Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 79


Nkeji 79

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram, Ohio, Maach 1832 (History of the Church 1:257).

1–4, Jared Carter ka a kpọrọ ikwusa ozi-ọma site n’aka Onye-nkasi-obi.

1 N’ezie a sị m unu, na ọ bụ ọchịchọ m na nwa odibo m Jared Carter ga-aga ọzọ n’ime mba nile nke ọwụwa anyanwụ, site ebe rute n’ebe, ma site na nnukwu obodo ruo na nnukwu obodo, n’ike nke aechichi nke ejiri chie ya echichi na-ekwusa ozi-ọma nke ọke ọn̄ụ, ọbụna ozi-ọma mgbe nile na-adigide.

2 Ma a ga m ezipụrụ ya aOnye-nkasị-obi nke ga-akụziri ya ezi-okwu ahụ na ụzọ nke ọ ga-aga;

3 Ma ọbụrụraa na ọ ga-ekwesị ntụkwasị-obi, a ga m ejiri ukwu-ọka nile kpube ya okpu-eze ọzọ.

4 Ya mere, ka ị nwee obi-ụtọ, nwa odibo m Jared Carter, ma aatụla ụjọ, ka Onye-nwe gị kwuru, ọbụna Jisus Kraịst. Amen.