Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 104


Nkeji 104

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma, 23 Epril 1834, gbasara usoro njikọta ọnụ, ma-ọbụ otu nke nzukọ-nsọ maka ọdinma nke ndị ogbenye (History of the Church, 2:54–60). Oge ahụ bụ nke ọgbakọ kansụl nke Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na ndị isi nchụ-aja ndị ọzọ ebe elebara anya na mkpa nke arụ dagidere ndị mmadụ. Otu Njikọ aka ọnụ ahụ dị na Kirtland ka aga ekposa nwaoge ma hazigharịa, na arịa nile dịka ọkwa ọrụ nile bụ nke a ga-eke n’etiti ndị otu nile.

1–10, Ndị nsọ nile ndị mehiere megide usoro njikọta ọnụ ka a ga-abụ ọnụ; 11–16, Onye-nwe na-enye ndị nsọ ya ihe n’ụzọ nke ya; 17–18, iwu nke ozi-ọma na-achị nlekọta nke ndị ogbenye; 19–46, ọkwa ọrụ nile na ngọzi nile nke ụmụ nna nile ka-akpọpụtara; 47–53, Usoro njikọta ọnụ nọ na Kirtland na otu ahụ nọ na Zaịọn ga-arụ ọrụ iche-iche; 54–66, Akụ ahụ edoro nsọ nke Onye-nwe ka ehiwere maka mbipụta nke akwụkwọ nsọ nile; 67–77, Akụ nile nke ndị otu njikọ aka ọnụ ga n’aru ọrụ na nkwekọrịta zuru ọha; 78–86, Ndị nọ na usoro njikọta ọnụ ga-akwụ ụgwọ ha nile, na Onye-nwe ga-anapụta ha site na mkpagbu nke ego.

1 N’ezie a sị m unu ndị enyi m, e nye m unu ndụmọdụ, na otu iwu-nsọ, gbasara arịa nile nke bụ nke otu nke m nyere n’iwu ka-ahazie ma hiwe, ka ọbụrụ ausoro njikọta ọnụ, na kwa usoro mgbe nile na-adigide maka ọdịnma nke ndị nzukọ m, na nzọpụta nke ndị mmadụ ruo mgbe m ga-abịa—

2 Jiri nkwa agwụ-agwụ na-agbanweghị agbanwe, na ọbụrụ raa na ha ndị m nyere iwu ekwesị ntụkwasị obi, ha ga-abụ ndị ejiri ọtụtụ ngọzi nile gọzie;

3 Mana ọbụrụ raa na ha ekwesịgh ntụkwasị-obi, ha nọ-nso ibụ ihe abụrụ-ọnụ.

4 Ya mere, ọ bụrụ na ụfọdụ ndị odibo m edebeghị iwu-nsọ ahụ, mana ha-emebiwo ọgbụgba-ndụ ahụ site na aanya-ukwu ha, na jiri okwu nrafu nile, a bụwo m ha ọnụ jiri nnukwu ajọọ ihe-otiti na ọbụbụ-ọnụ di egwu.

5 N’ihi mụ, Onye-nwe ahụ, e nyewo iwu-ọkụ n’obi m, na ọ bụrụraa na onye ọbula nke bụ onye otu ahụ abụrụ onye achọpụtara na njehie, ma-ọbụ na nsụgharị okwu, emebie ọgbụgba-ndụ ahụ nke eji kekọọ unu ọnụ, a ga-abụ ya ọnụ na ndụ ya nke a, ma ọ ga-abụ onye azọdara ala site n’aka onye m chọrọ;

6 N’ihi mụ, Onye-nwe, abụghi onye aana-akwa emu n’ihe ndị a—

7 Na ihe ndia, ka onye aka ya dị-ọcha n’etiti unu ghara ịbu onye amara-ikpe ya na onye ajọọ-omume; na ka onye ikpe mara n’etiti unu ghara inwe ebe mgbapụ; n’ihi mụ, Onye-nwe ekwewo unu nkwa aokpu-eze nke ebube n’aka nri nke m.

