Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 67


Nkeji 67

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Hiram; Ohio, Novemba 1831 (History of the Church, 1:224–225). Oge ahụ bụ nke ọgbakọ pụrụ iche, ma mbipụta ahụ nke mkpughe nile anataworo n’aka Onye-nwe site n’Onye-amụma ka a tụlere ma jiri mee ihe (lee isi okwu nke nkeji 1). E kpebiri na Oliver Cowdery na John Whitmer ga-ewere ndèrè-n’aka nke mkpughe nile ahụ jee Independence, ebe W.W. Phelps ga-ebipụta ha dịka Book of Commandments (Akwụkwọ nke Iwu-nsọ nile). Ọtụtụ ụmụnne nwoke gbara ama dị mkpa na mkpụghe nile ahụ achịkọtara mgbe ahụ maka mbipụta bụ ezi-okwu n’ezie, dịka Mụọ Nsọ siri gbaa aka-ebe wụkwasị ha. Onye-amụma depụtara na mgbe a natasịrị mkpughe nke ahụ a maara dịka nkeji l, e nwetara okwu nkatọ gbasara asụsụ e jiri dee mkpughe nile ahụ. Mkpughe nke ugbụ a sochiri.

1–3, Onye-nwe na-anụ ekpere nile nke ma na-elekọta ndị okenye ya anya; 4–9, Ọ mara aka n’iru nye onye kachasị ịma ka o mepụta ụdị nke kachasị nta n’ime mkpughe ya nile; 10–14, Ndị okenye kwesịrị ntụkwasị-obi ka a ga-akwalite site na Mụọ ahụ ma ga-ahụ iru nke Chineke.

1 Lee ma n̄aa-ntị, O unu andị okenye nke nzukọ-nsọ m, ndị gbakọworo ọnụ n’onwe unu, ndị m nụworo ekpere ha, na ndị m matara obi ha nile, na ndị ọchịchọ ha bịaruteworo n’iru m.

2 Lee ma hụ aanya m abụọ lekwasịrị unu, ma elu-igwe nile na ụwa nọ n’aka m abụọ, ma akụ na ụba nile nke mgbe ebighi-ebi bụ nkem inye.

3 Unu gbara-mbọ ikwere na unu ga-anata ngozi nke e nyere unu; mana lee, n’ezie a sị m unu na e nwere aụjọ n’ime obi unu nile, ma n’ezie nke a bụ ihe mere unu anataghị.

4 Ma ugbụ a mụ, Onye-nwe, na-enye unu aọgbụgba-ama maka ezi-okwu nke iwu-nsọ nile ndị a ndị nọ n’iru unu.

5 Anya unu lekwasịworo nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ma aasụsụ ya ka unu mataworo, ma adịghị-ike ya nile ka unu mataworo; ma unu achọwo n’obi unu nile ọmụma-ihe ka unu nwee ike ikwupụta karịa asụsụ ya; nke a ka unu makwaara.

6 Ugbụ a, chọọ nụ site n’Akwụkwọ nke Iwu-nsọ nile, ọbụna nke kachasị nta n’etiti ha, ma họpụta onye ahụ nke kachasị amara ihe n’etiti unu;

7 Ma-ọbụ, ọbụrụ na o nwere onye ọbụla n etiti unu nke nwere ike ime otu dịka ya, mgbe ahụ ikpe amaghị unu n’ikwu na unu amataghị na ha bụ ezi-okwu;

8 Mana ọbụrụ na unu enweghi ike ime otu dịka ya, unu nọ n’okpuru amamikpe ma ọbụrụ na unu aagbaghị ama na ha bụ ezi-okwu.

9 N’ihi na unu maara n’enweghị ihe n’ezighị-ezi n’ime ha, na ihe nke bụ aezi-omume sitere n’elu bịa, site n’aka Nna nke bìhè nile.

10 Ma ọzọ, n’ezie a sịm unu, na ọ bụ ohere-ọma unu, na nkwa m nyere unu ndị echiworo echichi ịgbasa ozi-ọma nke a, na ọbụrụra na unu etufue aekworo na bụjo nile, ma mee onwe unu cumeala n’iru m n’ihi na unu adịghị umeala otu o kwesịrị, a ga-adọwa dakwa mgbochi ahụ ma unu ega-ahụ m ma mata na A bụ m—ọbụghị jiri anụ arụ ma-ọbụ echiche ụdị okike, mana jiri ụdị nke mụọ.

11 N’ihi na onweghị aonye ọbụla hụworo Chineke n’oge ọbụla n’anụ arụ, ma ọbụghị na nkwalite site na Mụọ nke Chineke.

12 Ma-ọbụghị ma onye nke aụdị okike onwere ike ịnọgide n’iru nke Chineke, ọbụghị ma n’ụdị nke echiche anụ arụ.

13 Unu enweghi ike ịnọgide n’iru nke Chineke ugbụ a, ọbụghị ma-ọbụ ije-ozị nke ndị mụọ-ozi nile; ya mere gaa nụ n’iru na andidi ruo mgbe unu bzuru-oke.

14 Ka echiche unu nile ghara ịlaghachi azụ; ma mgbe unu atozuru oke, n’oge nke m, unu ga-ahụ ma mata nke ahụ enyefere unu site n’aka abụọ nke nwa odibo m Joseph Smith, Nta. Amen.