Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 86


Nkeji 86

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith, Onye-amụma, na Kirtland, Ohio, 6 Disemba 1832 (History of the Church, 1:300). Mkpughe nke a ka a natara mgbe Onye-amụma nọ na-elegharị ma na-ahazi akwụkwọ nke e dere n’aka nke ntụgharị-asụsụ nke Bible.

1–7, Onye-nwe nyere nkọwa nke ilu nke ọka na ata nile; 8–11, Ọ wee kọwaa ngọzi nile nke ọkwa nchụ-aja nye ndị ahụ bụ ndị-nketa ala-eze iwu kwadoro dịka n’anụ arụ.

1 N’ezie, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu ụmụ odibo m, gbasara ailu ahụ nke ọka na nke ata nile:

2 Lee, n’ezie a sị m, ubi ahụ bụ ụwa, ma ndị-ozi nile bụ ndị ọgha-mkpụrụ nke mkpụrụ ahụ;

3 Ma mgbe ha na-arahụ ụra nnukwu onye mkpagbu nke nzukọ-nsọ, onye ngọnarị okwukwe ahụ, akwụnakwụna ahụ, ọbụna aBabịlọn, nke na-eme mba nile ịn̄ụ site n’iko nke ya, n’ime obi nke onye-iro ahụ, ọbụna Setan, na-anọrọ-ọdọ ịchị—lee ọ na-akụ ata nile ahụ; ya mere, ata nile ahụ na-akpagbu ọka ma na-a chụba bnzukọ-nsọ n’ime ọzara.

4 Mana lee, n’ụbọchị ndị aikpe-azụ, ọbụna ugbụ a mgbe Onye-nwe na-amalite iwepụta okwu ahụ, ma aka ọka ahụ na-epulite epulite ma ka dịkwa nro—

5 Lee, n’ezie a sị m unu, andị mụọ-ozi nile na-etikuru Onye-nwe n’ehihe na abalị, ndị dị na njikere ma na-eche ka e zipu ha bịghọ ihe ubi ahụ nile;

6 Mana Onye-nwe sịrị ha, efola ata nile ahụ mgbe aka ọka ahụ ka dị nrọ (n’ihi na n’ezie okwukwe unu esigh-ike), ma ọbụghị otu a unu ebibie ọka ahụ kwa.

7 Ya mere, ka ọka ahụ na ata nile tokọta ọnụ ruo mgbe owuwe ihe-ubi ga-achazu; mgbe ahụ unu ga-ebu ụzọ chịkọta ọka site n’etiti ata nile, ma mgbe achịkọtasịrị ọka, lee ma hụrụ, ata nile ka a ga-ekekọta n’ukwu n’ukwu, ma ubi ahụ ga-afọdụ ka e repịa ya.

8 Ya mere, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu, ndị nke aọkwa nchụ-aja nọgidere site n’agbụrụ nke ndị nna unu—

9 N’ihi na unu bụ andị-nketa ala-eze iwu kwadọrọ, dịka n’anụ arụ, ma e bzowo unu site n’anya ndị ụwa na Kraịst n’ime Chineke—

10 Ya mere ndụ unu na ọkwa nchụ-aja ahụ anọgidewo, ma dịkwarịị mkpa ịnọgide site n’aka unu na agbụrụ unu ruo mgbe amweghachite nke ihe nile dịka e kwuru site n’ọnụ nile nke ndị-amụma nsọ nile site na mmalite nke ụwa.

11 Ya mere, ngozi ga-adịrị unu ma ọbụrụ na unu gaa n’iru n’ịdị mma m, aìhè nye ndị Jentaịlụ nile, ma site n’ọkwa nchụ-aja nke a, ọnye-nzọpụta nye ndị nke m bIsrael. Onye-nwe e kwuwo ya. Amen.