8 Ya mere, ọ bụrụ na achọpụta unu ndị mmebi-iwu, unu apụghị ịgbanarị iwe-ọkụ m na ndụ unu nile.

9 Ọ bụrụ raa na e akewapụ unu n’ihi mmebi-iwu, unu a gaghị enwe ebe mgbapụ site na bahụhụ nile nke cSetan ruo ụbọchị nke mgbapụta.

10 Ma e nye m unu ike ugbu a site n’awa nke a, na ọ bụrụ na onye ọbụla n’etiti unu nke otu ahụ, bụ onye achọpụtara dika onye mmebi-iwu ma o chegharịgh site n’ihe ọjọọ ahụ, na unu ga-enyefe ya na ahụhụ nile nke Setan, ma ọ gaghị enwe ike aiweta ihe ojọọ megide unu.

11 Ọ bụ amamihe n’ime m, ya mere, otu iwu-nsọ ka m na-enye unu, ka unu hazie onwe unu na nyefee onye ọbụla aọkwa ọru nke ya.

12 Ka onye ọbụla nwee-ike mee nkọwasi nye m maka ọkwa ọrụ nke e nyefere ya na aka.

13 Ọ dị mkpa ka mụ, Onye-nwe, mee ka onye ọbụla nye ankọwa dịka bonye ọrụ n’elekọta ngọzi nile nke ụwa nke m meworo ma kwadoo maka ihe nile m kere-eke.

14 Mụ, Onye-nwe, setịpụrụ elu-igwe nile, ma awuo ụwa, baka ọrụ nke m; na ihe nile nọ n’ime ya bụ nke m.

15 Ma ọ bụ nzube m ị rọpụta ihe maka ndị nsọ nke m, n’ihi ihe nile bụ nke m.

16 Mana ọ dị mkpa ka e mee ya an’ụzọ nke m, ma lee nke a bụ ụzọ ahụ bụ nke mụ, Onye-nwe, nyeworo iwu-ọkụ iji rọpụtara ndị nsọ m, ka bndị ogbenye bụrụ ndị ebuliri elu, n’ihi na ndị ọgaranya ka ewedara ala.

17 N’ihi na aụwa juru n’ọnụ, na ihe nile zuru-oke ma karia, e, a kwadoro m ihe nile, na nyewo ụmụ nke mmadụ ịbụ bndị nnọchita-anya nye onwe ha.

18 Ya mere, ọ buru na onye ọbụla ga-ewere site an’uju nke m meworo, ma nyepụghị oke nke ya, dịka biwu nke ozi-ọma, nye cogbenye na onye nwere mkpa, ọ ga, ya na ndị-ajọọ-omume ewelite anya ya abụọ dn’ala mụọ, n’ime ịta ahụhụ.

19 Ma ugbụ a, n’ezie a sị m unu, gbasara arịa nile nke aotu ahụ—

20 Ka nwa odibo m Sidney Rigdon nwere ebe ahụ obi ugbụ a, na ebe ahụ nile ana agba akpụkpọ anụ, maka ọkwa ọrụ iji nyere ya aka, ka ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’ime ubi vine m dịka m chọrọ, mgbe m ga-enye ya iwu.

21 Na ka e mee ihe nile dịka ndụmọdụ nke usoro ahụ, na nkwekọrịta ejikọrọ-ọnụ ma-ọbụ olu nke usoro ahụ, ndị bi na ala nke Kirtland.

22 Ma ọkwa ọrụ nke a na ngọzi, mụ, Onye-nwe, nyefere nwa odibo m Sidney Rigdon maka ngọzi n’isi ya, na kwa mkpụrụ ya ganọchi ya.

23 Na a ga m amụba ngọzi nile n’isi ya, ọbụrụ raa na ọ ga-adi umeala n’iru m.

24 Ma ọzọ, ka nwa odibo m Martin Harris nwere dịka ihe nketa ya, maka ọkwa ọrụ ya, mpaghara ala ahụ nke nwa odibo m John Johnson nwetara site na mgbanwe maka ihe nketa nke ochie ya, maka ya na mkpụrụ nke ya ga-anọchi ya.

