Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 64


Nkeji 64

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye ndị-okenye nke Nzukọ-nsọ, na Kirtland, Ohio, 11 Septemba 1831 (History of the Church, 1:211–214). Onye-amụma naara ejikere ịga Hiram, Ohio, ịmalitegharị ọrụ ya na ntụgharị-asụsụ nke Bible, nke ọ hapụrụ mgbe ọ nọ na Missouri. Otu òtù nke ụmụnne-nwoke ndị e nyeworo iwu ije na Zaịọn (Missouri) dị kwaara n’oke njikere ị pụ na Oktoba. N’oge a n’enweghị ohere ka a natara mkpughe ahụ.

1–11, Ndị-nsọ ka e nyere iwu onye ọbụla ịgbaghara ibe ya, ma ọ bụghị otu a mmehie dị ukwuu karịa fọdụrụ n’ime ha; 12–22, Ndị n’echegharịghị ka a ga-akpọpụta n’iru Nzukọ-nsọ; 23–25, Onye ahụ nke na-akwụ otu ụzọ n’ime ụzọ iri ya a gaghị erepịa n’ọkụ mgbe Onye-nwe ga-abịa; 26–32, Ndị-nsọ ka a dọrọ aka-na-ntị megide iji ụgwọ; 33–36, Ndị nnupụ-isi ka a ga ekewapụ site na Zaịọn; 37–40, Nzukọ-nsọ ahụ ga-ekpe mba nile ikpe; 41–43, Zaịọn ga-aba ụba.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe Chineke unu kwuru nye unu, O unu ndị-okenye nke Nzukọ-nsọ m, n̄aa nụ ntị ma nara, ma nata nụ uche m gbasara unu.

2 N’ihi na n’ezie a sị m unu, a chọrọ m ka unu amerie ụwa; ya mere a ga m enwe bọmiko nye unu.

3 Ọ dị ndị nọ n’etiti unu ndị mehieworo; mana n’ezie a sị m, n’otu ugboro a, n’ihi aotuto nke m, ma n’ihi nzọpụta nke mkpụrụ-obi nile, a bgbaghaworo m unu mmehie unu nile.

4 A ga m enwe obi ebere nye unu, n’ihi na e nyewo m unu ala-eze ahụ.

5 Ma aọtụghe ụzọ nke ihe omimi nile nke ala-eze agaghị abụ ihe a napụrụ site n’aka nwa odibo m Joseph Smith, Nta, site n’ụzọ nke m họpụtara, ka ọ na-adị ndụ, ma ọ bụrụraa na ọ na-edebe bemume-nsọ m nile.

6 E nwere ndị chọworo ohere imegide ya n’enweghi ihe kpatara ya;

7 Otu osila dị, o mehiewo; mana n’ezie a sị m unu, mụ, Onye-nwe, ana-agbaghara mmehie nile nye ndị bkwupụtara mmehie ha n’iru m ma rịọ mgbaghara, bụ ndị n’emeghị mmehie ruo cọnwụ.

8 Ndị na-eso-ụzọ m, n’ụbọchị mgbe ochie, chọrọ aohere imegide onwe ha ma ha agbagharaghị onwe ha n’ime obi ha nile; ma n’ihi ihe ọjọọ nke a a tara ha ahụhụ ma e nyere ha mkpagbu ma btaa ha ahụhụ nnukwu.

9 Ya mere, a sị m unu, na unu kwesịrị aịgbaghara ibe unu; n’ihi na onye bn’agbagharaghị nwanne ya mmehie ya ka ikpe mara n’iru Onye-nwe; n’ihi n’ime ya ka mmehie dị ukwuu fọdụrụ karịa.

10 Mụ, Onye-nwe, ga aagbaghara onye m chọrọ ị gbaghara, mana nye unu a chọrọ ka unu bgbaghara mmadụ nile.

11 Ma unu kwesịrị ikwu n’ime obi unu nile—ka Chineke akpee ikpe n’etiti mụ na gị, ma nye gị ụgwọ-ọrụ gị dịka bọrụ gị nile siri dị.

