Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 47


Nkeji 47

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 8 Maach 1831 (History of the Church, 1:166). Tutu oge a, Oliver Cowdery arụwo-ọrụ dịka onye ndekọta-akụkọ na onye-ode akwụkwọ, John Whitmer a chọbeghị ọrụ dịka onye ndekọta-akụkọ, mana, n’ihi na a rịorọ ya ka ọ rụọ n’ọkwa nke a, ọ sịrị na ya ga-erube isi n’ọchịchọ nke Onye-nwe n’okwu a. Ọ rụwọ ọrụ dịka onye ode akwụkwọ nke Onye-amụma n’idekọta ọtụtụ n’ime mkpughe nile a natara na Fayette, na mpaghara New York.

1–4, John Whitmer ka a kpọrọ idebe akụkọ nke Nzukọ-nsọ na idere Onye-amụma akwụkwọ.

1 Lee, ọ dị m mkpa na nwa odibo m John ga-ede ma debe aakụkọ kwa mgbe, ma nyere gị aka, nwa odibo m Joseph, n’ideda ihe nile nke a ga-enye gị, ruo mgbe a ga-akpọ ya n’ọrụ ndị-ọzọ.

2 Ọzọ, n’ezie a sị m gị na o nwekwara ike iwelite olu ya na nzukọ nile, mgbe ọbụla nke a dị mkpa.

3 Ma ọzọ, a sị m gị na ọ ga-abụ ihe a họpụtara nye ya idebe akụkọ-ndekọta nke nzukọ-nsọ na akụkọ mgbe nile; n’ihi na Oliver Cowdery ka m họpụtaworo nye ọkwa-ọrụ ọzọ.

4 Ya mere, a ga-enye ya, ọ bụrụraa na o kwesịrị ntụkwasị-obi, site an’Onye-nkasị-obi, ide ihe ndị a. Ọbụna otu a. Amen.