25 Ma ọ bụrụ na o kwesị ntụkwasị-obi, a ga m amụba ngọzi nile n’isi ya na mkpụrụ nke ya ga-anọchi ya.

26 Na ka nwa odịbọ m Martin Harris debe ego ya nile maka ịma-ọkwa nke okwu m nile dịka nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ga-atụzi-aka.

27 Ma ọzọ ka nwa odibo m Frederick G. Williams nwere ebe ahụ obi ugbu a.

28 Ma ka nwa odibo m Oliver Cowdery nwere mpaghara ahụ nke malitere na njikọ ụlọ ahụ nke ga-abụ maka ụlọ-ọrụ mbipụta akwụkwọ, nke bụ mpaghara nke mbụ, na kwa mpaghara ahụ nke nna ya bi.

29 Ma ka ụmụ odibo m Frederick G. Williams na Oliver Cowdery nwere ịrụ ọrụ mbipụta akwụkwọ na ihe nile gbasara ya.

30 Ma nke a ga-abụ ọkwa-ọrụ ha nke a ga-enyefe ha.

31 Ma ọ bụrụ raa na ha kwesịrị ntụkwasị-obị, lee a ga m a gọzi na mụbaa ngọzi nile n’isi ha.

32 Ma nke a ga-abụ mmalite nke ọkwa-ọrụ nke m na-enyefe ha, maka ha na kwa mkpụrụ ha ga-anọchi ha.

33 Ma ọ bụrụ na ha ekwesi-ntụkwasị-ọbị, a ga m amụba ngọzi nile n’isi ha na mkpụrụ ha ga-anọchi ha, ọbụna nnukwu mmụba nke ngọzi nile.

34 Ma ọzọ, ka nwa odibo m John Johnson nwere ụlọ ahụ o bi n’ime ya, na ihe nketa nile, ha nile ewezuga ala ahụ nke edotara maka aiwu-ụlọ m nile, nke metụtara ihe nketa ahụ, na mpaghara ndị ahụ nile nke akpọworo aha maka nwa-odibo m Oliver Cowdery.

35 Ma ọ bụrụ na o kwesi ntụkwasị obi, a ga m amụba ngọzi nile n’elu isi ya.

36 Ma ọ bụ uche m ka o ree mpaghara nile nke ekewapụtara maka iwulite obodo-ukwu nke ndị nsọ m nile, ọ bụrụ raa na a ga-eme ka ọ mara ya site an’olu nke Mụọ, ma dịka ndụmọdụ nke usoro ahụ, na site n’olu nke usoro ahụ.

37 Na nke a bụ mmalite nke ọkwa-ọrụ nke m nyefere ya, maka ngọzi nye ya na kwa mkpụrụ ya ga-anọchi ya.

38 Na ọ bụrụ na o kwesi-ntụkwasị obi, a ga m amụba nnukwu mmụba nile n’isi ya.

39 Ma ọzọ, ka nwa odibo m Newel K. aWhitney nwere dịka e nyere ya ụlọ nile ahụ na mpaghara ebe o bi ugbua, na mpaghara na ụlọ ebe ahụ ụlọ azụ-m-ahịa nile guzo, na kwa mpaghara nke nọ na akụkụ ndịda nke ụlọ azụm-ahịa, na kwa mpaghara ebe ana abụ ọkụkọ.

40 Ma ihe ndị a ka m họpụtaworo nye nwa odibo m Newel K. Whitney maka ọkwa-ọrụ ya, maka otu ngọzi n’isi ya na mkpụrụ ya ga-anọchi ya, maka ọdinma nke ụlọ azụm-ahịa nke usoro m nke m hiwere maka stek nkem n’ala nke Kirtland.

41 E, n’ezie, nke a bụ ọkwa ọrụ nke m na-enyefe nwa odibo m N. K. Whitney. Ọbụna ụlọ azụ m ahịa nile, ya na aonye nnọchite-anya ya, na mkpụrụ ya ga-anọchi ya.

