrọ n aka ha abụọ.

11 Ma nke a a gaghị abịa na-mmezu ruo mgbe andị okenye nkem ga-abụ ndị e jiri ike si n’elu nye bonyinye dị nsọ.

12 N’ihi na lee, a kwadowo m nnukwu onyinye dị nsọ na ngọzi nke a aga-awụsa n’isi ha, ọbụrụ raa na ha ekwesị ntụkwasị-obi ma gaa-n’iru n’idi umeala n’iru m.

13 Ya mere ọ dị m mkpa ka ndị okenye nke m chere nwoge nta maka mgbapụta nke Zaịọn.

14 N’ihi lee, a chọghi m n’aka ha ịlụ agha nile ahụ nke Zaịọn, n’ihi dịka m kwuru na otu iwu-nsọ ochie, ọbụna otu a ka m ga-emezụ—A ga m aalụ agha unu nile.

15 Lee, aonye mbịbị ahụ ka m zipụrụ ibibi ma metọọ ndị-iro m, ma ọ gaghị abụ ọtụtụ afọ site ugbụ a, a gaghị ahapụ ha imerụ ihe nketa nke m, bna-ekwuhie aha nke m n’elu ala nile nke m cdoro-nsọ maka mkpọkọta nke ndị nsọ m.

16 Lee, e nyewo m nwa odibo m Joseph Smith, Nta, iwu-nsọ ka ekwuoro andị di-ike nke ụlọ m ọbụna, ndị ọlụ agha m, ụmụ okorọbia m, na ndị dimkpa ka ha bịakọtaa otu ebe maka mgbapụta nke ndị nke m, na kwatuo ụlọ-elu tọwa nile nke ndị-iro m, na kposasịa bndị nche ha.

17 Mana ndị dike nke ụlọ m an̄abeghi nti nye okwu m nile.

18 Mana ọ bụrụ na ọ dị ndị n̄ara nti nye okwu m nile, a kwadoro m otu ngọzi na aonyinye dị nsọ, maka ha, ọ bụrụ na ha a gaa-n’iru ikwesị ntụkwasị-obi.

19 A nụwo m ekpere ha nile, na a ga m anabata onyinye ha, ma na ọ dị m mkpa ka akpọta ha n’ebe a maka mnwale nke aokwukwe ha.

20 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, otu iwu-nsọ ka m na-enye unu, na ka ha ra bụ mmadụ nile ndị bịaruru ebe a, ndị nwere ike-inọ gburugburu mpaghara ebe a, ka ha nọro.

21 Ma ndị ahụ n’agaghị enwe ike ịnọ, ndị nwere ezi na ụlọ na ọwụwa anyanwụ, ka ha nọrọ nwoge nta, rute oge ọbụla nwa ọdibọ m Joseph ga-ahọpụtara ha.

22 N’ihi a ga m enye ya ndụmọdụ gbasara okwu nke a, na ihe nile ọbụla ọ ga-ahọpụtara ha ga-emezurịrị.

23 Na ka ndị m nile ndị bi mpaghara nile gbaa gburugburu kwesị-ntụkwasị-obi, na na-ekpe ekpere, na dị-umeala n’iru m, ma ghara ikwupụta ihe nile nke m kpughere nye ha, rụo mgbe ọ bụ amamihe n’ime m ka ekwupụta ha.

24 Ekwula maka ikpe nile, ọ bụghị ma-ọbụ anyaa isi nke okwukwe ma-ọbụ oke ọrụ, mana kpachara-anya gbakọtaa otu ebe, ka okwere mee n’ọtụ mpaghara, sonyesie ike n’ihe mmetụta nile nke ndị mmadụ.

25 Ma lee, a ga m enye unu iru-ọma na amara n’anya ha abụọ, ka unu wee zuo ike an’udo na nchekwa, ka unu na-asị ndị mmadụ: Mee ihe ekpere n’ikpe na ikpe ziri-ezi nye anyị dịka iwu kwuru, na kwụghachi anyị maka ihe ọjọọ nile emesoro anyị.