12 Ma onye ahụ nke n’echegharịghị site na mmehie ya nile, ma ekwupụtaghị ha, unu ga-akpọpụta n’iru anzukọ-nsọ, ma meso ya dịka akwụkwọ-nsọ kwuru nye unu, ma-ọbụ site n’iwu-nsọ ma-ọbụ mkpughe.

13 Ma nke a ka unu ga-eme ka Chineke nara otutu—ọ bụghị n’ihi na unu anaghị agbaghara, enweghi ọmiko, mana ka unu nwere nkwado ziri-ezi n’anya nile nke iwu, ka unu ghara ịmehie ya onye nke bụ onye na-enye unu iwu—

14 N’ezie a sị m, n’ihi nke a unu ga-eme ihe ndị a nile.

15 Lee, mụ, Onye-nwe, weworo iwe megide onye bụụrụ odibo m Ezra Booth, na kwa nwa odibo m Isaac Morley, n’ihi na ha e debeghị iwu ahụ ma-ọbụ iwu-nsọ ahụ;

16 Ha chọrọ ihe ọjọọ n’ime obi ha, ma mụ, Onye-nwe, jichiri Mụọ m. Ha amara ikpe dịka ihe ọjọọ ihe ahụ nke n’enweghị ihe ọjọọ dị n’ime ya, otu o sila dị a gbagbarawo m nwa odibo m Isaac Morley.

17 Ma kwa nwa odibo m aEdward Partridge, lee, o mehiewo, ma bSetan na-achọ ibibi mkpụrụ-obi ya; mana mgbe a ga-eme ka ha mata ihe ndị a nile, ma ha e si n’ihe ọjọọ nke ahụ chegharịa, a ga-agbaghara ha.

18 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m na ọ dị m mkpa na nwa odibo m Sidney Gilbert, mgbe ntakịrị izu-ụka gasịrị, ga-alota n’ọrụ ya, na kwa na nnọchịta anya ya n’ala nke Zaịọn;

19 Ma ihe nke ahụ nke ọ hụworo ma nụwọ nwere ike ịpụta ìhè nye ndị na-eso ụzọ m, ka ha ghara ịla n’iyi. Ma n’ihi nke a ka m kwuworo ihe ndị a nile.

20 Ma ọzọ, a sị m unu, ka nwa odibo m Isaac Morley ghara ị bụ onye a anwara karịa ihe o nwere ike ịnagide, ma nye ndụmọdụ ọjọọ nke ga-emerụ unu arụ, e nyere m iwu-nsọ ka e ree ubi ya.

21 Ekwetaghị m ka nwa odibo m Frederick G. Williams ree ubi ya, n’ihi na mụ, Onye-nwe, chọrọ ka e dota ebe mgbaba siri ike n’ala nke Kirltand, n’oge dịka afọ ise, n’ime nke mụ n’agaghị akwatu ndị ajọọ-mmadụ, ka site na nke a a hatara m ịzọpụta ụfọdụ.

22 Ma ụbọchị ahụ gasịa, mụ, Onye-nwe, agaghị agụ onye ọbụla dịka onye aikpe mara bụ onye ga-eji obi dị ọcha jee n’ala nke Zaịọn; n’ihi na mụ, Onye-nwe, chọrọ bmkpụrụ-obi nile nke ụmụ nke mmadụ.

23 Lee, ugbụ a a na-akpọ ya ataa ruo bn’ọbịbịa ahụ nke Ọkpara nke Mmadụ, na n’ezie ọ bụ ụbọchị nke cịchụ-aja, na ụbọchị nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị m; n’ihi na onye ahụ nke na-akwụ dotu ụzọ n’ụzọ iri ya ka a na-agaghị eerepịa n’ọkụ n’ọbịbịa ya.

24 N’ihi na mgbe taa gasịrị ka anrepịa ga-abịa—nke bụ ikwu dịka n’ụzọ nke Onye-nwe n’ihi n’ezie a sị m, echi bndị mpako na ndị na-eme ajọọ omume ga-adị dịka ahịhịa kpọrọ nkụ; ma a ga m erepịa ha, n’ihi na a bụ m Onye-nwe nke usuu nile nke ndị-agha; ma a gaghị m ahapụ onye ọbụla nke fọdụrụ na cBabịlọn.

