Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 97


Nkeji 97

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 2 Ọugọst 1833 (History of the Church, 1:400–402). Mkpughe nke a metụtara nke ka nke ihe gbasara Ndị-nsọ nọ na Zaịọn, Ógbè Jackson, Missouri, n’ọzịza nye ajụjụ Onye-amụma jụrụ Onye-nwe ihe ọ ga-eme. Ndị-otu Nzukọ-nsọ nọ na Missouri nọ n’oge a n’okpuru mkpagbu dị-ike ma, n’ụbọchị 23 Julaị 1833, a manyewo ha itinye-aka n’akwụkwọ nkwekọrịta ịhapụ Ógbè Jackson.

1–2, Ọtụtụ Ndị-nsọ nọ na Zaịọn (Ógbè Jackson, Missouri) bụ ndị a gọziri maka ịkwesị-ntụkwasị obi ha; 3–5, Parley P. Pratt nwetara ịja-mma maka ọrụ ya nile n’ụlọ-akwụkwọ nke dị na Zaịọn; 6–9, Ndị ahụ ndị na-edebe ọgbụgba-ndụ ha nile ka Onye-nwe na-anabata; 10–17, A ga-ewu ụlọ na Zaịọn n’ime ebe ndị dị-ọcha n’obi ga-ahụ Chineke; 18–21, Zaịọn bụ ndị ahụ dị-ọcha n’obi; 22–28, Zaịọn ga-agbanarị ihe-otiti nke Onye-nwe ma ọbụrụ na o kwesị ntụkwasị-obi.

1 N’ezie a sị m unu ndị enyi m, a na m ekwuru unu okwu n’olu nke m, ọbụna n’olu nke Mụọ m, ka m wee nwee ike igosi unu echiche m gbasara ụmụnna ndị nwoke unu n’ala nke aZaịọn, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị dị ume ala n’ezi-okwu ma na-achọ site n’ịrụsi ọrụ ike ịmụta amamihe na ịchọta ezi okwu.

2 N’ezie, n’ezie a sị m unu, ngọzi na-adịrị ndị dị otu a n’ihi na ha ga-enweta; n’ihi na mụ, Onye-nwe, na-egosi ebere nye ndị nile dị anwayọ n’obi, ma nye onye ọbụla nke m chọrọ, ka m wee nwee ike bụrụ onye ikpe ziri-ezi mgbe m ga-eweta ha n’ikpe.

3 Lee, a sị m unu, gbasara aụlọ-akwụkwọ ahụ nọ na Zaịọn, mụ, Onye-nwe, ọ dị m ezi mma ka e nwee ụlọ-akwụkwọ na Zaịọn, na kwa na nwa odibo m bParley P. Pratt, n’ihi na ọ nọ n’ime m.

4 Ma ọbụrụraa na ọ ga-agan’iru n’ịnọgide n’ime m ọ ga-aga n’iru n’ị nọ n’isi n’ilekọta ụlọ-akwụkwọ dị n’ala nke Zaịọn ruo mgbe m ga-enye ya iwu-nsọ ndị ọzọ.

5 Ma a ga m eji ọtụtụ ngọzi gọzie ya, n’ikọwadaru ala akwụkwọ-nsọ nile na ihe-omimi nile ruo na mwulite mụọ nke ụlọ-akwụkwọ na nke nzukọ-nsọ dị na Zaịọn.

6 Ma nye ndị fọdụrụ n’ụlọ akwụkwọ, mụ, Onye-nwe, nọ na njikere igosi ebere; otu o sila dị, e nwere ndị ahụ kwesịrị aịta-ahụhụ, ma ọrụ ha nile ga-abụ ihe pụtara ìhè.

7 aOnye-ike ahụ ka e debere na mgbọrọgwụ nke osisi nile, ma osisi ọbụla nke na-amịtaghị bmkpụrụ ọma a ga-egbutu ya ma tụba ya n’ime ọkụ. Mụ, Onye-nwe ekwuwo ya.

8 N’ezie a sị m unu, ndị nile nọ n’etiti ha ndị maara na aobi ha bziri ezi, ma tiwaa-etiwa, na mụọ ha echegharịwo ma dị kwa cna-njikere idebe ọgbụgba-ndụ nile site dn’ịchụ-aja—e, aja nke ọbụla nke mụ, Onye-nwe, ga-enye n’iwu—a enabatara m ha.

9 N’ihi na mụ, Onye-nwe, ga-eme ka ha mịpụta dịka ezigbo osisi na-amị mkpụrụ nke a kụrụ n’ezi ala, n’agịga iyi-nta dị-ọcha, nke na-amị ọtụtụ mkpụrụ dị oke ọnụ ahịa.

10 N’ezie a sị m unu, na ọ bụ ọchịchọ m na a ga-ewu aụlọ nye m n’ala nke Zaịọn, dịka bihe nlere anya ahụ nke m nyeworo unu.