26 Ugbụ a, lee, a sị m unu, ndị enyi m, n’ụzọ dị otu a unu ga-achọta iru-ọma n’anya-abuọ nke ndị mmadụ, ruo mgbe andị agha nke Israel ga-adị ukwuu karịa.

27 Ma a ga m eme ka obi nile nke ndị mmadụ dị nro, dịka m mere obi nke aFero, site n’oge ruo n’oge, ruo mgbe nwa odibo m Joseph Smith, Nta, na ndị okenye m, ndị m họpụtaworo, ga-enwe ohere ịkpọkọta ndị ike nile nke ụlọ m.

28 Na ime ka e ziga ndị aamamihe, imezu nke ahụ m nyere n’iwu gbasara bịzụkọta ala nile na mpaghara ógbè Jackson nke enwere ike ịzụta, na n’ebe mpaghara nile dị nso ya gbaa gburugburu.

29 N’ihi ọ bụ uche m ka ala ndịa bụrụ ihe azụtara; ma mgbe azụtachara ha, ka ndị nsọ m nwere ha dịka iwu nke annyefechasị nke m nyeworo.

30 Ma mgbe azụworo ala ndị a, a ga m agụ andị agha nke Israel ka ndị ikpe na-amaghị n’iwere ala nile nke ha, nke ha zụtaworo n’ego ha mgbe gara-aga, na maka ịkwatu ụlọ-elu tọwa nile nke ndị iro m nke nọ n’elu isi ha, na kposasia ndị nche ha, na bbọọ-ọbọ n’isi ndị iro m ruo ọgbọ nke atọ na anọ nke ndị kpọrọ m asị.

31 Mana mbụ, ka ndị agha m buo nnukwu ibu, na ka ae doo-ya-nsọ n’iru m, ka ọ dị ọcha dịka anyanwụ, na na-enwu dịka bọnwa, na ka ọkọlọtọ ya nile dị egwu nye mba nile.

32 Ka ala-eze nile nke ụwa bụrụ ndị amanyere ikwere na ala-eze nke Zaịọn bụ n’ezie aala-eze nke Chineke anyị na Kraịst ya, ya mere, ka anyị bụrụ ndị bna-erube isi n’ịwu ya nile.

33 N’ezie a sị m unu, ọ dị m mkpa ka ndị okenye mbụ nke nzukọ-nsọ m wee-nata aonyinye dị nsọ ha site n’ebe dị elu n’ime n’ụlọ nke m, nke m nyeworo iwu ka ewuo nye n’aha m n’ala nke Kirtland.

34 Na ka iwu-nsọ nile ndị m nyeworo gbasara Zaịọn na aiwu ya bụrụ ihe emere na mezuo mgbe agbapụtachara ya.

35 E nwewo ụbọchị nke aọkpụkpọ-oku mana oge abịawo maka ụbọchị nke nhọpụta, ma ka ndị a họrọ bụrụ ndị bkwesịrị-ekwesị.

36 Ma a ga-ekpughe ya nye nwa odibo m, site n’olu nke Mụọ, ndị a aahọpụtara, ma ha ka a bga-edo-nsọ.

37 Na ọ bụrụ raa na ha esọrọ andụmọdụ nke ha natara, ha ga-enwe ike mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị imezu ihe nile gbasara Zaịọn.

38 Ma ọzọ a si m unu, riọ nụ maka udo, ọbụghị nani n’aka ndị mmadụ ndị nke lụsoro unu agha, mana kwa n’aka ndị mmadụ nile.

39 Na welite nụ aọkọlọtọ nke budo, na maa-ọkwa nke udo ruo na nsọtụ nile nke ụwa.

40 Na kwupụta ebu m n’uche maka udo nye ndị ahụ nke busoro unu agha, dịka olu nke mụọ nke dị n’ime unu, na aihe nile ga-arụkọ ọrụ maka ọdị-nma unu.

41 Ya mere, kwesị nụ ntụkwasị-obi; na lee, na hụrụ, a anọnyeere m unu ọbụna ruo ọgwụgwụ. Ọbụna otu a. Amen.