42 Na ọ bụrụ raa na o kwesi ntụkwasị obi n’idebe iwu-nsọ m nile, nke m nyeworo ya, a ga m amụba ngọzi nile n’ịsị ya na mkpụrụ ya ga-anọchi ya, ọbụna nnukwu mmụba ngọzi nile.

43 Ma ọzọ, ka nwa odibo m Joseph Smith, Nta, nwere dịka nke enyere ya mpaghara ahụ ekewapụtara maka owuwu ụlọ nke m, nke dị antụ iri anọ n ogologo na iri na abụọ na mbara, na kwa ihe nketa nke ahụ nna ya bi na ya ugbụ a.

44 Na nke a bụ mmalite nke ọkwa-ọrụ nke m nyefere ya maka ngọzi nye ya na nye kwa nna ya.

45 N’ihi lee, edotawo m ihe nketa maka anna ya maka nkwado ya, ya mere a ga-agụnye ya n’ụlọ nwa odibo m Joseph Smith, Nta.

46 Na a ga m amụba ngọzi nile n’ụlọ nwa odibo m Joseph Smith, Nta, ọ’bụrụ raa na o kwesi-ntụkwasị-obi, ọbụna nnukwu mmụba ngọzi nile.

47 Ma ugbua otu iwu-nsọ ka m ga-enye unu gbasara Zaịọn, na unu agaghị a bụ kwa ndị ejikọtara dịka ndị usoro njikọ aka, unu na ụmụnna unu nile nke Zaịọn, nanị n’ụdịa—

48 Mgbe ehiwachara unu, a ga-akpọ unu Usoro Njikọta Ọnụ nke aStek nke Zaịọn, Obodo-ukwu ahụ nke Kirtland. Ma ụmụnna unu, mgbe ehiwachara ha, a ga-akpọ ha Usoro Njikọta Ọnụ nke Obodo-ukwu nke Zaịọn.

49 Ma a ga-ehiwe ha n’aha ha nile, na n’aha nke ha; ma ha ga-atụ mgbere-ahịa ha n’aha ha, na n’aha nke ha nile.

50 Ma unu ga-atụ mgbere ahia unu n’aha unu ma n’aha nke unu nile.

51 Ma nke a ka m nyeworo n’iwu ka unu mee maka nzọpụta unu, na kwa maka nzọputa ha, dịka nso n’azụ nke anchụpụta ha na kwa ihe nke gaje ịbịa.

52 aỌgbụgba-ndụ nile a ka a ga-ada iwu ha site na njehie site bn’anya-ukwu na okwu nrafu nile—

53 Ya mere, ekposasiwo unu dịka usoro njikọta ọnụ, unu na ụmụnna unu, n’ihi nke a iwu ejighị kwa unu nanị rute na awa nke a nye ha, ewezuga n’ụzọ dị otu a, dịka m kwuru site na mgbazinye ego dịka a ga-ekwekọ na otu a, n’ime kansụl dịka ọnọdụ unu nile ga-anabata na dịka olu nke kansụl ga-eduzi.

54 Ma ọzọ, otu iwu-nsọ ka m na-enye unu gbasara ọkwa-ọrụ unu nke m nyeworo unu.

55 Lee, arịa ndị a bụ nke m, m’ọbụghị otu ahụ, okwukwe unu bụ ihe efu, ma achọpụtara unu ndị iru-abụọ, na ọgbụgba-ndụ nke unu mere nye m ka a dọwara.

56 Ma, ọbụrụ na arịa ndị a bụ nke m, mgbe ahụ unu bụ andị ọrụ m, m ọbụghị otu a unu abụghị ndị ọrụ.

57 Mana, n’ezie a sị m unu, a họpụtawo m unu ị bụ ndị ọrụ na-elekọta ụlọ nke m, ọbụna ndị ọrụ n’ezie.

58 Na n’ihi ebu m n’obi nke a, e nyewo m unu iwu ịhazi onwe unu, ọbụna ibipụta okwu am nile, uju nke akwụkwọ nsọ m nile, mkpughe nile nke m nyeworo unu, na nke m ga, ma emesịa, enye unu site n’oge ruo n’oge—

59 N’ihi nzube nke iwulite nzukọ-nsọ m na ala-eze n’ụwa, na ịkwado ndị nke m maka aoge mgbe m bga-ebi mụ na ha, nke nọ n’ọba aka.

