Akwụkwọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 44


Nkeji 44

Mkpughe e nyere Joseph Smith Onye-amụma na Sidney Rigdon, na Kirtland, Ohio, n’oge ikpe-azụ nke Februarị 1831 (History of the Church, 1:157). N’irube-isi n’ihe a chọrọ n’ebe a e gosịrị, Nzukọ-nsọ họpụtara ọgbakọ a ga-enwe n’ime ọnwa Jun na-abịa.

1–3, Ndị okenye ga-ezukọ n’ọgbakọ; 4–6, Ha ga-ahazi dịka iwu nile nke ala siri dị ma lekọta ndị ogbenye.

1 Lee, otu a ka Onye-nwe kwuru nye unu ụmụ odibo m, ọ dị mkpa n’ime m ka a kpọkọta ndị okenye nke nzukọ-nsọ m ọnụ n’otu ebe, site n’ọwụwa anyanwụ ma site n’ọdịda anyanwụ, ma site n’elu elu ma site na ndịda, site n’akwụkwọ-ozi ma-ọbụ ụzọ ọzọ.

2 Ma ọ ga-eru, na ọbụrụ raa na ha ekwesị ntụkwasị obi, ma gosi okwukwe n’ime m, a ga m awụsa aMụọ m n’elu ha n’ụbọchị ha ga-akpọkọta onwe ha ọnụ.

3 Ma ọ ga-eru na ha ga-apụ gaa mpaghara nile gbara gburu-gbụrụ, ma akwusaa-ozi nchegharị nye ndị mmadụ.

4 Ma ọtụtụ ga-abụ ndị aagbanwere, nke ga-eme na unu ga-enweta ike nke ịhazi onwe unu bdịka iwu nile nke mmadụ siri dị.

5 Ka andị-iro unu nile ghara inwe ike n’ebe unu nọ; ka e wee nwee ike ichekwa unu n’ihe nile; ka unu wee nwee ike ịdebe iwu m nile; ka e wee nwee ike gbubie ihe njikọta nile nke ndị-iro na-achọ iji bibie ndị nke m.

6 Lee, a sị m unu, na unu aghaghị ije anleta n’ebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ ma leba-anya n’igbo mkpa ha, ka e lekọta ha ruo mgbe a ga-eme ihe nile dịka iwu m nke unu nataworo siri dị. Amen.