11 E, ka e wuo ya ngwa-ngwa, site n’otu ụzọ n’ụzọ iri nke ndị m.

12 Lee, nke a bụ aotu ụzọ n’ụzọ iri ahụ na aja ahụ nke mụ, Onye-nwe, chọrọ n’aka ha nile, ka e wee nwee bụlọ ewụrụ nye m maka nzọpụta nke Zaịọn—

13 Maka ebe ainye ekele maka ndị-nsọ nile, na maka ebe ikuzi ihe nye ndị nile ndị akpọrọ nye n’ọrụ nke ije-ozị n ọkpụkpọ-oku ha nile dị iche iche na ọkwa-ọrụ ha nile;

14 Ka ha wee zuo-oke na anghọta nke ije-ozị ha, n’atụtụ, n’ụkpụrụ, ma n’ozizi, n’ime ihe nile gbasara bala-eze nke Chineke n’ụwa, cọtụghe-ụzọ ahụ nile nke ala-eze ka enyefeworo unu.

15 Ma ọ bụrụraa na ndị nke m ewuo ụlọ m nye m n’aha nke Onye-nwe, ma ekweghị ka ihe ọbụla an’adịghị ọcha bata n’ime ya, ma aghara ịmerụ ya, bebube nke m ga-anọ na ya;

16 E, ma airu nke m ga-adị ebe ahụ, n’ihi na a ga m abata n’ime ya, ma ndị nile bdị-ọcha n’obi ndị ga-abata n’ime ya ga-ahụ Chineke.

17 Mana ọ bụrụ na emerụọ ya a gaghị m abata n’ime ya, ma ebube nke m a gaghị adị n’ebe ahụ; n’ihi na agaghị m abata n’ime temple nile n’adịghị nsọ.

18 Ma, ugbụ a, lee, ọ bụrụ na Zaịọn emee ihe ndị a ọ aga-aba ụba, ma gbasaa onwe ya ma dịrị oke ebube, ezi ukwuu, na oke egwu.

19 Ma amba nile nke ụwa ga-enye ya nsọpụrụ, ma ga-asị: n’ezie bZaịọn bụ nnukwu obodo nke Chineke anyị, ma n’ezie Zaịọn enweghi ike ịda, ọbụghị ma a ga-ewepụ ya pụọ site n’ọnọdụ ya, n’ihi na Chineke nọ ebe ahụ, ma aka nke Onye-nwe dị ebe ahụ;

20 Ma ọ n̄ụwo-iyi site n’ike nke ume ya ịbụrụ nzọpụta ya na atọwa ya nke dị-elu.

21 Ya mere, n’ezie, otu a ka Onye-nwe kwụrụ, ka Zaịọn n̄ụrịa ọn̄ụ n’ihi na nke a bụ aZaịọnndị ahụ dị-ọcha n’obi; ya mere, ka Zaịọn n̄ụrịa ọn̄ụ, ebe ajọọ-mmadụ nile ga-eru uju.

22 N’ihi na lee, ma hụrụ, aịbọ-ọbọ na-abịa ngwa-ngwa n’isi ndị n’amaghị Chineke dịka ifufe gburugburu; ma onye ga-agbanarị ya?

23 aIhe-otiti nke Onye-nwe ga-agafe n’abalị ma n’ehihie, ma akụkọ si na ya ga-ewe ndị nile iwe; e, a gaghị akwụsị ya ruo mgbe Onye-nwe ga-abịa;

24 N’ihi na iwe-ọkụ nke Onye-nwe erewala megide ihe arụ ha nile na ajọọ ọrụ ha nile.

25 Otu o sila dị, Zaịọn aga-agbapụ ma ọbụrụ na o lezie anya ime ihe nile ọbụla nke m nyeworo ya n’iwu.

26 Mana ọbụrụ na o lezighi-anya ime ihe ọbụla nke m nyeworo ya n’iwu a ga m aeleta ya dịka ọrụ ya nile siri dị, jiri bntaram ahụhụ dị ike, jiri ajọọ ọrịa, jiri ajọọ ahụhụ, jiri mma agha, jiri cịbọ-ọbọ, jiri ọkụ dnrepịa.

27 Otu o sila dị, ka agụọ ya otu ugboro a na-ntị ya abụọ, na mụ, Onye-nwe, anabatawo onyinye ya; ma ọbụrụ n’o mehieghị ọzọ aonweghị nke ọbụla n’ime ihe ndia nile ga-adakwasị ya.

28 Ma a ga m eji ngọzi nile agọzie ya, ma mụbaa ọtụtụ ngọzi nile n’elu n’isi ya, ma n’elu ọgbọ ya nile ruo mgbe nile na mgbe nile, ka Onye-nwe Chineke unu kwuru. Amen.