60 Na unu ga-akwadoro onwe unu otu ebe maka nchekwa ihe dị mkpa, na doo ya nsọ n’aha nke m.

61 Ma unu ga-ahọpụta otu onye n’etiti unu ilekọta ebe nchekwa ihe ahụ, ma a ga echi ya echichi baa na ngọzi nke a.

62 Na a ga-enwe ọtu ihe nrachi n’elu ihe nchekwa ihe ahụ, na ihe nsọ nile ka a ga-etinye n’ime ebe ahụ, na onweghị onye n’etiti unu ga-akpọ ya nke ya, ma-ọbụ mpaghara ya ọbụla, n’ihi ọ ga-abụ nke unu nile na nkwekọrịta.

63 Na e nye m unu ya site na awa nke a, ma ugbụ a hụkwa na unu malitere na were ọkwa-ọrụ nke m họpụtara nye unu, ewezuga ihe nsọ nile maka ebu m n’obi nke ibipụta ihe nsọ nile dịka m kwuru.

64 Ma aihe nrite nile nke ihe nile dị nsọ ka a ga-edota n’ime ihe nchekwa ihe na otu ihe nrachi ga-adi n’elu ya, ma a gaghị e ji ya ma-ọbụ wepụta ya n’ime ihe nchekwa ihe site n’aka onye ọbụla, ọbụghị ma a ga-atọpụ akara ahụ dị na ya, nanị site n’olu nke usoro ahụ, ma-ọbụ site na iwu-nsọ.

65 Ma otu a ka unu ga-eji chekwaa ihe nrite nile nke ihe nile dị nsọ n’ime ihe nchekwa ihe, maka ịdị-nsọ na ebum n’obi nsọ nile.

66 Ma nke a ka a ga-akpọ ebe nchekwa ihe dị nsọ nke Onye-nwe, na ihe akara nke a ga-edota n’elu ya ka ọ wee di nsọ ma bụrụ ihe edoro nso nye Onye-nwe.

67 Ma ọzọ, a ga-enwe ebe nchekwa ihe ọzọ akwadoro ka onye oche-ego ahọpụtara ilekọta, ebe nchekwa ihe ahụ, ma ihe akara ka a ga-edota n’elu ya;

68 Na ego nile nke unu natara, n’ọkwa-ọrụ unu, site n’imezi arịa nile nke m nyeworo unu, n’ụlọ nile, ma-ọbụ n’ala nile ma-ọbụ anụ ụlọ nile na-ata ahịhịa ma-ọbụ n’ihe nile ewezuga n’ihe nile edere-ede dị nsọ na-edoro nsọ nke m dotara nye onwe m maka ebum-n’obi nile edoro nsọ ka a ga-atụba n’ime ihe nchekwa ihe ọsọ-ọsọ a natara ego nile dị na narị narị, ma-ọbụ iri-ise, iri-ise, ma-ọbụ iri abụọ, iri-abụọ, ma-ọbụ iri iri, ma-ọbụ ise-ise.

69 Ma-ọbụ asugharịa ya, ọ bụrụ na onye ọbụla n’ime unu enweta dọla ise ka ọ tunye ha n’ime ihe nchekwa ihe ahụ, ma-ọbụ ọbụrụ na o nwetara iri, ma-ọbụ iri abụọ, ma-ọbụ iri ise, m obụ otu nari, ka o mee kwa otu ahụ.

70 Ma ka onye ọbụla n’ime unu ghara ikwu na ọ bụ nke ya, n’ihi a gaghị akpọ ya nke ya, ma-ọbụ mpaghara ya ọbụla.

71 Ma e nweghị mpaghara ya ọbụla nke a ga-emefu ma-ọbụ wepụ site na ebe ihe nchekwa ihe ahụ, nanị site na olu na nkwekọrịta nke ndị usoro.