25 Ya mere, ọbụrụ na unu kwere na mụ, unu ga-arụ ọrụ mgbe a na-akpọ ya taa.

26 Ma ọ dịghị mma na ụmụ odibo m, aNewel K. Whitney na Sidney Gilbert, ga-ere bụlọ-akụ ha na ihe-onwunwe ha nile ebe a; n’ihi na nke a abụghị amamihe ruo mgbe ụfọdụ ndị Nzukọ-nsọ, nke fọdụrụ n’ebe a, ga-aga ruo n’ala nke Zaịọn.

27 Lee, e kwuru ya n’iwu m nile, ma-ọbụ, ihe a na-asọ nsọ, iji ndị iro gị nile aụgwọ;

28 Mana lee, ekwughị ya n’oge ọbụla na Onye-nwe agaghị ewere mgbe ọ masịrị ya, ma kwụọ ụgwọ dịka ọ dị ya mma.

29 Ya mere, n’ihi na unu bụ ndị na-anọchi-anya, unu nọ n’ozi nke Onye-nwe; ma ihe ọbụla unu mere dịka uche nke Onye-nwe siri dị bụ ọrụ nke Onye-nwe.

30 Ma Ọ họpụtara unu ịrọpụtara ndị-nsọ ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a nile, ka ha wee nweta aihe nketa n’ala nke Zaịọn.

31 Ma lee, mụ, Onye-nwe, na-ekwupụta nye unu, ma aokwu m nile bụ ezie ma ha agaghị bada, ka ha wee nweta ya.

32 Mana ihe nile garịrị emezu n’oge ha.

33 Ya mere, aike agwụla unu n’obi n’ime ihe ọma, n’ihi na unu na-atọ ntọ-ala nke oke ọrụ. Ma site bn’ihe nta nile ka oke ihe si apụta.

34 Lee, Onye-nwe, achọrọ bobi na echiche dị na njikere, ma ndị dị na njikere na ndị cna-erube isi ga-eri ihe ọma nke ala nke Zaịọn n’ụbọchị ikpeazụ ndịa.

35 Ma andị nnupụ-isi ka a bga-ebepụ site n’ala nke Zaịọn, ma a ga-achụpụ kwa ma ha agaghị eketa ala ahụ.

36 N’ihi na, n’ezie a sị m na ndị nnupụ-isi abụghị nke ọbara nke aEfraim, ya mere a ga-aghọpụ ha.

37 Lee, mụ, Onye-nwe emewo nzukọ-nsọ m n’ụbọchị ikpeazụ ndịa dịka Onye-ikpe nọdụrụ-ala n’elu ugwu, ma-ọbụ n’ebe dị elu ikpe mba nile ikpe.

38 N’ihi na ọ ga-eru mgbe ndị nile bị na Zaịọn aga-ekpe ikpe ihe nile metụtara Zaịọn.

39 Ma ndị ụgha nile na ndị iru-abụọ ka ha ga-anwapụta ma ndị ahụ n’abụghị andị-ozi na ndị-amụma ka a ga-ama.

40 Ma ọbụna aụkọchukwu, onye bụ bonye-ikpe, na ndị ndụmọdụ ya, ọbụrụ na ha ekwesighị ntụkwasị-obi cn’ọkwa-ọrụ ha a ga-ama ha ikpe, ma dndị ọzọ ga-anọchi n’ọnọdụ ha.

41 N’ihi na, lee, a sị m unu na aZaịọn ga-aba ụba, ma bebube nke Onye-nwe ga-adakwasị ya;

42 Ma ọ ga-abu aihe nlere-anya nye ndị mmadụ, ma ga-abịakwute ya site na mba ọbụla nke nọ n’okpuru elu-igwe.

43 Ma ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe mba nile nke ụwa aga-ama jijiji site ya, ma ga-atụ egwu n’ihi ndị ya dị egwu. Onye-nwe ekwuwo ya. Amen.