Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 53


Nkeji 53

Mkpughe e nyere site n’aka Joseph Smith Onye-amụma nye Algernon Sidney Gilbert, na Kirtland, Ohio, Jun 1831 (History of the Church, 1:179–180). Site n’arịrịọ nke Sidney Gilbert rịọrọ, Onye-amụma jụrụ Onye-nwe gbasara ọrụ na ọkwa nke Nwanne-nwoke Gilbert n’ime Nzukọ-nsọ.

1–3, Ọkpụkpọ Sidney Gilbert na nhọpụta ya n’ime Nzukọ-nsọ bụ ka e chie ya echichi onye-okenye; 4–7, Ọ ga kwa arụ-ọrụ dịka onye nnọchite anya onye-ụkọchukwu.

1 Lee, a sị m gị, nwa odibo m Sidney Gilbert, na a nụwo m ekpere gị nile; ma ị kpọkuwo m ka e mee ka ị mata site n’aka Onye-nwe Chineke gị, gbasara ọkpụkpọ na anhọpụta gị n’ime nzukọ-nsọ, nke mụ, Onye-nwe, weliteworo elu n’ụbọchị ndị ikpe azụ a.

2 Lee, Mụ Onye-nwe, onye a akpọgburu n’ihi mmehie nile nke ụwa, e nye m gị iwu nsọ na ị bga-ahapụ ihe nke ụwa.

3 Wekwasị onwe gị echichi nke m, ọbụna nke onye-okenye, ikwusa okwukwe na nchegharị na ansachapụ nke mmehie nile, dịka okwu m siri dị, na nnabata nke Mụọ Nsọ site n’ibịkwasị baka abụọ n’isi;

4 Na kwa ịbụ aonye-nnọchite anya nye nzukọ-nsọ n’ebe nke ụkọchukwu ga-ahọpụta dịka iwu-nsọ nile siri dị nke a ga-enye ma e mesịa.

5 Ma ọzọ, n’ezie a sị m gị, ị ga-aga njem gị, gị na ụmụ odibo m Joseph Smith, Nta, na Sidney Rigdon.

6 Lee, ndị a bụ emume-nsọ ndị mbụ, nke ị ga-anata; ma nke fọdụrụ ka a ga-eme ka ị mata n’oge na-abịa, dịka ọrụ gị n’ubi-vine siri dị.

7 Ma ọzọ, a chọrọ m ka ị mata na onye nanị a ga-azọpụta bụ onye anagịdere ruo ọgwụgwụ. Ọbụna otu a. Amen.