72 Na nke a ga-abụ olu ahụ na nkwekọrịta nke otu ahụ—na onye ọbụla n’etiti unu ga-agwa onye oche-ego: e nwere m mkpa nke a iji nyere m aka n’ọkwa-ọru m—

73 Ọbụrụ na ọ bụ dọla ise, ma-ọbụ kwa na ọ bụ dọla irị ma-ọbụ iri abụọ, ma-ọbu iri ise, ma-ọbụ otu narị, Onye-oche-ego ga-enye ya ego-ole ọ chọrọ ga-enyere ya aka n’ọkwa-ọrụ ya.

74 Ruo mgbe a chọpụtara ya dịka onye njehie, na ọ pụtara ìhè n’iru kansụl nke usoro na gbaa mbara na ọ bụ onye n’ekwesigh ntụkwasị-obi na onye ọrụ n aenweghi uche.

75 Mana mgbe nile ọ nọ na-ntozu oke, ma kwesị ntụkwasị-obi ma nwee uche n’ọkwa-ọrụ ya, nke a ga-abụ ihe aka-ebe ya nye oche-ego nke onye oche-ego agaghị ejichi.

76 Mana ọ bụrụ na njehie adị, onye-oche-ego ga-anọ n’okpuru ndị kansụl na olu nke ndị usoro.

77 Ma ọ bụrụ na onye-oche-egọ bụ odibo n’ekwesighi ntụkwasị-obi na onye n’enweghi uche, ọ ga-anọ n’okpuru na olu nke kansụl, ma a ga-ewepụ ya site n’ọnọdụ ya, ma a ga-ahọpụta aonye ọzọ n’ọnọdụ ya.

78 Ma ọzọ n’ezie asi m unu, gbasara ụgwọ unu nile—lee ọ bụ uche m ka unu akwụsia bụgwọ nile unu ji.

79 Ma ọ bụ uche m ka unu mee onwe unu aumeala n’iru m, ma nata ngọzi a site na bmgbalị unu na idi-ume ala na ekpere nke okwukwe.

80 Ma ọ bụrụ raa na unu na arụsi ọrụ ike na di-umeala, ma na-ekpe aekpere nke okwukwe, lee, a ga m eme ka obi nile dị nro bụ nke ndị unu ji-ụgwọ, ruo mgbe m ga e zipụtara unu ụzọ maka nnapụta unu.

81 Ya mere dee nụ akwụkwọ ọsọ-ọsọ nye New York na dee dika nke ahụ aMụọ m ga eduzi, ma a ga m eme ka obi ndị ahụ dị nro bụ ndị unu ji ugwọ, n’ihi a ga-ewepụ ya site n’obi ha nile iweta nsogbu bukwasị unu.

82 Ma ọ bụrụ raa na unu adị aumeala na kwesi ntụkwasị-obi na kpọkuo aha m lee, a ga m enye unu bmmeri ahụ.

83 E kwe m unu otu nkwa, na a ga-anapụta unu otu ugboro a site n’ịbụ oru.

84 Ọ bụrụ raa na unu enwee ohere ịgbazita ego site na narị narị, ma-ọbụ na puku, puku ruo mgbe unu ga-anata ole ga-ezuru unu inapụta onwe unu site n’ịbụ oru, ọ bụ ohere unu.

85 Na were nụ aria nile nke m tinyeworo n’aka unu mee ihe aka-ebe, ugbụ a, site na inye aha unu nile site na nkwekọrịta ozuzu ọha ma-ọbụ n’ụzọ ọzọ, otu ọ ga-adị unu mma.

86 E nye m unu ohere nke a, ugbụ a, ma lee, ọbụrụ na unu agaa-n’iru ime ihe nile nke m tọgbọworo n’iru unu, dịka iwu-nsọ m nile, ihe ndịa nile bụ nke m, na unu bụ ndị ọrụ m na nna-ukwu ahụ a gaghị ekwe ka ekposasia ụlọ ya. Ọbụna otu a. Amen.